Lee ihe bụ Menopause ụmụnwoke a kpọrọ 'Andropause'
- Onye dere ya, Michael Ngene na Okechukwu Omeire
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
Menopause ụmụnwoke a kpọrọ 'Andropause' bụ ihe dị ire.
Ọ na-eme mgbe nwoke gbara afọ 50 bidoro inwe mbelata na mmepụta testosterone.
Dọkịta Rasheed Abbasi onye bụ dọkịta ahụike ụmụnwoke kọwara na njirimara Andropause gụnyere ike ọgwụgwụ, ike ọgwụgwụ, inwe nnukwu afọr, ihe o ji bụrụ anaghị akwụ ọtọ, obi nkoropu, ọrịa shuga, obi ịkwusi ịrụ ọrụ, enweghị ike ịtụ nwaanyị ime na ndị ọzọ.
Dọkita Abassi mere ka amata na ihe dị mgbagojuanya bụ na nyoocha ndị ọrụ ahụike mere na-egosi na ọtụtụ ụmụnwoke dị afọ 30 na uma na-enwezi njirimara ndị a.
Ọ gara n'ihu kwuo na "Ihe nwoke ọbụla kwesịrị ime iji gbochie Andropause gụnyere ịkwụsị ịṅụ mmanya na-atọ ụtọ, ịrị nri n'oge tinyere ịṅụ mmiri ọfụma tinyere ihe ndị ọzọ."
"Ọ bụrụ na nwoke hụ ihe njirimara ndị a, ọ dị mkpa ka ọ ga n'ụlogwụ ka ndị dọkịta nyochaa ya ma nyere ya nwete nleta na ọgwụ."
O kwuru na ihe dị iche n'etiti menopause ụmụnwaanyị na Andropause bụ na ahụ ụmụnwaanyị ruru afọ 45 ga-akwusi imepụta 'estrogen', ebe ahụ nwoke ruru afọ 40 ka nwere ike imepụta estrogen kama na ọ bụghịzi etu ọ dị na mbu.
Dọkịta Abbasi kwuru na enweghị ihe ihere ọbụla kwesiri ị dị na-inwe Andropause.






