Ihe sayensị kwuru maka ude e ji agbatị odogwu ụmụnwoke

Nwoke na-ekiri odogwu ya n'enyo

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist

E nwere ọdịdị mmadụ dị iche iche. E nwere ndị dị ọcha nwee ndị dị ojii; ụfọdụ toro ogologo ebe ụfọdụ dị mkpụmkpụ. E nwere ndị buru ibu ma nwekwaa ndị tara ahụ.

Oge ụfọdụ, ụmụ mmadụ anaghị enwe afọ ojuju n’onwe ha nke mere ha ji agba mbọ ịgbanwe ọdịdị ahụ ha.

Ọtụtụ mmadụ na-agabiga ihe ize ndụ dị iche iche ebe ha na-agba mbọ ịgbanwe ọdịdị ahụ ha. Ụfọdụ na-aṅụ ọgwụ ebe ndị ọzọ na-agba ọnụ; ụfọdụ na-asa ncha na ude ebe ndị ọzọ na-awa ahụ.

Ka osiladị, enweela ndị gbarala mbọ ịgbanwe ọdịdị akụkụ ahụ ha ndị ahụ a na-ezo ezo dịka ara, ike na akụkụ ahụ nwoke iji mee ka ha bukwuo ibu.

Oge ụfọdụ, ndị ahịa na-akpagharị n’ogbe na-ere ude dị iche iche ha kwuru na-eme ka akụkụ ahụ mmadụ buo ibu karịa etu ọ dị.

Ụfọdụ mmadụ kwenyere na ude ndị ahụ na-arụ ọrụ ebe ndị ọzọ na-asị na enweghị ihe ọbụla dị etu ahụ.

Ajụjụ a bụrụ: e nwere ude pụrụ ime ka akụkụ ahụ mmadụ buo ibu karịa etu ọ dị? Ọ bụrụgodu na e nwere, ọ bụ na ọ gaghị ebutere mmadụ ihe izendụ n’ọdịnịihu?

Ọ bụ ajụjụ a mere anyị ji gakwuru otu onye dibịa Bekee a na-akpọtụrụ maka ahụike ezinaụlọ (Consultant Family Physician) bụ Dr Dike Victor Okechukwu ka ọ kọwaara anyị nke bụ eziokwu.

Nrịanrịa ndị pụrụ ime ka mmadụ wulite akụkụ ahụ ya ndị e ji enwe mmekọ

Nwaanyị na-ete ude

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwaanyị na-ete ude
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'oge mkparịtaụka anyị na Dr Dike, ọ sịrị na ụfọdụ mgbe, akụkụ ahụ mmadụ anaghị adịcha nhatanha nke na-eme ka ha gaa ụlọọgwụ iji nwee ike dozie ya.

Ọ sịrị “oge ụfọdụ, ụmụnwaanyị na-achọpụta na ara ha abụọ adịghị nhatanha n’ihi na otu na-ebu ibu karịa nke ọzọ. Ọnọdụ a nwere ike mee ka ha chọọ idozi ya nke ọma; ibelata nke buru ibu maọbụ mee ka nke dị obere buo ibu iji mee ka ha abụọ nwee otu ọdịdị.”

“Ụfọdụ mgbe, ụmụnwaanyị na-achọ ịhazigharị ọdịdị ara ha ọ bụrụ ma ha achọpụta na o buru ibu karịa etu o kwesịrị ị dị.”

“Mgbe ụfọdụ kwa, ara ụmụnwaanyị adịghị apụtacha nke ọma n’oge ha na-eto eto n’ihi nsogbu ahụike dị iche iche. Nke ahụ na-eme ka ụfọdụ n’ime ha chọọ ụzọ ha ga-esi mee ka o buo ibu dịka ha siri chọọ,” ka Dr Dike kwuru.

Ọ gara n’ihu sị “maka ụmụaka ndị nke nwoke akụkụ ahụ nwoke ha dị obere a na-akpọ ‘micro penis’, mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ ma usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ amịtaghị mkpụrụ, a na-awa ha ahụ mgbe ha gbara otu afọ maọbụ abụọ iji mee ka o buo ibu dịka e siri chọọ.”

“Ihe ọ pụtara bụ na mgbe ụfọdụ, a na-awa ụmụnwoke ahụ iji dozie nsogbu ndị metụtara akụkụ ahụ nwoke ha dị obere,” ka Dr Dike gbakwunyere.

Etu obere akụkụ ahụ nwoke si emetụta inwe mmekọ

Nrịanrịa ndị pụrụ ime ka a sị mmadụ wulite akụkụ ahụ ya ndị e ji enwe mmekọ

Ebe foto si, Getty Images

Dr Dike kwuru na ọtụtụ ụmụnwoke ndị nwere obere akụkụ ahụ nwoke anaghị ahụtacha onwe ha dịka ndị tozuru oke, ebe nke ahụ na-emetụta ugwu na nsọpụrụ ha.

Dịka Dr Dike siri kwuo “ọ bụrụ na nwoke e jiri obere akụkụ ahụ nwoke tolite, o nwere ike metụta usoro obibi ndụ ya ndị ọzọ nakwa ọdịmma ya n’ozuzuoke. O nwere ike imetụta ugwu na nsọpụrụ ya tinyere akpamịike ya n’oge inwe mmekọ nwoke na nwaanyị.”

Ọ sịrị na “oge ụfọdụ, ụmụnwoke na-eche na akụkụ ahụ nwoke ha ebughị ibu mana ọ bụrụ ma ndị ọkachamara nyochaa ya, achọpụta na ọ bụ ogogo nke kwesịịrị ọgbọ ha."

“Mana ọ bụrụ eziokwu na onye dị etu ahụ nwere akụkụ ahụ nwoke na-ebughị ibu, o nwere ike metụta ya n’oge inwe mmekọ nwoke na nwaanyị ma metụtakwa ohere ya ịmụ nwa. Mana nke ahụ apụtaghị na nwoke ọbụla akụkụ ahụ nwoke ya na-ebughị ibu agaghị amụli nwa, e nwere ihe ndị ọzọ a ga-elebara anya iji chọpụta ma ọnọdụ ahụ o nwere ike metụta ohere nwoke dị etu ahụ nwere ịtụba nwaanyị ime.”

Maka ụmụnwoke ndị toro eto, e nwere ụfọdụ ihe ndị a pụrụ ime iji hụ na ha kpara ike n’oge mmekọ nwoke na nwaanyị ma hụkwa na ndị nwunye ha kporiri mgbe na-agbanyeghị na akụkụ ahụ nwoke ha nwere ike ọ gaghị eto ogologo maọbụ buo ibu dịka ha siri chọọ,” ka Dr Dike kọwara.

Ihe mere ndị mmadụ ji ewulite akụkụ ahụ ha dị iche iche

Ihe mere ndị mmadụ ji ewulite akụkụ ahụ ha dị iche iche

Ebe foto si, Getty Images

Dr Dike kọwara na ihe mere ọtụtụ mmadụ ji ewulite akụkụ ahụ ha dị iche iche ọkachasị ara, ike na akụkụ ahụ nwoke ha bụ iji maa mma n’anya, iji dịka ibe, iji soro n’ihe a na-eme maọbụ n’ihi nsogbu ahụike.

N’okwu ya, Dr Dike sịrị “mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-arịọ ka ewulite ara ha, ike ha maọbụ akụkụ ahụ nwoke ha iji mee ka ha buo ibu n’ihi na nke ha nwere ejughị ha afọ; ha na-achọ ka ọ dịrị ka nke ndị ọzọ.”

“Mgbe ụfọdụ, ọ bụ nsogbu ahụike na-eme ka nwaanyị chọọ ka a waa ya ahụ iji belata ara ya maọbụ mee ka o buo ibu mana ọtụtụ oge ha na-eme ya iji weteere onwe ha afọ ojuju ma wulitekwa ugwu na nsọpụrụ ha.”

E nwere ude ndị pụrụ ime ka akụkụ ahụ mmadụ buo ibu?

E nwere ude ndị pụrụ ime ka akụkụ ahụ mmadụ buo ibu

Ebe foto si, Getty Images

Dr Dike kwuru na dabere n’amamịihe ya nakwa ọrụ ya dịka onye nlekọta ahụike, na ọ bụ ihe na-ekweghị omume na ude maọbụ ncha nwere ike wulite akụkụ ahụ mmadụ ma mee ya ka o buo ibu.

Ọ sịrị “ọ bụrụ ma gị mepee akwụkwọ akụkọ maọbụ banye n’ọbaozi dị iche iche, ị hụ ka ndị mmadụ na-egosipụta ude na ngwaahịa dị iche iche ndị ha kwenyere pụrụ iwulite akụkụ ahụ mmadụ ndị dịka ara, ike na akụkụ ahụ nwoke.”

“Mana i lee ka akụkụ ahụ mmadụ si eto nakwa etu akụrụndụ si amụba, ọ bụ ihe na-ekweghị omume na ude a na-ete n’elu ahụ pụrụ ime ka akụkụ ahụ nwoke maọbụ akụkụ ahụ ndị ọzọ buo ibu.”

“Dabere n’amamịihe m, enwebeghị nnyocha chọpụtara na ude ọbụla na-agbanyeghị aha e ji mara ya nwere ike mee ka akụkụ ahụ nwoke maọbụ ara buo ibu.”

“Ụfọdụ ngwaahịa ndị ahụ ụmụ mmadụ na-ebugharị n’ọbaozi dị iche iche, na redio nakwa na tiivii bụ naanị iji mee ka ndị mmadụ zụọ ha ahịa. Enweghị ihe akaebe sayensị ọbụla na-egosi na ngwaahịa ndị ahụ nwere ikikere iwulite akụkụ ahụ mmadụ ma mee ka ha buo ibu,” ka Dr Dike kwuru.

Etu ude e ji ewulite akụkụ ahụ si emetụta ọnọdụ ahụike

Dr Dike kwuru na ude ndị ahụ ụmụ mmadụ na-ebugharị sị na ha na-ewulite akụkụ ahụ dị iche iche bụcha ndị nwere ọtụtụ akụrụngwa ‘chemical’ ndị na-emetụta ahụike mmadụ n’ụzọ na-adịghị mma.

Ọ sịrị na “ude ndị ahụ nwechara akụrụngwa ‘chemical’ dị iche iche nke akpụkpọahụ mmadụ na-amịkọrọ.”

“Mmetụta ọjọọ ude ndị ahụ na-enye onye ji ha eme ihe gụnyere ahụ ịkọ ọkọ na mgbanwe akpụkpọahụ tinyekwara ụmụ mmetụta ọjọọ ndị nwere ike isite n’ụdị chemical eji mepụta ude ahụ. Ha nwekwara ike metụta akụrụahụ ‘hormone’ ndị ji ha eme ihe.”

Ọ gara n’ihu kwuo na “e nwetala ọtụtụ mkpesa gbasara mmetụta ọjọọ ude ndị ahụ na-ebutere ndị ji ha eme ihe.”

Ụzọ kachasị mma a pụrụ isi wulite akụkụ ahụ ndị na-ebuchaghị ibu

Ụzọ kachasị mma a pụrụ isi wulite akụkụ ahụ ndị na-ebuchaghị ibu

Ebe foto si, Getty Images

Ọ dị oke mkpa ịmalite n’oge narawa ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ọ bụrụ ma achọpụta na akụkụ ahụ mmadụ erughị n’ogogo a chọrọ ka Dr Dike kwuru.

Dịka o siri kwuo “banyere akụkụ ahụ ụmụnwoke, ọ bụ ihe dị oke mkpa na ndị nne na nna nakwa ndị ọrụ ahụike ọkachasị ndị na-aghọ nwa ga-enyocha akụkụ ahụ nwa nwoke a mụrụ ọhụrụ site na ‘stretch penal length’.

“Ọ bụrụ ma enyochaa ya chọpụta na nwata ahụ nwere obere akụkụ ahụ nwoke, ọ ga-adị oke mkpa ịga kpọtụrụ dọkịta na-ahụ maka ụmụnwoke ka ọ malite n’oge gwọwa ya, ka ọ ghara ịbụ na mgbe o toro a na-apụghị imekwa ihe ọbụla banyere ya, ọ malite inwe obi ịda mba n’ebe onwe ya nọ.”

“Banyere ara, ọ bịara dịka ọ bụ iwu na ara nwaanyị abụọ agaghị adị nhatanha. Ụmụnwaanyị ndị chere na ara ha ebughị ibu tụmadị n’oge ha malitere ịbụ okenye maọbụ n’oge ha bụchara okenye kwesịrị ịga kpọtụrụ onye ọrụ ahụike ka enyochaa ha nke ọma.”

“Ọ bụrụ ma achọpụta n’eziokwu na ụfọdụ akụkụ ahụ onye dị etụ ahụ erughị n’ogogo a chọrọ, e nwere ike waa ya ahụ iji dozie ya nke ọma,” ka Dr Dike kọwara.