Nipple size & Breast Feeding: Ọnụ ara gị o tipịara etipịa ka ọ kwụtịrị akwụtị, o nwereike ịmetụta gị inye nwa ara

Ọnụ ara tipịara etipịa
    • Onye dere ya, Chimezie UcheAgbo
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Agbanyeghi etu ara nwaanyị dị, o buru ibu, ọ dị obere, ọnụ ya ọ kwụ chịm ka ọ basara abasa, ebumnobi nwaanyị ọbụla bụ na ọ ga-ejili ara ya zụọ nwa ya ma oge ruo.

Mana ọtụtụ ụmụnwaanyị anaghị adị nkwadebe maka ihe ha na-ezute ruo oge ha mụrụ nwa.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị anaghị adịkwa nkwadebe maka inye nwa ara ruo oge ha mụrụ nwa hụ na ọ bụghị ọhịa a na-aga na-ebughi mmiri.

Ha hụ etu ụmụnwaanyị ndị ọzọ si eme ya, ọ na-atọ ụtọ na-akpalikwa mmasị n'ime ha mana ọ bụkwanụ etu akụilu si ada na ntị ka o si atọ n'ọnụ?

Ọtụtụ ụmụnwaanyị anaghị ama na etu ara ha dị ọkachasị ọnụ ara ha nwereike ibutere ha nsogbu ma o ruo oge inye nwa ara.

Nke a bụ maka na o nwere etu ọnụ ara nwaanyị ga-adị, nwa ya agaghị ejideli ya nke ọma .

Ọnụ ara dị icheiche, o nwere ndị pịrị ọnụ, nwee ndị bara n'ime, nwee ndị basara abasa, nwee ndị kpọdara akpọda wdgz.

Lee ụdị ọnụ ara dị icheiche

  • Ọnụ ara pụtara apụta:
ọnụ ara pụtara apụta
Nkọwa foto, Ọnụ ara pụtara apụta

Nke a bụ ụdị ọnụ ara pasentị 90 na ụmụnwaanyị nwere dịka nchọpụta siri kwuo. Ndị a bụ ndụ ọnụ ara ha pụtara apụta ma dịrị onwe ya.

Ụdị ọnụ ara a na-akwụtị chị m ma a kpaa ya aka n'oge aramara maọbụ metu ya ihe dị oyi.

Ọnụ ara a anaghị enye nsogbu oge inye nwa ara, maka na ọ na-abanye nwatakịrị n'ọnụ na-egbu oge.

Dkt. Uche Agu bụ dọkịnta na-ahụ maka ahụ ụmụnwaanyị kwuru na ụdị ọnụ ara a kacha mma maka inye nwa ara.

Mana ebe nsogbu nwereike ịdị bụ ọ bụrụ na ọnụ ara a buru ibu karịa. Ọnụ nwa nwereike ọ gaghị asachi ya nke ọma, nke nwereike ime na ọ ga-atagide naanị ọnụ ara ahụ ghara inweta akụkụ anụ ahụ ebe dị oji a kpọrọ 'areola' na Bekee.

Nwatakiri mịa naanị ọnụ ara ahụ mitee ya aka, o ga-ebutere nne ya ahụ ụfụ dị egwu maọbụ ọnụ ara ahụ gbawa nke nwereike ibute ọnya n'ọnụ ara ahụ.

Ọ na-ara ahụ nwaanyị nwere ọnya n'ara inye nwa ara maka na ụfụ ya na-aba n'ụbụrụ.

2. Ọnụ ara tipiara etipia:

Ọnụ ara tipịara etipịa
Nkọwa foto, Ọnụ ara tipịara etipia

Pasentị iri ndị fọrọ n'ụmụnwaanyị bụ ndị ọnụ ara ha tipịara maọbụ bara n'ime.

Nke a bụ oge ọnụ ara sara asa dịka anụ ahụ, o nweghi ọnụ pịrị apị. Ụdị ọnụ ara a na-abụ ọ gbajuo, ọ gaghị enwe ọnụ chacha, ebe ahụ ga-adị ka ahụ ara ndị ọzọ.

Ụdị ọnụ ara a anaghị apụta ma e metụ ya aka n'ụdị aramara maọbụ mesa ya ihe juru oyi.

Naanị ebe dị ojii a kpọrọ 'areola' ga-egosi na ebe ahụ ka ọnụ ara ahụ dị mana i metụ ya aka, ị gaghị emetụta ọnụ ọbụla.

Ụdị ọnụ ara a na-enye nsogbu nke ukwuu oge nwaanyị chọrọ inye nwa ara dịka Dkt Agu siri kwuo maka na nwatakịrị enweghi ihe ọ ga-ejide mịa. Nke a ga-eme ka ọ takwasị ọnụ ya n'ahụ nne ya nke ga-ebutere nne ya ezigbo ụfụ maọbụ ọnụ ara ya gbawaa.

Dkt. Agu kwuru na ụfọdụ oge, nwata a mụrụ ọhụrụ nwereike ọ gaghị ejideli ọnụ ara ahụ cha cha maọbụ o tinye ya ọnụ, ọ gaghị amịtali ihe ọbụla.

Ọ gabajuo dọrọ etu a bụ na nwa enweghi ike ịmịpụta ya, dkt. Agu kwuru na nwaanyị nwereike iji ihe e ji apịpụta mmiri ara nke bụ 'breast pump' mmiri ara jiri ngaji na iko nye nwa.

3. Ọnụ ara bara n'ime:

Ọnụ ara bara n'ime

Ụdị ọnụ ara a bụ nke na-adị ka ọ fịkọrọ baa n'ime. Ọ naghị apụta kwụrụ ka ndị nke ọzọ.

O nwereike ịpụta ma e metụ ya aka maọbụ mesa ya ihe juru oyi mana ụfọdụ anaghị apụta cha cha ma ị metụgodi ya aka.

Nchọpụta kwuru na ihe na-akpata ọnụ ara bara n'ime bụ na ihe a na-akpọ 'breast tissues' nọgidesiri ike n'okpuru ara, jụ ipụta.

Ụfọdụ oge, nwaanyị ọnụ ara ya bara n'ime nwereike mechaa pụta mana ụfọdụ oge, ọ naghị apụta.

Ọnụ ara a enweghi nsogbu ọ na-enye nwaanyị mana ọ na-eme inye nwa ara arịa ahụ maka na nwa agaghị ejideli ya nke ọma.

Dkt Agu kwuru na ọnụ ara bara ime ka mma karịa nke sachiri asachi maka na ọnụ dị ya cha cha.

Ha na-agwa nwaanyị nwere ụdị ọnụ ara ka ọ malite n'oge jiri aka na-apị ya ka ọ pụta maọbụ di ya nyere ya aka na-amị ya ka ọ pụta.

O nwekwara ike iji ihe ndị Bekee mepụtara a kpọrọ 'nipple former' iji nyere ya aka mee ka ọ pụta maọbụ jiri igwe e ji apịpụta mmiri ara mee ka ọ pụta.

Ụdị ọnụ ara a niie bụ etu e siri mụọ nwaanyị, ọ bụ ebumpụta ụwa.

Nwaanyị nwereike iji ịwa ahụ 'plastic surgery' wepụta ya ma ọ chọọ.

Ọnụ ara
Nkọwa foto, Etu ọnụ ara nwaanyị dị

Kama na ọzọ dịka ibe ya bụ na ọnụ ara nwaanyị nwereike pụta apụta nọkata baa n'ime nke Bekee kpọrọ 'retracted nipple.

Ọnụ ara a anaghị apụta ma e metụ ya aka maọbụ mesa ya ihe juru oyi.

Ihe nwereike ibute nke a bụ ịka nka maọbụ ọrịa dịka kansa.

Etu ọbụla ọnụ ara nwaanyị dị mara mma, o kwesikwara ịnabata ya nke ọma mana ọ bụrụ na ọ masịghị gị, i nwereike ịga mezie ya n'ụlọọgwụ.

Nwaanyị ọbụla kwesiri ka o nyochaa onwe ya nkeọma mara ụdị ọnụ ara o nwere tupu o ruo mgbe ọ ga-enye nwa ara ka ọ ghara iti ngara amara maka na ụfụ ara na-adị egwu.

O nweghi onye ga-akọrọ gị etu o si adị rue mgbe o mere gị, ọ ka mma igbochi karịa ịgwọ.