Ndị ahịa Ogbosisi dị n'Anambra steeti nọ n'arịrị dịka ọkụ gbariri ọdọ ahịa ha
Ndị na-azụ ahịa n'ahịa Ogbosisi dị na Head Bridge n'Onitsha, Anambra steeti ji nwayọ atụtụ ihe fọrọ na ndụ ha dịka ọkụ gbariri ọdọ ahịa ha n'abalị ụbọchị Wenzde.
Ndị ọrụ mmenyụọkụ nakwa ụfọdụ ndị ahịa ahụ n'onwe ha gbara mbọ ịkwụsị ya bụ ọkụ mana ọ gbariri ihe ha niile kpam kpam.
Nke a pụtara na ngwa ahịa nde kwuru nde naira bụ ihe funarịrị ndị ahịa ahụ dịka ụfọdụ n'ime ha enweghi ike ịzọpụta kama otu ihe n'ebe ahụ.
Mgbe BBC gara n'ebe ahụ, anyị hụrụ ndị ka na-elegharị anya n'ọkụ ahụ na-enwe olileanya na ha ga-azọpụta ụfọdụ ngwa ahịa ha.
Ebe ndị ọzọ gbanyere aka n'isi dịka igosi ọnọdụ obi ha maka ọdachi dakwasịrị ha.
Ahịa Ogbosisi ahụ bụ akụkụ a ma ama ebe a na-ere osisi, gbam gbam nakwa ngwa eji arụ oche, akwa ndina nakwa ngwa obibi ndị ọzọ.
Onyeisi akụkụ ahịa ahụ bụ Emmanuel Edochie gwara BBC na ọ bụ n'abalị ka akpọrọ ya n'ekwentị maka ọkụ na-agba n'ebe ahụ.

Ihe ndị uweojii kwuru gbasara ya bụ ihe
N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga n'ozi o weputara kwuru na ndị uweojii nakwa ndị ọrụ mmenyụọkụ gbagara n'ebe ahụ mgbe ya bụ ọkụ bidoro ịgba.
"Anyị kewapụtara akụkụ ahụ ma gbochie ya iji kwụsị ndị ohi na ndị ntụtụ ịbanye zu ohi n'ahịa ndị mmadụ gbara ọkụ".
O kwukwara na o nweghi onye nwụrụ na ya bụ mberede mana ngwa ahịa ruru nde kwuru nde naira gbariri na ya bụ ọkụ.
Dịka ihe si kwụrụ ugbua, ndị uweojii amalitela nyocha banyere ihe mere nakwa iji mata etu ọkụ ahụ siri malite.

"Ọ bụghị mbụ ụdịrị ọkụ a na-agba n'ahịa a"

Ndị ahịa ahụ agwala BBC na nke a abụghị mbụ ọkụ a na-agba na 'line' ahụ n'afọ a.
Ha jikwa ohere ahụ arịọ gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka ịkwụsị ya bụ ọkụ ọgbụgba ịme ọzọ.
Ndị isi n'ahịa ahụ amalitela ịdekọ aha ndị ya bụ ọkụ gbara metụtara.
Otu nwaanyị aha ya bụ Ngozi Igwe ji anya mmiri kọọrọ BBC etu ya bụ ọkụ ọgbụgba si metụta ya.
"Obi adịghị m mma, ọ bụ ahụhụ ụmụ mmadụ tara bụ ihe gbarisiri ebe niile ma ọdọahịa ma ngwa ahịa" ka o kwuru.
"Anyị na-arịọ ka gọọmentị gbatara anyị ọsọ enyemaka maka ụdịrị ihe a adịghịzi anyị mma n'ahụ" ka ọ gbakwunyere.











