Ọkụ agbaala ụlọorụ INEC di n'Ebonyi

Ụlọọrụ Inec dị n'Izzi nke gbara ọkụ

Ebe foto si, Inec/Twitter

Ọkụ agbaala ụlọọrụ nke ngalaba Independent National Electoral Commission bụ INEC n'ịchafụ dị n'okpuruọchịchị Izii n'Ebonyi Steeti.

Ụlọorụ Inec kwuru na ọ bụ ihe dị ka ebe elekere iri nke ụtụtụ ụbọchị ụka ka ndị omekome gbara ebe ahụ ọkụ.

Akụkọ na-ekwu na ọ bụghị naanị ụlọ nkịtị gbara ọkụ kama akụrụngwa ọrụ ndị ọzọ so repia n'ebe ahụ.

N'ozi nke Inec n'onwe ziputere gbasara ihe mere, ha kwuru na akwụkwọ ntuliaka bụ PVC amabeghi ọnụọgụgụ ya gbara ọkụ.

"Igbe ntuliaka 340, ọdọ ntuliaka 130, igwe ọkụ latrik 14, ọdọ mmiri, ngwa ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ nara n'iyi n'ọkụ a" ka ozi ha kwuru.

Ha kọwara na o nweghi onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ n'ebe ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Chris Anyanwu kwuru na ya bụ ọdachi mere n'ezie.

BBC Igbo ghọtara na ọ bụ enweghi nchekwa nke chere steeti ahụ aka mgba so bute ihe a mere.

Kama o kwukwara na ọ ka na-agba mbọ ịnweta akụkọ juru afọ gbasara ihe mere n'ebe ahụ.

Ebe ọkụ gbara n'ụlọorụ Inec dị n'Izzi

Ebe foto si, Inec/Twitter