Etu e si mee olili Emmanuel Iwuanyanwu bụ Onyeisi Ohanaeze Ndigbo

Ndị na-ebu igbe ozu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụmụafọ Igbo bi na Naịjirịa nakwa mbaụwa niile nọ n'ihe iru uju dịka a na-eme olili Emmanuel Iwuanyanwu, Onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ otu jikọtara ndị Igbo niile n'ụwa.

Iwuanyanwụ nwụrụ n'otu ụlọọgwụ dị n'Abuja n'ọnwa Julaị afọ 2024 dịka ọ gbachara afọ iri asatọ na abụọ (82yrs).

Ozu Iwuanyanwụ wuchiri na steeti ya bụ Imo n'ụbọchị 29 Ọktoba dịka a malitere emume akwamozu ya n'Owerri bụ Isiobodo steeti ahụ.

Mgbe ozu ya batara Owerri bụ isiobodo Imo Steeti

Ebe foto si, Aic Akwarandu/Facebook

Obodo Umuohi Atta ebe a mụrụ Iwuanyanwu
Ndị na-ebu igbe ozu
Olili Emmanuel Iwuanyanwu
Emume olili Emmanuel Iwuanyanwu bụ Onyeisi Ohanaeze Ndigbo

Ebe foto si, Aic Akwarandu/Facebook

Olili ya malitere n'ihe dịka elekere itoolu nke Fraịde ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba 2024 n'obodo ya bụ Umuohi Attah dị n'okpuruọchịchị Ikeduru, Imo Steeti.

A kara ụka olili ya n'ụlọụka Aglikan nke St. Mathewe Cathedral dị n'obodo Attah nke Ikeduru ebe ọtụtụ ndị ụkọchukwu karịrị otu narị bịara.

Otu onye obodo Attah bụ Mazi Ambrose Orji mabụrụkwa nwanne Iwuanyanwụ kọwaara ya dịka enyi ọha, ma kwuo na ọ na-azụ ọtụtụ ndị ntoroọbịa obodo ha n’ụlọakwụkwọ nakwa n'aka ọrụ.

Ọtụtụ ndị ndu mpaghara Ọwụwa Anyanwụ gụnyere ndị gọvanọ, mịnịsta, ndị omeiwu wuchiri n'obodo Ikeduru iji kwanyere Iwuanyanwu ugwu ikpeazụ n'olili ya.

Odeakwụkwọ Gọọmentị etiti bụ George Akume, Mịnịsta nta na-ahụ maka akụnaụba bụ Doris Anite Uzoka nakwa ndị ọzọ bịakwara olili ahụ.

Mgbe odeakwụkwọ Gọọmentị etiti George Akume wụchiri n'ọdọụgbọelu Imo Steetị.

Ebe foto si, Deji Osinowo/Facebook

Ndị bịara emume olili Emmanuel Iwuanyanwu
Mgbe a kwanyeere Iwuanyanwu ugwu nke ikpeazụ

Ebe foto si, Enugu State Government

Ofufe nkwanye ugwu e meere ya n'ụlọụka dị n’Enugwu

Ofufe nkwanye ugwu ikpeazụ

Ebe foto si, Enugu State Government

E doro ụka iji kwanyere Emmanuel Iwuanyanwu ugwu nke ikpeazu n’ụlọụka dị n'Enugwu Steeti.

E mere nke a n'Enugwu maka na ọ bụ ebe isiụlọọrụ otu Ohanaeze Ndigbo dị.

Iwuanyanwu nwụrụ n’ọnwa July afọ a ka ọ rịachara ọrịa obere oge.

E mekwara ọtụtụ emume ndị ọzọ n'ụbọchị dị iche iche tupu ozu ya abanye n'ala na Fraịde ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba 2024.

Gọvanọ Peter Mbah bịara nkwanye ugwu ikpeazụ

Ebe foto si, Enugu State Government

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu dịka Gọvanọ Enugwu Steeti, Peter Mba, Osote Gọvanọ Imo steeti, Chinyere Ekomaru, Sịnetọ Victor Umeh, Sịnetọ Uche Ekwunife, Gọvanọ chiburu Ebonyi steeti bụ Sam Egwu nakwa nwunye Onyeisiala Naịjirịa nke mbụ bụ Ọkammụta Uche Azikiwe na ndị ọzọ bịara ụka ahụ.

Gọvanọ Peter Mbah kọwara Emmanuel Iwuanyanwu dịka “oke osisi gbara mbọ maka iwete udo n’etiti agbụrụ dị icheiche na Naịjirịa”.

Ụmụada Igbo bịara emume nkwanyere Iwuanyanwu ugwu ikpeazụ

Ebe foto si, Enugu State Government

Ụfọdụ ndị a ma ama bịara emume nkwanye ugwu ahụ

Ebe foto si, Enugu State Government