Ọ bụ gịnị na-esere ndị nna na ndị ntorobịa Ọhanaeze Ndigbo?

Ndị ntorobịa Ọhanaeze Ndigbo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ adapụtala n’etiti ndị Ọhaneze Ndigbo na ngalaba ndị ntorobịa ha bụ Ọhaneze youths nke Maazị Chukwuma Okpalaezeukwu nọ n’isi ya.

O rubeghị izuụka atọ onyeisi Ọhaneze Ndigbo bụ Emmanuel Iwuanyanwu lara mmụọ tupu esemokwu amalite.

Gịnị na-ese?

Ndị ntorobịa Ọhanaeze Ndigbo

Dịka Onyeisi Ọhanaeze Youth bụ Chukwuma Okpalaezeukwu si kwuo taa n’Enugwu oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu “Anyị bụ Ohaneze Youth hụrụ ozi ndị nna anyị na Ọhaneze dere na soshal midịa wee si na ọchịchị m adịghịzi ire, anyị wee kwuo na ọ bụ okpotokpo asị”

“Ozi ahụ Maazị Alex Ogbonnaya zigaara ndị ntaakụkọ na nke onye odeakwụkwọ bụ Maazị Okey Enuche kwuru na anyị bụzi ndị ọjọọ bụ ihe jọgburu udele ma sigbuo nkapị.

Okpalaezeukwu kwara arịrị na ọ bụ ihe mwute na kemgbe Maazị Iwuanyanwu nwụrụ na Okey Emuche dịka onye ode akwụkwọ na-ebutezi ọgbaaghara n'otu ahụ.

Ndị ntorobịa Ọhanaeze Ndigbo

Ndị otu kabịneti Okparaezeukwu si na steeti niile dị na south east na south south jikọrọ aka ọnụ binye aka n’akwụkwọ na Okey Emuche enweghị ikikere iwepụ ha n’ọkwa ebe ọ bụ na e mere ntụliaka họpụta ha, ma kwukwaa na oge ọchịchị ha ezubeghị ma ncha.

Ndị Ntorobịa Ọhanaeze ahụ gwara ndị mmadụ ka ha ghara ige ntị n'okwu nchụpụ ahụ n’ihi na Chukwuma Okpalaezeukwu na ndị otu ya ka kwụkwa chịm chịm.

Ha jizi ohere ahụ gaa ebe adọbara “Condolence Register” maka Emmanuel Iwuanyanwu debaa ozi anyammiri nke ha.

Cheta na mkpụrụ ụbọchi ole na ole gara aga ka Maazị Alex Ogbonnaya zisara ozi Okey Emuche tinyere aka na ya wee kwuo na Chukwuma Okpalaezeukwu na ndị otu ya abụghịzi ndị Ọhanaeze Youths maka ajọ akparamaagwa ha.