A kpụpụla mmadụ atọ na-eti mmanwụ Oriọkpa n'ụlọikpe na Nsụka

Ebe foto si, Enugu State Police Command
Ndị uweojii Enugwu Steeti ekwuola na ha akpụpụla mmadụ atọ ahụ b na-enyo enyo na ha na-eti mmanwụ Oriopka wakporo ma merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ na Nsuka, Enugwu steeti.
A kpụpụrụ mmadụ atọ ahụ aha ha bụ Emeka Eze gbara afọ 33, Omeke Uchechukwu gbara afọ 22, na Malachi Michael Nnaemeka gbara afọ 30, n'ụlọikpe Majie dị na Nsụka ebubo ịkpa nkata, iji ụzọ aghụghọ napụ ndị mmadụ ego nakwa imerụ ndị mmadụ ahụ.
Ụlọikpe ahụ yigharịrị ụbọchị ikpe ụbọchị Tọzde 31 Julaị, 2025 ma nye iwu ka a kpọchie mmadụ atọ ahụ n'ụlọmkpọrọ Nigerian Correctional Custodial Centre dị na steeti ahụ.
Cheta na ndị uweojii nwụchiri mmadụ atọ ahụ dịka akụkọ kwuru na otu onye mmanwụ ahụ ji ịtarị wakpo n'okporoụzọ Akụ dị na Nsụka, merụrụ nnukwu ahụ nke bugara ya ụlọọgwụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru na Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ Mamman Bitrus Giwa enyela iwu ka e mee nnyocha ma nwụchie ndị otu ahụ na-eti mmanwụ Oriọkpa a na-achọ achọ.
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ na-eti mmanwụ Oriọkpa wakporo ndị mmadụ na Nsụka

Ụlọọrụ ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha nwuchiri mmadụ atọ a na-eyo eyo na aka ha dị na mwakpo mmanwụ Oriokpa wakporo ndị mmadụ Nsụka.
N'ihe onyonyoo na-efegharị na soshal midịa, gosiri ebe mmanwụ ahụ na-apịa ndị mmadụ ụtarị ma na-amanye ha n'ike ka ha nye ha ego.
Akwụkwọozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti bụ Daniel Ndukwe wepụtara, mere ka a mara na ha nwuchiri mmadụ atọ ahụ ụbọchị Mọnde 23 Juun, 2025.
O kwuru na Komishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Mamman Bitrus Giwa enyela iwu ka e mee nnyocha n'ajọ akparamaagwa ndị na-eti mmanwụ ahụ ma nye ha ntaramahụhụ dịka iwu si kwuo.
Komishọna Giwa kwuru na iti mmanwụ bụ ezi ihe na-egosi omenaala ma katọọ agwa ndị ji ohere iti mmanwụ awakpo ndị mmadụ.
Akụkọ kwuru na ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ ebe otu onye n'ime ha nọ n'ụlọọgwụ.
Ihe anyị ma banyere Mmanwụ Oriọkpa a sị na-akpa mkpamkpa na Nsụka

Ebe foto si, Quintom/ Facebook
Mmanwụ Oriọkpa nke Nsụka a na-ebo ebubo na ha bụ mmanwụ na-eti ma na-apịa ndị mmadụ ụtarị amalitekwala ajọ agwa ha ọzọ dịka ọ gachara otu afọ gọọmentị Enugwu steeti machiri ha.
I ji mee mmemme na gọọmenti agwala ha bido ọzọ, ụmụ mmanwụ ahụ nuputara n'igwe na-apịa ndị mmadụ ụtarị ma na-amanye ha n'ike ka ha nye ha ego.
Cheta na o meela otu afọ gọọmentị nyere iwu ka ha nọdụgodi n'ụlọ ka ndị obodo nnyochaa akparamagwa ha, mana ozugbo ha malitekwara, ihe mbụ ha mere bụ ịmalite mkpamkpa ọzọ.
Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu arịọọla gọọmentị ka ha machie ma kposaa mmanwụ Oriọkpa kpamkpam n'ihi na o nweghị uru ọ bara, dịka ha na-ebo ha ebubo izu ohi n'aha iti mmanwụ.
E boola Oriọkpa ebubo ịsụ otu nwaokoroọbịa mma na Nsụka
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'ụbọchị Mọnde 23 Juun 2025 ka akụkọ rutere ụlọmgbasaozi BBC Igbo ntị na Oriọkpa sụrụ otu nwaokoroọbịa mma n'afọ, nke mere na ndị mmadụ gbakọrọ wụọ ya mmiri tupu o nweta onwe ya ọzọ.
Ha gara n'ihu buru ya gaa ụlọọgwụ dị na Nsụka ebe nwata nwoke ahụ natara ọgwụgwọ.
Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ndị hụrụ ihe mere n'ahịa Ogige Nsụka, nwada Angelina Obu kwuru na ha hụrụ mmanwụ Oriọkpa karịrị iri ka ha na-apịa ndị mmadụ ụtari ma na-achụ onye ọbụla ọsọ ọkachasị ụmụnwaanyị n'ụbọchi Mọnde.
Nwada Obu kwuru na ihe mere ha jiri sụọ nwata nwoke ahụ mma bụ maka na o nyeghị ha ego.
Otu nwoke na-azụ ahịa akwa n'ahịa Ogige gwara anyị na mmanwụ Oriọkpa bụzi ihe ụmụokoroọbịa omekome ji anapụ ndị mmadụ ego ha n'ike.
"Kwa mgbe ka mmanwụ ahụ na-anara anyị ego n'ike. Ọ bụrụ na i nyeghị ha ego, ihe ọbụla ị hụrụ ị were," ka o kwuru.
Mkpamkpa ahụ ha kpara ụnyahụ metụtara nwaokoroọbịa ahụ a sụrụ mma nke onyonyoo ya na-efegharị na soshal midia ya nakwa otu nwanyị ha Mkpa mkpa ha mere ụnyahụ metụtara nwa ntorobịa ahụ a mara mma nke onyonyo ya n'efegharị soshal midịa nakwa otu nwaanyị ha pịapụrụ ọkwụrụ n'anya.
Ka ọ dị ugbua, mmadụ abụọ ahụ nọ n'ụlọọgwụ ebe a na-agba mbọ ịzọpụta ndụ nke nwoke mmanwụ sụrụ mma.
Cheta na n'ọnwa Eprel 2024, ka akụkọ kwuru na mmanwụ Oriọkpa pịara nwaanyị nọọsụ aha ya bụ Blessing Ogbonna ajọ ụtarị. Ha pịakatara ya ụtarị, ọ danye na nnukwu olulu.
O nwekwara obodo ndị ọzọ na Nsụka ebe mmanwụ ahụ kpatara ọnwụ mmadụ abụọ site n'ịchụba ha n'okporoụzọ, ụgbọala wee gbuo ha.








