Ndị ọrụ akpụpụla Onyeisi ụlọmgbasaozi Sun 91.9 FM Aba n'Area Command

Ebe foto si, Victoria Joseph
Ụfọdụ ndị rụburu ọrụ n'ụlọmgbasaozi Sun 91.9 FM Aba akpụpụla Onyeisi ha bụ Charles Ogbonna n'ụlọorụ ndị uweojii Area Command dị n'Aba.
Ndị ntaakụkọ ahụ dị mmadụ iri na abụọ gụnyere Victoria Joseph, Reyna Ordu, Clinton Obediah, Ikechukwu Mbonu, Lucky George na Kingsley Obinna.
Ndị ọzọ bụ Israel Chinazam Ozoemenam (Bishop), Justin Donatus, ThankGod Samuel (Onyeozi), Ukpabi Okorie Ukpabi, Chinenye Godwin na Kingsley Ibeawuchi.
He nyere ndị uweojii mkpesa gbasara ọtụtụ mmegbu, omume ike, okwu ọjọọ na mkpagbu ha gabigara n'aka Charles Ogbonna.
Ebubo ndị ntaakụkọ ahụ boro Onyeisi ụlọmgbasaozi Sun FM Aba gụnyere iti ha ihe, imesi ha ike, ịgwa ha okwu ọjọọ na iji ha mere ụmụ odibo.
Otu n'ime ndị ntaakụkọ ahụ bụ Victoria Joseph gosikwara ndị uweojii ihe akaebe na-egosi nnyocha o mere n'ụlọọgwụ, bụ nke na-akọwa na Maazị Ogbonna tiri ya ihe n'anya.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Wenezde 18 Juun 2025 ka ndị ntaakụkọ ahụ kpụpụrụ Onyeisi ha n'ụlọọrụ Public Complaints Commission dị n'isi obodo Abịa steeti bụ Ụmụahịa n'ihi ebubo ndị a.

Ebe foto si, Victoria Joseph
Ndị ọrụ akpụpụla Onyeisi ụlọmgbasaozi Sun FM Aba n'ụlọọrụ Public Complaints Commission maka ebubo iti ha ihe

Ebe foto si, Sun FM Aba/Facebook, @officialpccng/X
Ụfọdụ ndị ntaakụkọ Sun 91.9 FM Aba edegarala ụlọọrụ Public Complaints Commission (PCC) akwụkwọ, nke ha jiri boo Onyeisi ụlọmgbasaozi ahụ bụ Charles Ogbonna ebubo imesi ha ike.
Ọ bụ n'ụbọchị Wenezde 18 Juun 2025 ka ha wegara akwụkwọ mkpesa ahụ n'ụlọọrụ PCC dị n'isi obodo Abịa steeti bụ Ụmụahịa.
Ndị binyere aka n'akwụkwọ ahụ gụnyere Victoria Joseph, Reyna Ordu, Ozoemenam Israel Chinazam (Bishop), Justin Donatus, ThankGod Samuel (Onyeozi), Ukpabi Okorie Ukpabi, Chinenye Godwin na Tony Agbanyim.
N'ime akwụkwọ ahụ ka ha depụtara ụfọdụ ebubo ha na-ebo Maazị Ogbonna, nke gụnyere iti ha ihe, imesi ha ike na ịgwa ha okwu ọjọọ oge niile.
Ha kwupụtara na ọ bụkwa n'ihi ụdị mkpesa a ndị ọrụ Sun 91.3 FM Igbere nyere ụlọọrụ PCC n'afọ 2022 mere e ji wezuga ya n'Igbere ma kpọgaa ya Aba.

Ndị ọrụ ahụ rịọrọ PCC ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka ma mee nwoke ahụ ezigbo nnyocha.
Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo kpọtụụrụ Onye Kọmịshọna ụlọọrụ Public Complaints Commission n'Abịa steeti bụ Madukwe E.E. Ukaegbu, ọ sịrị na ụlọọrụ ya anaghị ekpughere ọhanaeze mkpesa ọbụla ha nwetara.

Anyị anatala mkpesa na Onyeisi ụlọmgbasaozi Sun FM Aba na-eti ndị ọrụ ya ihe - Ndị uweojii

Ebe foto si, Sun FM Aba/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị uweojii Abịa steeti sị na ha enwetala mkpesa megide Onyeisi ụlọmgbasaozi Sun 91.9 FM Aba bụ Charles Ogbonna gbasara ebubo iti ndị ọrụ ya ihe na imesi ha ike.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Chinaka kwuru nke a oge ọ na-agwa onye ntaakụkọ BBC News Igbo okwu n'ekwentị.
Chinaka kọwara na otu nwaagbọghọ na-arụ ọrụ dịka onye ntaakụkọ n'ụlọmgbasaozi ahụ aha ya bụ Victoria Joseph nyere ya bụ mkpesa.
"Agwara m Victoria Joseph ka ọ gaa na ngalaba na-ahụ maka ụmụnwaanyị n'ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla dị ya nso," ka Maureen Chinaka kwuru.
Ka o sina dị, Chinaka kwuru na nwaada ahụ enyebeghị ya nzaghachi kemgbe ahụ ha kwuchara.
Ndị ọrụ karịrị mmadụ ise boro Maazị Ogbonna ebubo iti ha ihe, ịma ha ụra, ịlụso ha ọgụ, itiwa ekwentị ha, ịmaja ha na ịgwa ha okwu ọjọọ dị iche iche oge niile.
Ha kwuru na nwoke ahụ anaghị ekwe ka obi ruo ha ala n'ihi etu o si emeso ha omume, ọkachasị ndị ọrụ nke nwaanyị.
Ha sị na o teela nwoke ahụ malitere iti ndị ọrụ ya ihe mana nke mere na nso nso a bụ n'etiti ya na nwaada Victoria Joseph na-agbasa ozi n'asụsụ Bekee.
Ozi anyị nwetara kwuru na ọ bụghị naanị ndị ntaakụkọ ka nwoke ahụ na-emesi ike, kama ọ na-emesokwa ndị isi na-elekọta ụlọmgbasaozi ahụ omume ike.
Ụfọdụ ndị ọrụ Sun FM Aba Onyeisi ha tiri ihe

Victoria Joseph kọwara ọtụtụ ihe ọ gabigara n'aka Onyeisi ụlọmgbasaozi Sun FM Aba bụ Charles Ogbonna kemgbe ihe karịrị otu afọ.
O kwuru na nwoke ahụ na-agwa ya okwu ọjọọ ma na-etikwa ya ihe mana nke kachasị agbawa ya obi bụ nke mere n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun, afọ 2025.
"N'ụbọchị ahụ, agbanyere m ọkụ dị n'ime ụlọmgbasaozi anyị ka m nweeike tinye onyonyoo ihe omume m n'ọbaozi Facebook, ma tụkwasa ekwentị m n'elu igbe igwe onyonyoo iji sete onwe m nke ọma".
"Ọ batara, jụọ onye gbanyere ọkụ, m gwa ya na ọ bụ m ma rịọkwa ya mgbaghara. Ọ jụkwara onye wepụrụ igbe igwe onyonyoo, m sị ya na ọ bụ m ma rịọkwa ya mgbaghara".
"Ọ jụrụ ma injinịa ọ maara na m gbanyere ọkụ, m sị ya mba. Ọ gwara m na ya ga-aga kirie onyonyoo CCTV, ọ bụrụ na ya bata na ọ ga-emesi m ike," ka Victoria Joseph kọọrọ anyị.
Victoria Joseph kwuru na ya gara n'ihu na-ahazi ihe omume ya dịka Maazị Ogbonna gara ikiri onyonyoo CCTV.
Dịka Victoria Joseph siri kwuo, ọ ka na-ahazi ihe omume ya oge Onyeisi ya batara ma tie ya ihe n'isi.
"Ajụrụ m ya ma o tiri m ihe n'isi? Ọ maa m ụra n'anya nke mere ka ọbara kpuchie anya m, ọ makwara m ụra ọzọ na ntị," ka Victoria Joseph kwuru.
Ọ sịrị na ọ bụ onye ọbịa bịara ihe omume ya n'ụbọchị ahụ napụtara ya n'aka Maazị Ogbonna.
Victoria Joseph kọrọ na nwoke ahụ tikwara onye injinịa ihe n'otu ụbọchị ahụ, jichie uwe nchụoyi ya na igwe laptop ya ma gwa ya ka ọ kwara ngwongwo ya pụọ n'ụlọ obibi e nyere ya.

Onye ọrụ ọzọ nyere mkpesa bụ ThankGod Samuel a maara nke ọma dịka Onyeozi.
O kwuru na Maazị Ogbonna lusoro ya ọgụ n'ụbọchị 29 Mee 2023 oge ọ na-arụ ọrụ n'ụlọmgbasaozi ahụ dịka onye ntaakụkọ.
Samuel kọwara na nwoke ahụ batara n'ime ụlọmgbasaozi oge ọ na-akọ akụkọ ụwa ma jụọ ya ihe mere o keleghị ya.
"Agwara m ya na m na-akọ akụkọ ụwa, ọ sị na m kwesịrị ịkwụsị akụkọ ụwa kelee ya n'ihi na ya onwe ya dị mkpa karịa akụkọ ụwa".
"M sị ya na ọ bụghị ihe a kụziiri anyị gbasara ọrụ mgbasaozi, n'ihi na akụkọ ụwa bụ ihe mmadụ niile na-ege".
"Ọ bụ etu a ka o siri malite ịlụso m ọgụ n'ime ụlọmgbasaozi ma kwuo na m enweghị mmadụ. Ọ sịrị na ya nwereike igbuo m ma enweghị ihe ga-eme ya," ka Onyeozi kọọrọ anyị.
Ọ kọrọ na Maazị Ogbonna mebiri elekere ọ gba n'aka ma tiwaa ekwentị ya n'ihu ndị ọrụ ndị ọzọ.
Onyeozi kwuru na ya depụtara ihe mere n'etiti ya na Onyeisi ya n'ọbaozi Facebook mana nwoke ahụ gara kpọọrọ ya ndị uweojii ma boo ya ebubo imebi aha ya.
O kwuru na ha eruola mmadụ iri abụọ nwoke ahụ mekparala ahụ, tinyere ndị isi na-elekọta ụlọmgbasaozi ahụ.

Justin Donatus bụ onye ọrụ ọzọ gwara BBC News Igbo okwu gbasara omume ọjọọ Onyeisi ụlọmgbasaozi Sun FM na-emeso ndị ọrụ.
Donatus kọwara na Charles Ogbonna lusoro ya ogu otu ugboro mana ndị ọ kachasị emeso omume ike bụ ụmụnwaanyị.
"Otu ụbọchị, n'oge mgbede, ọ gwara m okwu mana anụghị m ihe o kwuru nke ọma. Ọ chọọrọ m bata n'ime ụlọmgbasaozi jụọ ihe mere aṅaghị m ya ntị oge ọ na-agwa m okwu".
"Tupu m mara nke na-eme, ọ malitela ịlụso m ọgụ. Ọ bụ ndị ọrụ ndị ọzọ nọ ebe ahụ nyere aka kposaa anyị".
"Ọ bụrụ maka okwu ọjọọ, nke ahụ bụ kwa ụbọchị. Ọ dị ka mmiri ọṅụṅụ," ka Donatus kọọrọ anyị.
O kwuru na ha na-eji obiọma gaa ọrụ kwa ụbọchị ma jiri iwe na ọnụma laa.
Donatus kọrọ na Maazị Ogbonna weere ha dịka ụmụ odibo na-agara ya ozi dị iche iche dịka ịzụta mmanụ ụgbọala, ịza ụlọ na ịga ozi ndị ọzọ.

Ozoemenam Israel Chinazam a na-etu Bishop gwakwara anyị okwu gbasara omume ọjọọ Onyeisi ụlọmgbasaozi Sun FM Aba mesoro ya.
O kwuru na ya amaghị etu ọ ga-esi kọwaa Maazị Charles Ogbonna maka na ọ lusoro ya ọgụ ugboro atọ.
Onye ọzọ ketara oke n'omume ọjọọ Onyeisi ụlọmgbasaozi Sun 91.9 FM Aba bụ Ukpabi Okorie Ukpabi.
Dịka Ukpabi siri kwuo, Maazị Ogbonna kpọrọ onwe ya ụkọchukwu mana omume ya anaghị egosipụta ya dịka onye maara Chukwu.
Ukpabi kwuru na ya bụbu onye ọrụ n'ụlọmgbasaozi Sun FM Aba. Ọ kọwara na nwoke ahụ alụsoghị ya ọgụ kama na ya jiri anya ya hụ ndị ọrụ ọzọ ọ lụsoro ọgụ.
O kwuru na oge ụfọdụ, ha ga-anọ na-akọ akụkọ ụwa, nwoke ahụ asị ha pụta bịa zaa ya oku n'ime ụlọọrụ ya.
"O nwere igwe screw driver ogologo o ji eyi ndị ọrụ ya egwu. Ọ bụ n'ime ụlọọrụ ya ka ọ dị," ka Ukpabi kọọrọ anyị.

Kingsley Obinna kwuru na ya matara Onyeisi ụlọọrụ Sun FM Aba bụ Charles Ogbonna oge ọ gara ikwu ihe gbasara akaọrụ ya n'ikuku.
O kwuru na nwoke ahụ chọpụtara na ya nwere onyinye ịkpa ndị mmadụ obiọma na ime ka ihe gaa n'ụzọ kwesịrị ekwesị ma nye ya ohere ka ha na ya rụkọọ ọrụ.
Obinna kwuru na ọ dị mkpa ka a kwụsị ịkpọ Maazị Ogbonna ụkọchukwu n'ihi na ịkpọ ya ụkọchukwu bụ ịkwa Chineke emo.
Dịka o siri kwuo, o chere na nwoke ahụ nwere nsogbu ime mmụọ, na ya chere na agwụ na-achị ya.
"Ọ na-abụ ya na ndị ọrụ ya nwee obere nghọtahie, ọ lụsoo ha ọgụ. Ọ lụsoro Chinenye ọgụ, lụsoo Bishop ọgụ, ọ kụrụ Clinton dukaduka ma werekwa onye nke ahụ mere nwaodibo, mana nke chịpụtara ya ụkwụ n'ama bụ Victoria".
"Ọ kụọla ya ihe opekatampe ugboro atọ, maa ya ụra ma na-akpaso ya agwa dịka a ga-asị na ọ bụ odibo. O nweela oge ọ chọkwara ịlụso m ọgụ," ka Obinna kwuru.

Ebe foto si, Sun FM/Facebook
Mmadụ niile nyere mkpesa boro ebubo na onye hibere ụlọmgbasaozi ahụ gbachiri nkịtị n'omume ọjọọ niile Maazị Charles Ogbonna na-emeso ndị ọrụ.
Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo gara ka Maazị Ogbonna zara ọnụ ya n'ebubo ndị ahụ, o kweghị ekwu ihe ọ bụla, kama ọ malitere iyi egwu na ya ga-eji ndị uweojii nwụchie ya bụ onye ntaakụkọ.









