'Mbuze na-achọ ịchụpụ anyị n'ụlọ' - Ndị obodo Ndi Agwu Eziukwu Ọhafịa dị n'Abịa steeti

Miracle sị na ha emefuola ọtụtụ ego iji gboo nsogbu mbuze ahụ mana ya bụ nsogbu na-akawanye njọ
Nkọwa foto, Mma Okwara bụ agadị nwaanyị kpuru isi dị afọ 90. Nwa ya nwaanyị bụ Miracle nọ ya n'akụkụ. Mbuze na-achọ ịkwatu ụlọ ha n'Ọhafịa dị n'Abịa steeti.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mbuze na-achọ ịchụpụ ndị obodo Ndi Agwu Eziukwu dị n'okpuru ọchịchị Ọhafịa n'Abịa steeti n'agbanyeghị mbọ niile ha na-agba iji gbochie ya.

Dịka ndị obodo ahụ siri kwuo, nsogbu mbuze ahụ malitere ihe dịka afọ asaa gara aga mana o ruola afọ iri abụọ idemmiri malitere imekpa ha ahụ.

Oge ọ na-ekwu okwu gbasara ya bụ nsogbu, otu onye obodo ahụ aha ya bụ Ike Onwuka kwuru na o ruola afọ iri abụọ idemmiri malitere iyi ndị obodo ha egwu.

Maazị Onwuka kwuru na ha agbachighị nkịtị na-ele sọọsọ anya, kama ha emeela ihe niile ha nwere ike ya iji napụta obodo ha n'aka mbuze ahụ.

O kpughere na o nwebeghị ihe ọbụla gọọmenti Abịa steeti merela iji dozie ọnọdụ ahụ kemgbe ọ malitere.

"Anyị na-arịọ gọọmenti na ndị nwere obi mmadụ ka ha gbatara anyị ọsọ enyemaka n'ihi na mbụze na-achọ ịchụpụ anyị n'ụlọ anyị," ka Maazị Onwuka rịọrọ.

Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo garuru n'obodo ahụ, ọ hụrụ ka onye niile na-agba mbọ iji hụ na e busoro mbuze ahụ agha, nke gụnyere obere ụmụaka.
Nkọwa foto, Obere ụmụaka na-enye aka edozi ebe mbuze mebiri na mbaraezi ha.

Mbuze ahụ ebibiela ụfọdụ ụlọ ma na-achọkwa imetụta ọtụtụ ndị ọzọ, nke otu n'ime ha bụ ụlọ agadị nwaanyị kpuru isi dị afọ iri itoolu, aha ya bụ Mma Okwara.

Oge nwa ya nwaanyị bụ Miracle na-akọwa ọnọdụ ha nọ n'ime ya, o kwuru na ha arịọla gọọmenti ụgboro ugboro maka enyemaka mana o nweghị ihe ha hụrụ.

"Ọtụtụ oge, ndị mmadụ na-abịa ebe a, buru igwe onyonyoo gagharịa ebe niile ma seekwa foto mana o nweghị ihe ọbụla anyị na-ahụ," ka o kwuru.

Ọ sị na ha emefuola ọtụtụ ego iji gboo nsogbu mbuze ahụ mana ya bụ nsogbu na-akawanye njọ.

Miracle kwuru sị "ndị obodo anaghị enyere anyị aka, ọ bụ naanị ndị bi na mpaghara a na-emefu akatamkpo ego iji dozie nsogbu mbuze a."

Ọ rịọrọ ogogo gọọmenti dị iche iche ka ha gbatara nne ya ọsọ enyemaka tupu idemmiri na mbuze erie ụlọ ha.

Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo garuru n'obodo ahụ, ọ hụrụ ka onye niile na-agba mbọ iji hụ na e busoro mbuze ahụ agha, nke gụnyere obere ụmụaka.