Ntụ ụmụnne anyị ka anyị chịtara ebe ụgbọala tanka gbara ọkụ n'Enugwu – Ndị o metụtara

Aha onyonyo, Ntụ ụmụnne anyị ka anyị chịtara ebe ụgbọala tanka gbara ọkụ n’Enugwu – Ndị o metụtara
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Otu nwoke akọwaala etu ọkụ siri gbagbuo nwanne ya nwoke na ezinaụlọ ya n'Ugwu Onyeama dị n'Enugwu steeti oge ha na-alọta Abakaliki.

Nwoke ahụ kwuru na ọkụ gbariri nwanne ya nwoke na ezinaụlọ ya nke mere na ọ bụ naanị "ntụ ha" ka a chịtara.

Ụmụnne ya kwarịrị ma kwuo na ọnwụ ha gbawara ha obi.

Cheta na ụgbọala tanka dara ma nwuru ọkụ n'Ugwu Onyeama dị n'Enugwu steeti n'ụbọchị Satọde 25 Jenụwarị 2025.

Dịka ụlọọrụ na-ahụ maka njem okporoụzọ n'Enugwu steeti siri kwuo, ọ bụ mmadụ iri na asatọ (18) nwụrụ site n'ihe mberede ahụ.

Etu ọkụ tanka dara n'Enugwu steeti si gbuo mmadụ 11 n'otu ezinaụlọ

Ezinaụlọ ọkụ tanka gbagburu mmadụ 11 n'ime ya n'Enugwu steeti.
Nkọwa foto, Ezinaụlọ ọkụ tanka gbagburu mmadụ 11 n'ime ya n'Enugwu steeti.

Ezinaụlọ Nwaji dị n'obodo a na-akpọ Abofia-Agbaja dị n'Ebonyi steeti na-ebe akwa arịrị ugbua maka ọkụ tanka ahụ gbara n'Ugwu Onyeama, n'Enugwu steeti.

Ọkụ tanka ahụ gbagburu ọtụtụ ndị mmadụ mana mmadụ iri na otu n'ime ndị ahụ niile nwụrụ si n'ezinaụlọ Nwaji n'Ebonyi steeti.

Otu onye n'ezinaụlọ ahụ bụ Ikechukwu Nwaji kọwara onye ntaakụkọ anyị etu ọkụ tanka ahụ si gbuo nwanne ya nwoke na ezinaụlọ ya nakwa mmadụ atọ ndị ọzọ.

N'okwu ya "nwanne m nwoke bụ Nwaji Jeremiah Uchechukwu na nwunye ya bụ Eucheria Nwaji, ụmụaka ha mmadụ isii, na nwanne m nwoke nke ntakịrị nakwa ndị odibo mmadụ abụọ so na ndị ọkụ ahụ gbagburu".

Ndị bịara mgbarute akwa n'ezinaụlọ Nwaji
Nkọwa foto, Ndị bịara mgbarute akwa n'ezinaụlọ Nwaji

Ikechukwu kwuru na "Uchekwukwu du ezinaụlọ ya si Anambra steeti na-alọta n'obodo anyị dị n'Ebonyi steeti maka emume olili ozu nna anyị mgbe ha dabara n'ọdachị ahụ".

Ọ sị na ha niile so alọta mgbe ụgbọala ha dabara n'ime ọkụ tanka ahụ gburu ha n'Enugwu steeti.

O ji ohere ahụ rịọ ka gọọmenti kwụsị ndị tanka ị na-agba n'uhuruchi ma mee ka ọ bụrụ naanị n'abalị ka ha na-agba.

Ọ rịkwara ka gọọmenti nyere ezinaụlọ ha aka maka olili ozu ụmụnwanne ya nwụrụ anwụ.

Mgbe Gọvanọ Enugwu steeti gara ebe ọkụ Tanka ahụ gburu igwe mmadụ

Oge Gọvanọ Peter Mbah na ndị ọrụ ya bịara ebe ahụ tanka ahụ dara

Ebe foto si, Enugu State Government House

Nkọwa foto, Oge Gọvanọ Peter Mbah na ndị ọrụ ya bịara ebe ahụ tanka ahụ dara

Ndị ọrụ Federal Road Safety Corps (FRSC) ekwuola na mmadụ 18 anwụọla n'ọkụ tanka ahụ dara n'Ugwu Onyeama dị n'Enugwu steeti n'ụbọchị Satọde 25 Jenụwarị 2025.

Ozi anyị nwetara, kwuru na mmadụ 10 ndị ọzọ meruru ahụ n'ihe mberede ọkụ ahụ.

Cheta na nke na-abịa ka ọkụ tanka gbagburu mmadụ 98 na Niger steeti n'izuụka gara aga.

Ọkụ tanka ahụ gbagburu ihe karịrị mmadụ 11 n'Enugwu

Ọkụ agbagbuola ihe ruru mmadụ iri na otu n'Enugwu
Nkọwa foto, Ebe ọkụ gbara n'ugwu Onyeama dị n'Enugwu steeti
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọkụ agbagbuola Ihe ruru mmadụ iri na otu (11) n'ihe mberede okporoụzọ mere n'Ugwu Onyeama dị n'Enugwu steeti.

Ihe ịgba anya mmiri ahụ mere n'ụbọchị Satọde 25 Janụwarị 2025 oge ụgbọala bu mmanụ dara wee mụnye ọtụtụ ụgbọala ndị nọ ya n'akụkụ ọkụ n'Ugwu Onyeama.

Ya bụ ihe mberede dara ka ogbunigwe mụnyere ọtụtụ mmadụ ọkụ nke mere na ihe dịka ozu mmadụ iri na otu (11) tọgbọrọ ebe ahụ.

Ndị hụrụ mgbe ya bụ mkpamkpa kpara kwara arịrị na ọkụ ahụ dị nnukwu nke mere na ha enweghị ike ịzọpụta ndị na-agba ọkụ.

Mazi Izuchukwu, onye gwara anyị na ya nọ mgbe ọkụ ahụ malitere kọrọ na ụgbọala tanker ahụ bu mmanụ ji nnukwu ọsọ wee tụgharịa nke mere ka ya bụ tanker na tanker ọzọ suo onwe ha ma nwuru ọkụ. Ha mụnyeziri ụgbọala ndị nọ ha n'akụkụ ọkụ.

Onyeisi ngalaba ụlọọrụ Federal Road Safety Commission n'Enugwu bụ Agbakọba Onyekwere kwuru na ha ga-agwa ndị ntaakụkọ mmadụ ole nwụrụ ebe ahụ nakwa ka ya bụ ọdachi siri mee oge ha chịkọtara ozi ha niile ọnụ.

Ọkụ agbagbuola ihe ruru mmadụ iri na otu n'Enugwu
Nkọwa foto, Ụgbọala ndị na-agba ọkụ n'Enugwu

Peter Mbah eruola uju maka ndị nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ n'Enugwu

Peter Mbah eruola uju maka ndị nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ n'Enugwu

Ebe foto si, Enugu State Government House

Nkọwa foto, Gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter Mbah

Aka na-achị Enugwu steeti bụ Peter Mbah egosila enweghị obiụtọ n'ihi ihe mberede ụgbọala tanker mmanụ mere n'okporoụzọ si Enugwu gawa Onitsha, bụ nke tara isi mmadụ iri na otu (11).

Mbah mere ka a mata nke a oge ọ garuru na mpaghara ahụ ya bụ njinji jiri n'ụbọchị Satọde 25 Janụwarị 2025.

Ọ sịrị na gọọmenti abanyela n'ọrụ iji hụ na ndị ọnọdụ ahụ metụtara natara ezi nlekọta ahụike dịkwa ka ha ga-etinye atụmatụ ndị ga-egbochi ụdị ọdachi ahụ ịdapụta n'ọdịnihu dịka idozi mpaghara okporoụzọ ahụ mebiri emebi nakwa ịhụ na ndị ọkwọụgbọala rubere isi n'iwu okporoụzọ niile.

Ọ kọwara ihe mberede ahụ dịka nke na-agba anyammiri ma kasie ezinaụlọ ndị nke ha nwụrụ anwụ obi

Ọ gara n'ihu nye ntuziaka ka onye Sector Commander ngalaba ụlọọrụ Federal Road Safety Commission n'Enugwu steeti bụ Franklin Agbakoba na kọmịshọna na-ahụ maka ime njem n'Enugwu steeti bụ Obi Ozor hụ na ụgbọala tanker niile bụ mmanụ agba na steeti ahụ nwere ihe mkpọchi ga-egbochi mmanụ ịkwafu ọ bụrụ ma ha nwee ihe mberede.