Ụlọikpe ezigaala Ada Ogbogu ụlọnga maka ịkụji nwa di ya dị afọ atọ ụkwụ

Nwa afọ atọ nwunye nna ya ji akaodo kujie ụkwụ

Ebe foto si, Enugu state government house

Nkọwa foto, Nwa afọ atọ nwunye nna ya ji akaodo kujie ụkwụ
    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụlọikpe majie n'Enugwu ezigala Ada Ogbogu n'ụlọnga maka ebubo iji akaodo kụjie nwa nwoke nwunye dị ya dị afọ atọ ụkwụ.

Oge ndị uweojii kpọtara Ada Ogbogu n'ụlọikpe ka ha gwara ụlọikpe na ọ mere arụ ahụ bụ nke megidere iwu Naịjirịa nke ntaram ahụhụ ya bụ ịtụ ya mkpọrọ n'abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Ọktoba 2024.

Ndị uweojii gwara ụlọikpe na "Ada ji akaodo kujie Kaitobechukwu Ogbogu ụkwụ".

"Kaitobechukwu Ogbogu dị afọ atọ. Nna ya bụ di Ada Ogbogu."

"Ada Ogbogu wụrụ Kaitobechukwu mmiri ọkụ n'imi na n'ọnụ tupu o jiri akaodo ahụ kụjie ya ụkwụ".

"Ihe ndị a niile megidere iwu "Enugwu steeti criminal code, cap 30, Vol. II nke afọ 2004".

N'ụlọikpe, majie na-ekpe ikpe ahụ bụ Alphonsus Edeh ekweteghi nabata arịrịọ ka ndị uweojii tọghapụ Ada Ogbogu.

Majie zigara Ada n'ụlọnga ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ikpe ya ga-amalite n'uju ma yigharịa ikpe ahụ ka ọ bụrụ n'abalị ịrị abụọ na isii nke ọnwa Nọvemba.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Kọmịshịọna na-ahụ maka ụmụaka, mmepe obodo na ugwu dịịrị mmadụ bụ Ngozi Enih kwuru na ịkpụga nwaanyị ahụ n'ụlọikpe so na nkwa gọọmenti Enugwu steeti kwere maka ichekwa ụmụaka na iwu dịịrị mmadụ.

N'okwu ya "unu maara na gọọmenti Peter Mbah adịghị anabata ikpagbu ụmụaka. Onye ọbụla na-emegbu nwatakịrị mara amara na ya na-etinye onwe ya na nsogbu".