Ka anyị si chọpụta nwoke ahụ gburu mmadụ anọ n’ezinaụlọ ya maka ọgwụ ego - Igwe Emeka

Aha onyonyo, Onye ntorobịa gburu mmadụ n'ezinaụlọ maka ọgwụ ego
    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Eze na-achị Owerre Amaeze dị n’okpuru ọchịchị Nsukka n’Enugwu steeti ekwuola ka ha siri chọpụta onye gburu nne ya, nne ya ochie na ụmụnne ya abụọ.

Igwe Emeka Ugwu kọwara nke a mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara ka ọnọdụ obodo ha si dị kemgbe a chọpụtara ihe mere.

Ugwu kwuru na mgbe mmadụ anọ ahụ nwụrụ na “ndị obodo bidoro na-ajụ ase ma gaa kpesara arụsị ndị Amaeze”.

“Ma ndị nne, ndị nwoke, ụmụnwaanyị niile sonyere ma kwuo na a ga-achọpụtarịrị ihe mere”.

“Enweghị onye uche ya gwara na ọ nwereike ịbụ nwa ha nwoke tinyeere ha nsị na nri”.

“Mana ka ndị ichie, ụmụntorobịa gachara kpọtụrụ arụsị dị na be anyị, onye mere ya apụta wee kwuo ihe mere o jiri mee ya”.

“Ọ sị na ya mere ya ka ya dị ka ibe ya. A pụta a na-awụli ego elu”.

“Mgbe e jidere onye mere ihe ahụ, oge o ji ọnụ ya kwuo ihe o mere. A sị ka e gbuo ya mana m gwara ha mba. Obi dị m mma na ụmụntorobịa gere mụ ntị ma kpụrụ ya ranye n’aka ndị uweoji”.

“Ọ bụrụ na ha gburu nwatakịrị ahụ, agaghi ejide dibịa ahụ gwọọrọ ya ọgwụ”.

Ka anyị si chọpụta onye ahụ gburu mmadụ anọ n’ezinaụlọ ha - Igwe Emeka

Etu 'Anaegbuachara si gbuo mmadu anọ n'ezinaụlọ ya

Akụkọ kwuru na nsogbu ‘Anaegbuachara’ bidoro mgbe ọ chọrọ ịgwọ ọgwụ ego.

Dịka ihe ‘Anaegbuachara’ kwuru mgbe e jidere ya n’ihe onyonyoo na-efegharị na soshal midịa, ọ kwetere na ya tinyere nsị na nri ndị ahụ niile nwụrụ n’ezinaụlọ ya riri.

‘Akụkọ kwuru na ọ bụ enyi nwoke ‘Anaegbuachara’ a na-akpọ ‘Morroco’ mere ka ọ mara nwoke dibịa ga-agwọrọ ya ọgwụ ego.

Ọ sị na dibịa ahụ nyere ya ọgwụ nke ọ tinyere nne ya na nrị.

Mana nne ya ochie na ụmụnne ya ndị ọzọ soro rie nri ahụ ma nwụọ ka ha richara ya.

Ndị uweoji ebidola nyocha maka ya

Ndi uweoji

Ebe foto si, EnuguPolice/Facebook

Nkọwa foto, Ndi uweoji

Ndi uweojii n’Enugwu kwuru na ha ebidola ime nnyocha maka nwoke a sị na o gburu nne ya, nne ya ochie, nwanne ya nwaanyị na nwa ya.

Mkpamkpa ahụ kpara n’Enugwu mere n’obodo Amaeze dị n’okpuruọchịchị Nsukka na steeti ahụ.

Aha a na-akpọ nwoke ahụ a sị gburu mmadụ anọ n’ezinaụlọ ya bụ ‘Anaegbuachara’.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe gwara BBC Igbo na ya anụla maka mkpamkpa ahụ.

Daniel Ndukwe kwuru na ugbua, “a gwara m na e nwere ndị e jidere maka mkpamkpa ahụ bụ ndị a na-enyo enyo na aka ha dị na ya”.

“Nnyocha na-aga n’ihu ugbua. E nwee ihe ọzọ pụtara, anyị ga-eme ka ị mara."