"Biko hapụrụ anyị ụlọ anyị" ụmụnwaanyị Aguowa na-arịọ Gọvanọ Peter Mbah
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara na Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Reporter na Journalist
- Ebeg o si, Enugu state, Nigeria
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Ụmụnwaanyi bi na mpaghara Aguowa dị na TransEkulu Enugwu ewerela obi akwa na iru uju mee ngaghariwe udo iji rịọ Gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter Mbah ka o wepụ aka n’ala ha.
Ha bere akwa gaa na obi Eze Nnaji nke obodo Nike gwa ya gbakwutere ha ọsọ enyemaka n’ihi na mmiri na-achọ iri ha.
Igwe Nnaji gwara ha na ya emela ike ya na ọ bụzị gọmenti ji ji ma jide mma.
Ka BBC rutere n'Aguowa, ụmụnwaanyi na ndị nwoke zukọrọ ọnụ kọwaa ihe bụ nsogbu ha.
Ọ bụ gịnị na-ese okwu?

Otu n'ime ndị ndu ụmụnwaanyị ahụ Josephine Ifeyinwa Okechi kọwara na ọ bụ n’afọ gara aga ka ọchịchị gọvanọ peter Mba ziteere ha akwụkwọ, si ha kwara ngwo ngwo ha pụọ n’ihi na ereela ala ha ka arụọ ya ụlọ mara mma.
Ha gbara mbọ ka ha hụ gọvanọ kọwaara ya na ndị nna nna ha biara ebe ahụ na 1924, onye ọbụla zụrụ ala ndị ahụ ego ma gbazuo akwụkwọ niile dịka iwu Enugwu Steeti siri dị.
Oriaku Monica Ude kwuru na ya bị na Aguowa kamgbe 1967, ọ nọ ebe ahụ tupu ọgụ amalite, ma mụkwaa ma zụọ ụmụ ya niile na Aguowa.
Ụmụ nwoke bi ma nwee ụlọ ebe ahụ rịọrọ Gọvanọ Mba ka ọ nwee ncheghari obi maka na onweghi ebe ọbụla ha na-aga.
Mazi Uche Adinde, Okwus na Iyiama Basil Okwuchukwu bụ ndị nwere ala n'Aguọwa kwuru na gọvanọ ndị niile chiburu Enugwu maara na ha zụtara ya bụ ala n'aka gọọmenti, nweee ikike site n’aka ụlọ ọrụ Ministri nke ala, nakwa nke ndozi obodo.
Ndị niile gbakọrọ ebe ahụ kwuru na gọmenti siri ha gawa na Akpuoga Nike nke dị n’ime ime obodo, ha wee kwuo na ha agaghị ahapụ ụlọ ha ma ncha gaa ebe ọbụla.
Kedụ iwu Gọọmenti kpatara nsogbu a?

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Cheta na ka gọmenti Enugwu wepụtara ozi n’ụbọchi Oktoba 13th 2024 , kwuo na ha ga-eweghara ebe obibi karịrị iri abụọ na ise na gburu gburu Enugwu, n’ihi na ha chọrọ iji ya rụọ ebe obibi mara mma ma bụrụ ọgbara ọhụrụ.
Dịka ozi ahụ ọchịchị Gọvanọ Peter Mbah wepụtara siri kwuo, ha ga achụpụ ndị niile bị na Agu-Owa dị na Trans Ekulu Enugwu nakwa Ugbo-Lawrence dị na Idependence layout.
Ozi iwu ahụ kọwara na gọmenti Enugwu ga-arụrụ ndị ahụ ha chụpụrụ ụlọ ọzọ n’Akpụọga nike bụ ebe ha ga-edobe ha.
Gọọmenti ga-ewerezia ebe ha siri pụọ rụọ ụlọ elu ogogo ọgbara ọhụrụ “high rise building”.
Gọmenti Enugwu kwukwara na ha mechaa nke Agu-Abo na Ugbo-Lawrence, na ha ga amalite ya na ebe ndị ọzọ dị iri abụọ na atọ.
Mana ndị bi na ya bụ Agụowa tisiri nkpu ike n’onweghị ụlọ a rụrụ ha ma na asi ha na “onye laa ụlọ ekeresimesi, ya alaghachikwala azụ n’AgụOwa”.
Nkea mere ha jiri si gọmenti Enugwu, kwụsị iwakpo ha anya n’ihi na ha aṅụọla iyi na ha agaghị apụ n’ụlọ ha.
Gọọmenti Enugwu a ga-akwụ ha ego iti aka n'obi gwọ?
Oge BBC Igbo kpọtụrụ Uche Anichukwu bụ onye ọlụ na ngaraba mgbasa ozi Gọọmenti Enugwu ka ọ kwuru na "ndị niile ọ metutara agaghị ejiri ego ha zụta ala n'ebe ọhụrụ ahụ gọọmenti sị ha gaa".
“N’ebe ọhụrụ ahụ ha na-aga, gọọmentị na arụrụ ha okporo ụzọ, ọkụ latrịk ma ụlọọgwụ n’ihe e ji enyere ndụ aka dị icheiche”.
"A ga-enye ha 'Certificate of Occupancy" bụ akwụkwọ ikike gosiri na ọ bụ gọọmenti nyere ha ala ahụ".
Mana Uche enweghị ihe o kwuru gbasara na gọọmenti a ga-enye ndị ahụ ego ịtị aka n'obi ma ọ bụ ego ga-enyere ha aka ịlụ ụlọ n'ala e kwere ha na nkwa.










