Ụzọ-Ụwani Attack: Etu ndị a mabeghị si gbuo ụmụnne abụọ, bekasịa ha n' Enugwu Steeti

ụmụnne abụọ e gburu

Ebe foto si, Tony Mama

Ndị obodo Adani dị n’okpuruọchịchị Uzo-Uwani n’Enugwu Steeti nọ na nnukwu iru uju ugbua maka ogbugbu ndị omekome gburu umu nne abụọ si n'ọrụ ugbo na-alọta.

Ndị e gburu bụ Ogbonna Fidelis Anene gbara afọ 33 na nwanne ya bụ Ogbonna John Onyeka gbara afọ 25.

Ọdachi ojọọ a mere n'ụbọchị Sọnde 7 Eprel 2024, mgbe ụmụnne ahụ si n'ọrụ ugbo alọta, ha wee zute ndị omekome wakporo obodo ha.

Ndị a omekome ahụ gburu ha, were mma bekasịa ozu ha ma tọgbọ ha n’ụzọ.

Ezinaụlọ e gburu ụmụ ha abụọ

Ebe foto si, Enugu State Police

Ka ndị Adani chọpụtara ozu ha, nke a butere ngagharịiwe mekwaa ka ndị ntoroọbịa ṅụọ iyi na ha ga-abọrịrị ọbọ maka ọnwụ ụmụnne ahụ.

Ụfọdụ ndị obodo ahụ gwara BBC Igbo kwuru na ha amaghị kpọmkwem ndị kpara ajọọ arụ ahụ.

Ụfọdụ na-eche na ọ bụ ndị ọchịehi nọ n'ime ọhịa ebe ndị ọzọ na-eche na ọ bụ obodo ndị nọ ha nso ha na-azọsị ala.

Biko mịnyenụ mma unu n'ọbọ - Kọmishọna uweojii

Kọmishọna ndị uweojii na-akwa ndị obodo Adani okwu

Ebe foto si, Enugu State Police

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Kọmishọna uweojii n'Enugwu Steeti bụ Kanaya Uzuegbu gara njem nleta na iti aka n’obi n'Adani n'ụbọchị Mọnde 8 Eprel 2024.

Ọ kpọkuru ndị ntoroọbịa na ndị agadị ma rịọ ha ka ha hapụrụ ndị uweojii ọrụ ha ma kwee na ọ gaghị ezu ike ruo mgbe ha chọpụtara ma nwuchie ndị kpara arụ a.

Uzuegbu bụ onye du ndị ọrụ ya mee njem ahụ kwuru na oge eruola mgbe aka ga-akpara ndị na-egbu mmadụ kwa mgbe kwa mgbe n’Adani nakwa ebe ndị ọzọ n’Uzo Uwani.

O nyere ndị ezinaụlọ e gburu ụmụ ha abụọ nakwa ndị obodo ozi iti aka n'obi si n'aka Gọvanọ Peter Mbah nke Enugwu Steeti.

N'aka nke ọzọ onye ji ọkwa 'President General' nke Adani bụ Emmanuel Utazi kwuru na ndị obodo ha anaghị achọ okwu kama na ọ bụ obodo ndị ọzọ n'agbata ha na-ebusokaarị ha agha.

Utazi rịọrọ gọọmentị ka ha gbaa mbọ nwuchie ndị a na-egbuzi ndị obodo ha bụ Adani na-acheghi echiche.

Ọgbaghara na ogbugbu mmadụ na-adapụtakaarị na mghara obodo Adani na gburugburu ya, n'ọnwa ole ma ole gara aga ka ndị omekome wakporo ma gbuo otu Igwe n’obodo ahụ.

E nwekwaala akụkọ banyere ndị ọchịehi igbu ndị ọrụ ugbo na be ha, tinyekwara ọtụtụ ndị e gburu maka ịzọ okeala dị n'etiti Adani na ndị agbataobi ha.