Red Cross Orphanage: Gọọmentị Enugwu enyela ụmụaka ndị a ọnọdụ ọhụru ka akụkọ BBC pụtachara

Obere mgbanwe adịla n’ọnọdụ ụmụaka na-enweghi nne nke ụlọorụ Red Cross dị n’Enugwu dika gọọmentị kpọgara ha ebe ka mma ha ga-anọ nwa mgbe nta ruo mgbe a ga-emezicha ụlọ ọhụrụ e nyere ha.
Nke a na-abịa dịka BBC Igbo mechara akụkọ banyere nkutu ụlọọrụ ụmụaka ndị a nakwa ọnọdụ ọjọọ ebe ọhụrụ a kpọgara ha.
Kọmishọna na-ahụ maka okike mmadụ n’Enugwu Steeti bụ Ngozi Enih kwuru na ọ bụ ji aka ya kpọro ụmụaka ndị a kpọga n’ebe ha nọ ugbua ruo mgbe a ga-aga emezicha ụlọ nke ha.

N’izuụka ụka abụọ gara aga ka ndị ọrụ gọmenti Enugwu bịara na mberede kutuo ụlọ ebe ụmụaka na-enweghi nne nk Red Cross nakwa ụlọ ndị ọzọ gbara ya gburu
Mgbe BBC ruru n’ebe ọhụrụ e dosara ụmụaka ndị a nwa mgbe nta bụ na Ken David Orphanage Home dị n’Amechi, ndị ọrụ Red Cross kwuru na ebe ahụ dị ha mma n’ahụ karịa ebe mbụ ahụ.
Odeakwụkwọ Red Cross bụ Tony Udegbu kwuru na obi dị ha mma na gọọmentị emeela iha ha kwesịburu ime tupu ha amalite ikutu ụlọ ha.
"Akpị na agwọ na-arịbata n'ụlọ ebe gọọmentị Enugwu kpọgara ụmụaka na-enweghi nne"
Ndị ọrụ na-elekọta ụmụaka ndị na-enweghi nne nke ụlọọrụ Red Cross nwe n'Enugwu Steeti akọwaala ajọ ọnọdụ ha n'ụlọ ebe gọọmentị Enugwu Steeti kpọgara ha.
Nke a na-abịa n'ime otu izuụka gọọmentị steeti ahụ kutuchara ụlọ obibi ha dị na mpaghara Holy Ghost ma buga ha ebe ọzọ.
Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-elekọta ụmụaka ndị a kwara arịrị ma kwuo na ọ bụ n'ụlọ a na-arụchabeghi ka a kpọgara ha.
Otu onye n'ime ha kwuru na akpị na agwọ na-esi n'ọhịa dị n'akụkụ ụlọ ahụ arịbata n'ime ụlọ ebe ụmụaka ndị a nọ.
Onye nke ọzọ kwuru na ụlọ ahụ enweghi olulu ebe mposi na-abanye na ọ ka bụ ugbua ka a malitere igwu olulu ahụ.
Ha rịọrọ gọọmentị Enugwu steeti ka ha biko gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi ọnọdụ ahụike ụmụaka ndị a.
Na nzaghachị, gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter Mbah enyela iwu sị ka a kpọpụ ụmụaka ndị a n'ụlọ e nyeburu ha ebe akpị na agwọ juru ma kpọga ha ebe ka mma.
Ọnọdụ ụmụaka enwe nne dịka Gọọmentị Enugu kwatụrụ ụlọ ha

Ebe foto si, Red Cross Orphanage
Dịka Gọọmentị Enugwu steeti kwaturu ụlọ, ọdọahịa na ewumewu ndị ọzọ dị na Holy-Ghost Roundabout, Enugwu, ọnọdụ ọdịmma ụmụaka enwe nne na nna ruru 14 nke ogige 'Red Cross Society Orphanage aghọọla agba-ekpere-chi dịka a wụsara ha n'ụlọ arụchaghị arụcha na mpaghara ọzọ na steeti ahụ.
N’ụbọchị Satọde, abalị ịrị nke ọnwa Mee nke afọ 2024, kụkpọrọ ọtụtụ ewumewu dị na mpaghara Holy Ghost n'ebe okporo ụgbọ oloko(Railway) gụnyere;Red Cross Orphanage, ọdọ ụgbọala dị iche; Chimkasimma Motors, GUO, Godisgood, na ụlọakụ dị iche iche sị na ọ bụ iji nye ohere maka iwu nnukwu ọdọụgbọala agba ọhụrụ.
Dịka ụfọdụ ndị ọrụ na-eru n'okwu na-eti mkpu banyere ihe ga-abụ ọnọdụ ndị nọbe n'ebe ndị e tikpọrọ, ndị ọrụ Gọọmentị steeti ahụ kwuru na enyela ha ebe ọzọ ha ga-anọ.
Mana nchọpụta BBC banyere ọnọdụ ụmụaka ahụ bụ na-enyere ha ọnọdụ ebe Ụlọgwụ UNTH ochie n' ụlọ arụchabeghị arụcha bụ ebe e nweghị mmiri nakwa ụlọmposi.
Ihe Onyeisi Red Cross kwuru

Ebe foto si, Nigeria Red Cross in Enugu
Onyeisi ndị Red Cross na Naịjirịa bụ Abubakar Kende gwara BBCIgbo kwuru n'ezie na gọọmentị nyere ha ebe ha gakwaga ma weta ndị ọrụ ngo ka arụsị ebe ahụ mana ha emebeghị ihe ndị kwesịrị ka ha mee iji mee ka ebe ahụ di obibi maka nlekọta ụmụaka.
“Anyị na gọọmentị nwere nkwekorita, ha nyere anyị ebe anyị ga-anọ ma nyekwa ndị ọrụ ngo ka ha dozie ebe ahụ.
" Mana ọ bụ ihe obi mgbawa na onye ọrụ ngọ e nyere ụlọ ahụ ka o dozie arubeghi ihe ọbụla.”
Nkwekọrịta anyị na Gọọmentị Enugu - Tony Udegbu

Ebe foto si, Nigeria Red Cross in Enugu
N'otu aka ahụ, Onyeisi ndị Red Cross n’ Enugu bụ Tony Udegbu kwuru na ọ bụ eziokwu na Gọọmentị Enugwu nyere ha ebe ọzọ ha ga-anọ tupu a kwatụọ ụlọ ha mana ọ kọwara na ọnọdụ ebe adịghị mma maka ilekọta ụmụaka n'ihi e nweghị ihe e ji enyere ndụ aka dịka mmiri, ụlọ mposi na ihe ndị ọzọ.
“Ụmụaka anyị nọ UNTH nke ochie nke a na-akpọ 'Bunker" bụ ebe gọọmentị nyere nyha ọhụrụ a.
“Mana e dozichabeghi ya tupu a chụpụ anyị ebe anyi nọbu."
" E nweghị ụlọmposi ebe ahụ, ọkụ latrịk na mmịrị adịghị ebe ahụ."
"Ahụ aja n’ụlọ ahụ na-ada ada. Ahụ aja ha kụwara akụwa ka dị etu ahụ. Ebe ụfọdụ enweghi ụzọ ma ọ bụ mpịọ.”.
“Etu e si chupu anyị, anyị enweghi ebe ọzọ anyị ga eje karịa iduse ụmụaka anyị ebe ahụ.”

Ebe foto si, Nigeria Red Cross in Enugu
N'otu izu gara aga, ihe onyonyo fegharịrị na soshial media gosiri dịka ndị ọrụ ụlọọrụ Red Cross Orphanage kụcha ụmụaka n'aka nọ na gbagharịa dịka a malitere ikutu ụlọ ha.
Tony Udegbu kwuru na nkwekọrịta ha na Gọọmentị Enugu nwere bụ na “Gọọmentị Enugu ga edozi ụlọ ebe e nyere anyị, chere anyị abanye n’ime ya tupuu akwatụọ ụlọ ebe anyị nọ na mbụ".
“Mana ha bịazịrị na mberede, biazie n' oge ha edozichabeghi ebe ha nyere anyị, na-akutu ụlọ n' oge ụmụaka nọ n’ime ya.”
“Anyị gbara mbọ zọputa umụaka, kporọ ha gawa 'Bunker' dị n' ụzọ UNTH ochie bụ ebe gọọmentị sị anyị nọrọ ụgbụa.”
Ụmụaka na-enweghi nne na nna ole ka ọ metutara?

Ebe foto si, Nigeria Red Cross in Enugu
Tony Udegbu gwara anyị na ụmụaka ọ metutara dị mmadu ịrị na anọ mana ewere ụfọdụ n’ịme ha na erubeghi otu ọnwa ma ọ bụ ọnwa abụọ.
“E were ndị a ka bechere ugwu n’ime ha. Ha ga anọ ihe dika ọnwa abụọ ma ọ bụ otu ọnwa”.
Nsogbu ndị ọzọ ha gabigara

Ebe foto si, Red Cross Enugu
E wezụga nsogbu enweghi mmịrị, ọkụ latrik, ụlọmposi na ihe ndị ọzọ n'ebe gọọmentị nyere ha Tony Udegbu gbara ama na ndị mmadu zụkọrọ ọtụtụ ihe ha nwere oge gọọmentị na akutu ụlọ ha.
“Ka gọọmentị na-akutu ebe ahụ, ndị mmadụ bịara na-ezukọ ihe niile anyị nwere ebe ahụ; akwa ụmụaka, ma mmiri araehi ụmụaka na-anụ, nri ha niile, ha zuru ya." ”“Ụmụaka nweghizi nri ha na eri. ”
Ọ t ukwara arịị na “ndị nọosụ anyị bụ ndị na-elekota ụmụaka enweghi ebe ha bị ugbụa."
"Ha na-anọbu nsọ maka ụmụaka mana ụgbụa enweghi ebe ha ga-anọ.”

Ebe foto si, Nigeria Red Cross in Enugu
Mana Tony Udegbu gara n’ịhụ kọwa na ọrụ ka na aga n’ịrụ ịdọzị ebe gọomentị Enugu nyere ha. Ọ kwukwara na “Rụọ abalị gara aga, ha ka na egwu onunu maka ụlọ mpọsị ma na edozi ihe ndị ọzọ”.
Ihe Goọmentị Enugwu kwuru
Mbo BBC Igbo gbara inweta olu okwu gọọmentị steeti ahụ amịtaghị mkpụrụ.
Komishona mgbasaozi steeti ahụ bụ Aka Eze Aka azaghị ekwentị ya oge a kpọrọ ya.
Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka ewumewu na steeti ahụ'Enugu Capital Territory Development Authority' gwaburu onye ntaakụkọ anyị na gọọmentị steeti ahụ enyela ndị nile a kụkpọrọ ụlọ ha maọbụ ọdọahịa ha ebe ọzọ.













