Centenary City Enugu: "Anyị na-arịọ gọọmentị ka ha kwụsị ikutusị ụlọ anyị tara ahụhụ rụọ"

Ụlọ ndị a kuturu na Centenary City, Enugwu Steeti

Ụfọdụ ndị nwere ụlọ na Centenary City Enugwu Steeti bụ ebe gọọmentị malitere ikutu kamgbe izuụka gara aga akwaala arịrị maka etu e si kutuo ụlọ ha.

Otu n'ime ndị a kuturu ụlọ ya bụ Mazi White Nnaji gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị obodo bụ Ndiaga Amechi nwe ala ahụ ma sị na gọọmenti na-azọsi ha ala iwere ya.

O kwuru na otu ụlọọrụ wetere akwụkwọ sị na obosara ala ahụ bụ nke ha mana ndị obodo gbara isi akwara na ọ bụ ala ndị nnanna ha ochie hapụụrụ ha.

Nke mere ọnọdụ ndị kwe na ndị ekweghi a jiri bute ọgbaghara.

Ụlọ a kuriri

Maazi White kwara arịrị na ego o mefuru n’ịrụ ụlọ nke ya karịrị otu nde narị naịra (N100m) mana gọọmentị Enugwu kuturu ya na-eleghi anya n’azụ.

Onye ọzọ a katụrụ ụlọ ya bụ Godwin Ude na-arụ n'ụlọakụ ji anya mmiri kwuo na ọ bụ ego o bitere ebite ka o jiri rụọ ahụ.

Ụlọ a kuturu na Centenary City

Ha rịọrọ gọọmenti ka ọ kpọọ ha ọku nzụkọ iji leba okwu anyị ma tie ha bụ ndị a kuturu ụlọ ha aka n'obi

Cheta na nke a abụghị mbụ gọọmentị Enugwu steeti ga-akutu ụlọ ndị mmadụ na Centenary City, gọọmentị Ifeanyi Ugwuanyi kụturu ụlọ ndị mmadụ ebe ahụ n'afọ ole ma ole gara aga.

Ụlọ anyị kuturu bụ ọdọ ndị ntọrị mmadụ - Gọọmentị Enugwu

Ụlọ ahụ akụturu

Ebe foto si, Supplied

Ngalaba na-ahụ maka nhazi obodo Enugwu bụ Enugu Capital Territory Development Authority (ECTDA) kọwara ihe mere ha jiri na-akutusi ụfọdụ na Centenary City.

Ha kwuru na ọ bụ ụlọ nke ndị ekperima, ndị ntọrị na ndị ohi ji eme mpụ dị iche iche nakwa ụlọ ndị na-enweghi akwụkwọ ikike zuru oke ka ha na-akuri.

N'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Satọde nke onyeisioche ha bụ Uche Anya binyere aka na ya, ha kọwara na ọ bụ ọrụ mkpochapụ ndị ekperima ka ha na-arụ.

"A chọrọ m ka o doo anya na ọrụ ngalaba Ectda bịara n'ebe akpọrọ Centenary City bụ ọrụ nchọpụta banyere otu ụlọ adịgboroja a rụrụ ebe ahụ bụ ebe ndị ntọ mmadụ na-ezo e ji arụ ọrụ ha.

Mgbe anyị na-emezi nyocha ka anyị chọpụtara na ụlọ ahụ dịka ụlọ ndị ọzọ jurui ebe ahụ enweghi akwụkwọ ikike ziri ezi" ka ozi ahụ kwuru.

Ndị anwụchiri maka ebubo ịtọrọ mmadụ na ihe ndị anapụrụ ha

Ebe foto si, Supplied

Ihe ndị uweojii kwuru

N'otu aka ahụ, ndị uweojii n'Enugwu steeti na-ekwu na ọ bụ site n'azụ atụpenyelụ ha ka ha ji nwee ike nwụchie ndị echere bụ ndị ntọ atọ n'ụlọị ahụ. N'ozi nke ha wepụtara, ha kọwara na ndị omekome ejirila otu ụlọ alụghachi ọfụma mere ebe ozuzo.

Ha sị "ndọ omekome ahụ ji ya bụ ebe e zo ọrụ ekperima ha gụnyere, ntọ, izu ohi nakwa ndị ọzọ.

Ihe ọzọ ha kwuru bụ na a ga-akpụpụ ndị ahụ anwụhiri ụlọikpe ịtaa ha ahụhụ.

Lee ihe ndị anapụrụ ndị ahụ anwụchiri

-Otu mma ukwu

- ekwentị iri na atọ

- Akpa anọ na akwa

- Igwe mmụọkụ nke ji anwụ arụ ọrụ ruru anọ.

- Igwe e ji kiri ihe onyonyo.

Onye ọrụ ECTDA ndị ntaakụkọ na-agba ajụjụ ọnụ

Ebe foto si, Supplied