Anyị ejighi 15m anyị ga-eji zụ ọdọ ahịa ọhụrụ - Ndị Ahia Kenyatta
Ndị ahịa Kenyatta Market Enugwu akwaala arịrị na gọmenti Enugwu enyeghị ha ohere inweta shọpụ na ahịa ọhụrụ tupu akwatue nke ochie, ebe ụfọdụ n'ime ha ji iwe kwuo na ikpe ha na gọmenti ka nọ na ụlọ ikpe mana gọmenti kpọrọ ekwọ nkụ kụtuo ya bụ ahịa.
Ndị Enugwu capital tertitory development authority ECTDA malitere kwatuwa ya bụ youth council plaza ụbọchị August 4th nke bụ ebe ndị na-ere Electronics na electrical nọ were kwuo na ha enyela ha ohere karịrị afọ atọ iji kwagaa na nke bekee kpọrọ Permanent site bụ ahị ọhụrụ Kenyatta na Ugwuaji..Enugwu PH Express Enugwu.

Ugbua ha akụtuola ya bụ akụkụ ahịa Kenyatta kpam kpam.
Ndị ahị jị anya mmiri kwuo na ọnụ ahịa kenyatta ọhụrụ dị elu nke ukwuu nke na ha enweghị ike ịkwụ ụgwọ ya.
Onye ode akwụkwọ ndị ahụ akwaturu ahịa ha bụ Igwe Emeka Nwanze kwuru na ọnụ igota shọpụ na ahịa ohụrụ ahụ bụ 15 million, ebe iwere ya nwa mgbe oge bụ 600 thousand na otu afọ.
Ọtụtụ ndị ahịa ahụ kwuru na ha eburula ngwongwo ha lawa n'ụlọ ha n'ihi na ha enweghịzi ebe ha ga anọ ree ya.
Pastor Sam Chukwudobelu onye nwere shọpụ asatọ akwaturu yọrọ gọmenti ka o cheta na ha na ndị ahịa ka nọ n'ụlọ ikpe gbasara ya bụ plaza. Ndị ahị ọzọ yọrọ gọmenti ka nye ụmụ ogbenye enweghị ike igota shọpụ ebe ja ga anọ zụọ ahịa.
Onye Isi Oche Enugwu Capital Territory Development Authority bụ Dọkịnta Joseph Umunnakwe Onoh kwuru na Gọmentị Enugwu nyere ndị ahịa Kenyatta ohere ruru afọ atọ iji kwapụ gaa na Permanent site mana ha kpọrọ ekwo nkụ.
Onoh kwuru na ọ bụghị eziokwu na ahịa ọhụrụ ahụ agaghị abata ndị nọ na ahịa Kenyatta ochie, were kwuo na onye rụọ ụka, ya gas were anya ya hụ na ohere dị na ya bụ ahịa kenyatta ọhụrụ ga abata ọnụ ọgụ karịrị ha ugbororo ole ma ole.



