Etu ụlọ dara na Coal Camp Enugu sị taa isi ụmụaka anọ si n'otu ezinaụlọ

Ụlọ dagburu ụmụaka n'Enugwu
Nkọwa foto, Ụlọ dagburu ụmụaka n'Enugwu

Ụlọ dara na Coal Camp Enugwu na Fraịde ụbọchị mbụ nke ọnwa Sepụtemba ataala isi ụmụnne anọ ma dobe nne ha na ụmụnne ha ndị ọzọ n'ọnọdụ ọjọọ.

Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ chọpụtara na ọdachi a mere mgbe oke mmiri ozuzo zochara na mgbede ụbọchị ahụ nke mere ụlọ a dị na ndagwuru jiri daa.

Nwaanyị ajadu bụ modesta Okereke, onye ụlọ a dagburu ụmụ ya anọ kwara arịrị ma sị na ya na ndị ka dị ndụ enweghi ebe obibi.

“Uwa agbaala m gharịị maka na aja ụlọ dagburu ụmụ m anọ. Di m anwụọla, ụlọ m adaala, enweghi m onye enyemaka" ka nwaanyị a gwara onye ntaakụkọ BBC.

Ezinaụlọ Okereke, ndị Aku Nsukka n'Enugwu steeti nọ ma nnukwu ibe akwa na iru uju ugbua n ‘ihi ihe mberede tara isi ụmụ ha anọ.

Dịka ọ dị ugbua, nwaanyị na ụmụ ya abụọ ka nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.

Mpụta ebe ụlọ ahụ dagburu ụmụaka
Nkọwa foto, Mpụta ebe ụlọ ahụ dagburu ụmụaka

Chinedu Ude bụ onyeisi ndị nchekwa n'ebe ahụ gwara BBC na ha nọ na mgbede ụbọchị Fraide mgbe ha nụrụ nnukwu ụzụ.

Onye ọbụla gbapụtara ma hụụ na aja ụlọ ahụ adakwasịla ụlọ dị na ndịda mmiri Ogbette.

“Ozugbo anyị hụrụ ihe na eme, ụmụokoroọbịa gbakọtara aka banye n’ụlọ nwaanyị ahụ ebe anyị bọpụtara ụmụ ya isịị.

Anọ nwụrụ anwụ ebe abụọ nọ n’ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ"

Nwaanyị ọzọ bụ onye agbataobi bụ Patricia Okoye kwuru na obi agbawaala ya maka na ụmụaka ahụ na ụmụ nke ya na-ebi ka nwanne.

O kwuru na ụmụaka ndị nwụrụ gụnyere; Munachimso, Obunmaeme, Favour na Ahuoma Okereke.

Ngalaba ECTDA agbachiela ebe ahụ ma si ndị bi ebe ahụ kwapụ ozigbo
Nkọwa foto, Ngalaba ECTDA agbachiela ebe ahụ ma si ndị bi ebe ahụ kwapụ ozigbo

Cheta na onyeisi Enugu Capital Territory Development Authority (ECTDA) bụ Uche Anya gwara ndị ụlọntaakụkọ gara njem nleta n'ebe ọdịchi a mere.

O kwuru na ebe ahụ bụ ụlọ ekewapụtara iji zụọ anụmanụ mana ndị mmadụ tụgharịrị ya ka ọ bụrụ ụlọ nwere imeụlọ 44 ebe ihe ruru mmadụ narị abụọ bi.

"Ndị mmadụ ekwesighi ibi n'ụlọ ahụ chaachaa. Gaa ebe ahụ ka ị hụ"

"..o wutere m na ndị nwụrụ n'ihe a bụ ụmụaka aka ha dị ọcha" .