'Landlord jụrụ inye m ụlọ si na m jọrọ njọ'

Nwaagbọghọ na-ebe akwa maka na landlord jụrụ inye ya ụlọ

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Ebeg o si, Legọs

N’ụwa niile gba gburugburu, inwe ebe obibi bụ ihe e ji enyere ndụ aka. Ọ bụ ihe kwesịrị ka onye ọ bụla nwe, gụnyere ụmụ agbọghọ na-alụbeghị di.

E kwesịghị iwe ihe aka mgba tupu nwoke maọbụ nwaanyị enwe ike ịnweta ụlọ ebe obibi.

Mana otu ọ dị ugbua, ọtụtụ ụmụagbọghọ alụbeghị di aa na-aga nnukwu nsogbu banyere inweta ụlọ na Naịjirịa.

'Ihe anyị gabigara'

Nwagbọghọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwa agbọghọ inweta ụlọ na-enye nsogbu

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Olive Emodi gwara anyị na ya tara ahụhụ tupu ya nweta ụlọ na legọs.

O kwuru na ọtụtụ ndị nwe ụlọ na-enye iwu megide ụmụ agbọghọ ibi n'ụlọ ha.

"Ụfọdụ ndị nwe ụlọ gwara m na ha enweghị ike ịnye m ụlọ maka na ha achọghị ọtụtụ ụmụ nwoke n'ụlọ ha".

Otu n'ime ha gwara m si, "Ụmụ agbọghọ na-enwe ọtụtụ enyi nwoke ndị na-achọta ha n'ụlọ ha mgbe niile. Ọ gara n'ihu kwuo n'oge ụfọdụ nke a nwere ike ibute ọgụ nke nwere ike imebi ụlọ ya ma ọ bụ ihe ya tinyere n'ụlọ ya."

"Nke kachasị wute me bụ mgbe otu onyenweụlọ gwara m na ọ bụrụ na ya nye m ụlọ, na m ga na-abata tupu ọ kụọ Elekere Itoolu abalị."

Olive gara n'ihu gwa BBC na otu nwaanyị nwe ụlọ gwara ya na ihe mere o ji anaghị enye ụmụagbọghọ ụlọ bụ maka na ha na-enwe oke mmetụta banyere ọtụtụ ihe. Ụfọdụ ka o kọwara dị ka ndị na-enye oke nsogbu oge ọbụla.

Ụlọ ebe obibi ndị mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọ ebe obibi ndị mmadụ

Bisola Adejumo gwara BBC na otu onyenweụlọ gwara ya na ọ bụ maka na ọ maghị mma iru ka o ji ghara inye ya ụlọ.

Bisola gbakwunyere sị, "Ọ jụrụ m si,'Ị bụ onye ebe? Anaghị m enye ụmụagbọghọ jọrọ njọ ụlọ m'."

N’aka nke ọzọ, Sarah Orji bụ nwa agbọghọ nwere ihe aka mgba mgbe ọ na-achọ ụlọ. ‘Otu onye nwe ụlọ kwetara inye ya ụlọ mana nwunye ya sịrị mba.” Sarah kwuru.

“Amaghị m ihe mere nwunye nwoke ahụ ji achọghị ka m nwere ụlọ ahụ na agbaghehi na di ya kwetara”.

Mgbe m jụrụ nwunye ya ihe mere o ji achọghị ka m nwere ụlọ ahụ, ọ gwara m “Ọ bụ naanị nwoke ga-ebi n’ulo m, achọghị m nwa agbọghọ.”

Obodo mepere emepe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọ obibi ndị mmadụ

Otu onye na-ahụtara ndị mmadụ ụlọ a kpọrọ 'House Agent' na Bekee gwara m chọọ otu nwoke ga-anọ dịka di m ma ọ bụrụ na m chọrọ ịnweta ụlọ osịsọ.

Nke a bụ ihe mgbawa obi.

Nwa agbọghọ nọ n'ụlọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu nwa agbọghọ nọ n'ulọ ya

Ọ bụ ihe dị mkpa ka onye ọbụla tinye ọnụ ị ji hụ na-ịkpọasị megide ụmụ agbọghọ na-achụ nta ụlọ bụ ihe ochie.

Mana ọ bụ gịnị kpatara na ụfọdụ ndịnweulo anaghị ekwe ka ụmụagbọghọ alụbeghi di biri n'ụlọ ha?

Ihe mere anyị anaghị enye ụmụ agbọghọ ụlọ

Nwoke na-aza ekwenti

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwoke na-aza ekwenti

Onye na-ahụtara ndị mmadụ ụlọ kwuru na ụfọdụ ndị nwe ụlọ ọ na-arụrụ ọrụ anaghị ekwe ka nwa agbọghọ alụbeghị di biri n'ụlọ ha maka na ha anaghị ekwe agwụụgwọ ụlọ.

Idowu Gbenga bụ onyenwereụlọ na Legọs.

O kwuru na ụfọdụ ndị otu ya anaghị enye ụmụ agbọghọ alụbeghị di ụlọ maka na ụfọdụ n'ime ha na-ebi ajọ ndụ tinyere na ụfọdụ ha amaghị edobe ụlọ ọcha.

Ọ kọwara na tupu ya enye nwaagbọghọ ụlọ, ọ ga-eme ezi nnyocha ịchọpụta akparamaagwa ya.

O kwuru na ọ bụrụ na nwaagbọghọ ahu na-enyi akwa na-egosi ahụ ya, agaghị m enye ya ụlọ m.

Idowu gara n'ihu kwuo "Anaghi m enye nwa agbọghọ mụrụ nwa mana ọlụbeghị di ụlọ maka na ha ga enwere ụlọ ya mere ihe ọzọ, ịkwụ ụgwọ ụlọ na a bụrụ ha nsogbu."

'Ọ bụghị ihe e ji mara ndị Ọwụwa Anyanwụ'

Nwoke na-ezu ike n'ụlọ ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwoke na-ezuike n'ụlọ ya

Otu onyenweụlọ na Legọs aha bụ Uche Peter Okafor kọwara na ịkpọasị megide ụmụ agbọghọ na-achọ ụlọ abụghị ihe e ji mara ndị Ọwụwa Anyanwu.

Ọ sịrị,"Anaghị m ajụ inye ụmụagbọghọ alụbeghị ụlọ m, ihe dị m mkpa bụ ịkwụ m ego ụlọ."

Ọ gara n'ihu kwuo na ụfọdụ ndị nwe ụlọ anaghị enye ụmụ agbọghọ ụlọ maka na ụfọdụ n'ime ha ga- ewere ụlọ gị mere ebe oriri na ọṅụṅụ nye ndị enyi ha.

N'aka nke ọzọ, Okafor kwuru na oge ụfọdụ, ụmụ agbọghọ ndị a ga-acho ka ha na onyenweụlọ bido nwebe mmekọ nwoke na nwaanyị nke ga-emezi onyenweụlọ agwụsi ịna ya ego ụlọ ọbụla.

Kedụ ihe iwu kwuru?

Ọkaiwu Fred

Ebe foto si, Fred Nzeako

Onye ọkaiwu bụ Fred Nzeako gwara BBC Igbo na iwu e megideghị onyenweụlọ ịsị na ọ gaghaghị enye nwaagbọghọ ụlọ.

N'okwu ya "Ọ bụghị ihe megidere iwu na mmadụ jụ inye mmadụ (maa nwoke maa nwaanyị) ụlọ n'ihi na onyenweụlọ nwere ike ịsị mba maọbụ ee' banyere inye ụlọ"

"Ebe ọ bụ ihe megidere iwu bụ mgbe onyenweụlọ "dere n'akwụkwọ" na ya agaghị enye nwaagbọghọ ụlọ maka na ọ lughị di."

"Ọ bụrụ na e nwere ebe onyenweụlọ ahụ dere na ya agaghị enye nwaagbọghọ ụlọ, ụlọikpe nwere ike ịkpọ onyenweụlọ ahụ iji chọpụta ihe kpatara nke a.

Ọ bụrụ na e mee nnyocha banyere ihe ahụ o dere wee chọpụta na o megidere iwu, ụlọikpe nwere ike ịta ya ahụhụ dị ka iwu si kwuo.