Demas Nwoko: 'Ịrụ ụlọ ekwesịghị iri gị ego makana ihe e ji arụ ya dị n'ala'

Aha onyonyo, Ihe mere ụlọ aja jiri bụrụ ọkachamma na mpaghara Afịrịka - Demas Nwoko

A bịa na ndị na-ewu ụlọ na Naịjirịa otu onye aha ya na-ada ezigbote ụda bụ Demas Nwoko.

Otu ihe kpatara ya bụ na Maazi Nwoko na-etinyekarị akara ndị gboo ji ewu ụlọ, n'ụlọ ndị ọ na-arụ.

Ọzọ bụ na Demas amụghị iwu ụlọ amụ.

Ọ kọwara na ọ bụ ọnatarachi ya dịka nna ya na nna nna ya bụ ndị na-arụ ụlọ.

N'ihe nkiri a, Demas kọwara ihe mere o ji na-ekwu na ịrụ ụlọ abụghị ihe kwesịrị iri ego maka ọtụtụ ihe e ji arụ ụlọ dị n'ala.

Lee nkọwa ya nakwa ụlọ o jiri mee ngosiputa n'akụkọ a Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo mere.