Ihe Nobert Young na Stanley 'Ontop' kwuru maka ọnwụ Zulu Adigwe

Ebe foto si, Zulu Adigwe/Facebook
Onye ejije Nollywood a ma ama bụ Zulu Adigwe alaala mmụọ.
Akụkọ ọnwụ Adigwe malitere wuwe na sochal midịa n'ụtụtụ Wenezde dịka otu onye ihe ejije Nollywood bụ Stanley Nwoko kwupụtara ọnwụ ya.
Ozi ahụ kwuru sị, "Eji m obi mwute ekwupụta ọnwụ onye ejije kajara akaja bụ Maazị Zulu Adigwe."

Ebe foto si, NOBERT YOUNG?STANLEY ONTOP/FACEBOOK/INSTAGRAM
“Enyochabeghị ihe butere ọnwụ ya, Laa n'udo, ezi onye ihe ejije."
Onye ọzọ kwanyeere Adigwe ugwu bụ ogbo ya n'ọrụ bụ Norbert Young.
Ọ sị "ị ma gị nakwa ịso gị rụ ọrụ bụ ihe ịkpalite mmụọ mgbe niile
ka ndụ ọma gị zuo ike n'akụkụ Chineke" n'ime ozi ahụ o dere n'akara Facebook ya.
Zulu Adigwe: Ihe i kwesịrị ịma maka onye ejije Nollywood a lara mmụọ

Ebe foto si, Zulu Adigwe/Instagram
Omeiheonyonyo a ma ama na Nollywood bụ Zulu Adigwe anwụola dịka akụkọ si na ọ rịachara ọrịa obere oge.
Adigwe, onye e ji ime agwa dibịa mara n'ihe ejije nwụrụ na mgbede Tuzde dịka onyeisioche ngalaba otu jikọrọ ndị na-eme ejije 'Actors Guild of Nigeria' n'Enugwu steeti bụ Browne Ene siri kọwaa.
Dịka Ene siri kwuo, ndị ezinaụlọ Adibe ekwupụtabeghị ihe gburu nna ha kpọm kwem.
Na nsonso a, ọnwụ bịara ndị Nollywood ọbịa dịka ọ kpọọrọ ndị Nollywood nwere agba dịka John Okafor a ma dịka 'Mr Ibu, Amaechi Muonagor, Obum Odonwodo a ma dịka Junior Pope' na ndị ọzọ.
Gịnị ka e ji echeta Adigwe?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
E ji ikwu okwu amamiihe mara Adigwe oge ọ dị ndụ.
Otu n'ime ozi ọ wepụtara oge ọ dị ndụ kwuru sị, "I nwere ike na-agabiga ihe mgbu ugbua, mata na ihe mgbu na-abịa ,na alakwa."
Ebe ọzọ o kwuru sị, "Inwe ego dị mma, mana emela ego nna gị ukwu."

Ebe foto si, Zulu Adigwe/Instagram
Ihe ndị ị maghị maka Adigwe

Ebe foto si, Zulu Adigwe, Instagram
Zulu Adigwe bụ onye ejije Nollywood a ma ama ma bụrkwa , otiegwu nakwa onye na-ede akwụkwọ.
E ji agwa o mere n'ihe onyonyo TV o sonyere na ya n'agbata afọ 1987 bụ 'Basi and Company' bụ ebe ọ zara Mr B mara odogwu a.
Adigwe mere agwa Pascal Nworie n'ihe ejije "Living in Bondage" bụ ihe ejije ụfọdụ kwuru meghere ụzọ Nollywood ọzọ ka ọ bụrụ ihe a ma ama taa.
Adigwe esonyela n'ọtụtu ihe ejije ndị ọzọ gụnyere "Checkmate", "Blood of the Orphan," "Living Abroad", Breaking Free" wdg.
Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na nwaamadị a gụrụ 'Theatre Arts' na mahadum 'University of Ibadan'(UI) na-eti egwu.
Ya bụ aka mere ụfọdụ egwu a na-akpọ n'ihe ejije Nollywood Bekee kpọrọ 'background music'.
Adigwe lụrụ nwaanyị aha ya bụ Blessing Adigwe, ha ji ụmụ atọ.











