'Akwa m na-eyi eme ejije ka D Law tọrọ m atọ, ọ karịala afọ 30' - Layiwasabi

Aha onyonyo, 'Akwa m na-eyi eme ejije akarịala afọ 30' - Layiwasabi
'Akwa m na-eyi eme ejije ka D Law tọrọ m atọ, ọ karịala afọ 30' - Layiwasabi
Layiwasabi
    • Onye dere ya, Chimezie UcheAgbo na Amaka Bassey
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist na Video Journalist

Nwamadị na-eme ejije ịkpaọchị na Naịjirịa bụ Isaac Olayiwola a ma dịka Layiwasabi na BBC nọrọ ala ka ọ kọwaara anyị etu o siri malite ime ejije ịkpaọchị.

Olayiwola kọwara na ‘wasabi’ bụ ihe eji esi nri nke na-eme ka ọ tọọ ụtọ.

Ọ sịrị na ebumnoobi ya bụ imepụta ‘skit’ ndị ga-adị ụtọ bụkwanụ nke ọ ga na-ewepụtara ọhanaeze ọkụ ọkụ.

Dịka o siri kwuo, uwe na akpụkpọụkwụ o ji egosipụta agwa ‘The Law’ bụ nke nna ya ochie.

Layiwasabi kọwara na o teela ya malitere ime ejije ma na-etinye anya na ya mana nne ya chọrọ ka ọ gụọ iwu na mahadum nke o mechara gụọ.

N'okwu ya "nne m chọrọ ka m gụọ iwu, agụkwaranụ m ya ma ahụkwala ma ihe mere o jiri chọọ ka m gụọ ya."

"Ọ na-enyekwara m aka ugbua n'ejije ndị m na-ewepụta".

O kwuru na agwa nke kachasị amasị ya ime n'agwa niile ọ na-eme bụ nke a kpọrọ 'D Law' bụ ebe ọ na-eme ka onye ọkaiwu na-anọchite ndị mmadụ.

"Enwere me agwa atọ ma na-emekarịchazi ugbua, e nwere 'Officer Robert' bụ nke na-eme ka onye uweojii, e nwere nke 'GNCC Mr Richards' nakwa nke bụ 'D Law' bụ nke kacha ewu ewu".

Ọ sịrị na ihe kpaliri mmụọ ya ịmalite ‘skit’ bụ ndị ọkaiwu ha na ya mekọrọ ihe n’oge ọ na-anara ọzụzụ na Mịnịstrị ikpe nkwụmọọtọ Oyo steeti dị n’Ibadan ọkachasị ndị nke na-amaghị nke ha riri.

O kwuru na ọ na-ewe ya ọtụtụ oge na echiche imepụta ụfọdụ ihe ndị ọ na-emepụta n'ejije ya mana ụfọdụ na-abịara ya kwam kwam.