Ihe ndị ị ga-eme naịra nwereike itinye gị na nga

Aha onyonyo, Ihe iwu kwuru gbasara mmebi akwụkwọ ego naịra
Ihe ndị ị ga-eme naịra nwereike itinye gị na nga
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka mmetọ akwụkwọ ego Naịra
Nkọwa foto, Ihe ndị i kwesịrị ịma maka mmetọ akwụkwọ ego Naịra
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Okechukwu Omeire
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist and Video Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Na nso nso a ka a mara ụfọdụ ndị ntorobịa Naịjirịa ikpe maka imetọ akwụkwọ ego Naịjirịa bụ naịra.

Nke a bụkwa dịka ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission, EFCC n'ịchafụ na-agakwa n’ihu kpụpụ ọtụtụ ndị ọzọ ụlọikpe maka ịmetọ akwụkwọ naịra.

Ihe onyonyoo a bụ iji kọwaara ụmụafọ Naịjirịa mkpa ọ dị idebe akwụkwọ ego naịra ọcha oge niile, ụzọ dị icheiche a pụrụ isi metọọ akwụkwọ ego naịra nakwa ntaramaahụhụ dịịrị onye ọbụla metọrọ akwụkwọ ego naịra dịka ọ dị n’iwu Naịjirịa.