Kaduna Airstrikes: A ga-ekpe ndịagha abụọ ikpe maka igbu ihe karịrị mmadụ nkịtị 85

Ebe foto si, AFP/GETTY
Isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa ekwuola na a ga-ekpe ndị ndịagha abụọ ikpe maka ogbuniigwe ha sitere n’elu tụọ na Kaduna steeti ma gbuo ọtụtụ mmadụ nkịtị n’afọ gara aga.
O kwuru na ndịagha ahụ ga-agabiga “ikpe ndịagha bụ ‘court martial’ maka omume niile ha maara ama mee na ndị nke ha amaghị ama mee” bụ nke gburu opekatampe mmadụ nkịtị 85.
Ogbuniigwe ahụ a tụrụ n’abalị 3 Disemba 2023 bụ nke mere n’oge emume ndị okpukperechi Alakụba.
Kaduna Airstrikes: Peter Obi agaala leta ndị merụrụ ahụ n'ogbunigwe gbara na Kaduna

Ebe foto si, Peter Obi
Onye fere ọkọlọtọ otu 'Labour Party' na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2023 bụ Peter Obi etiela ndị mmadụ nwụlarịrị n'ogbunigwe ndịagha tụrụ obodo Tundun Biri na Kaduna steeti.
Obi kwuru nke a ụbọchị Tuzde ọ gara ụlọọgwụ 'Barau Dikko Teaching Hospital' Kaduna ileta ndị merụrụ ahụ n'ọdachi ogbuigwe mere na steeti ahụ ụbọchị Tuzde.
Ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ, ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka ụgbọelu Ndịagha Naijiria turu ogbunigwe n'ebe ndị ụka Alakụba gbakọrọ eme mmemme na Tudun Buri dị n'Okpuru ọchịchị Igabi dị na Kaduna Steeti,
Obi, onye kpere ha ekpere mgbake nyere onyinye ego dị nde naira ise iji nyere ha aka.

Ebe foto si, NIgeria Defence
Isiụlọọrụ ndịagha Naịjirịa ekwuola na ọ bụ mmadụ 81 nwụrụ n’ogbunigwe ahụ ụgbọelu ndịagha ha tụrụ n’isi ndị nkịtị n’obodo Tundun Biri nke okpuruọchịchị Igabi, Kaduna Steeti.
Onye direktọ mgbasaozi ha bụ Ọchịagha Edward Buba kwuru na mmadụ 70 merụrụ ahụ site n’ogbunigwe ahụ.
Na mbụ ndị ọrụ gbata gbata kwuru na ọ bụ mmadụ 85 nwụrụ na nwakpo ahụ, ebe ụfọdụ na-ekwu na ọnụogụgụ ndị nwụrụ karịrị ihe a na-akpọpụta.
Isiụlọọrụ ndịagha kwukwara na site ugbua gawa n’ihu na ha ga-eme nyocha nke ọma tupu ha mara ebe ha ga-atụ ogbunigwe ọzọ.
“Anyị ga-aga n’ihu n’ịrụ ọrụ dịịrị anyị site n’usoro iwu anyị si dị dịka anyị na-emebu na mbụ,”
“Maka ihe mere na Kaduna, ndịagha amụrụla akọ ha ga-eji na-arụ ọrụ. Anyị ga-agba mbọ hụụ na ọ gaghị eme ọzọ n’ọdịnihu.”
Ọchịagha Buba gakwara n’ihu zaa ebubo nke otu si mpaghara ugwu boro ha nke kwuru na ha mere mwakpo ahụ iji belata ọnụọgụgụ ndị bi na mpaghara ugwu ma sị, “Ọtụtụ mmadụ si agbụrụ dị iche iche na Naịjirịa mejupụtara ndịagha. Dịka otu a si kwuo ọdachi a bụ mmehie.”
Ohaneze Ndigbo esorola katọọ ogbugbu ndị mmadụ n'ebe ahụ

Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu
Otu Ohaneze ndigbo akatọọla itụ ogbunigwe gburu mmadụ iri asatọ na ise bụ nke ndị agha Naịjirịa mere n'obodo Tudun Biri dị na Kaduna steeti.
Onyeisi otu ahụ bụ Emmanuel Iwuanyanwu kwuru n’ihe mere bụ ihe mgbawaobi n'ozi o wepụtara nke ọdeakwụkwọ mgbasaozi otu ahụ bụ Alex Ogbonnia binyere aka.
O ji ohere ahụ gwa onyeisiala Tinubu ya hụ na emere nyocha zuruoke banyere ya bụ ihe mere ma taa ndị aka ha dị na ya bụ ihe ahụhụ.
Iwuanyanwu soro nzọmụkwụ ndị isi ahụrụ kwaba okpu n'ịkpọ oku ka enye ezinaụlọ ndị nwụrụ nakwa ndị ihe a metụtara ego itiakan'obi.
Amnesty akatọọla ndị agha Naịjirịa
Ndị otu na-ahụ maka ikike diiri onye na mbaụwa a kpọrọ Amnesty International akatọọla ogbunigwe dara ma gbuo ndị mmadụ ọnụọgugu ha karịrị 85 na Kaduna steeti.
Ihe mkpamkpa ahụ mere n'obodo Tudun Biri n'okpuru ochịchị Igabi na Kaduna steeti. Ndị Amnesty kwuru na ọ dị ntị njọ ma buru ịhe adịghị mma ịnabata.
Ha kwuru na nke a na egosi etu ndi agha si na-ememila ndị nkịtị. Ha bokwara ndị agha Naịjirịa ebubo na ha na-achọ ikpuchi ma mee ka ndị mmadụ ghara ịma arụ ha kpara. Ha jikwa ohere ahụ nwere rịọọ ka e wetara ndị e gburu ikpe ziri ezi.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ha sịrị na ndị agha Naịjirịa na-ekwu okwu na-agbogwoju anya ihe mere ha jịiri tụọ ogbunigwe n'obodo ahụ ma kwuo na ndị agha na-eme etu o siri masị ha maka na ha adaghị anata ntaram ahuhu n'aka ndị ọchịchị.
Onyeisi Amnesty International, Isa Sanusi kwuru na e nweghi ike ikpuchi ogbugbu a e gburu ndị nkịtị ma gwa onyeisiala Naịjirịa, Bola Tinubu ka o guzọbe ndị ga-eme nyocha banyere ya bu ogbunigwe a tụrụ na Tudun Biri, ma mee ka ndị niile aka ha di na ya nweta ntaram ahuhu zuru oke.
Ha rịọkwara ka gọomentị mee ka ndị e gburu na ezịnaụlọ ha nweta ikpe ziri ezi; ma rịọ ka ndịagha kwụsị ime ihe ga na-ala ndu nmadu n'ịyị.
Cheta na n'ọnwa Disemba afọ 2022, ndịagha gburu mmadụ 64 n'obodo Mutunji dị na Zamfara steeti. N'abalị 24 ọnwa Jenuwarị afọ 2023, ndịagha gbukwara mmadu 40 bụ ndị na achị ehi n'obodo Doma nke dị na Nasarawa. Ọzọkwa n'ọnwa Jenuwarị afọ 2023, ọtụtụ ndị nche ogbe ka ndịagha gburu na Galadima dị na Koo nke Naịja steeti. Otu aka ahụ n'afọ 2017, ndi agha turu ogbunigwe ma gbuo mmadu 115 n'obodo Rann.
United Nations, Muric na ndị ọzọ ekwuola ka e nyochaa ihe mere ebe ahụ

Ebe foto si, Samuel Aruwan
Site n’ogbunigwe ndịagha Naịjirịa tụrụ n’oboeo Tudun Biri dị na Kaduna Steeti n’ụbọchị Sọnde nke gburu ihe ruru mmadụ 85, United Nations ekwuola ka e mee nyocha etu ihe a siri mee.
Ngalaba otu a na-ahụ maka ikike dịịrị onye gwara ndịagha ka ha lebagharịa anya n’usoro ha jiri ebuso ndị ekperima na ndị ọzọ agha.
Ọnụ na-ekwuru ngalaba a bụ Seif Magango nọọrọ n’ụbọchị Wenezde gbarụọ ihu maka mwakpo a ma sị na nke a bụ otu n’ime ọtụtụ ugboro ndịagha na-awakpo ma gbuo ndị nkịtị kamgbe afọ 2017.
“Dịka ndịagha ekwuola na ọ bụ ihe mberede butere ọnwụ ndị nkịtị a, anyị na-akpọku ha ka ha jiri nwaayo n’etu ha siri atụ ogbunigwe n’oge ọzọ maka ịla ndụ ndị nkịtị n’iyi.
“Ha kwesịrị ilebagharị anya n’usoro ha jiri ebu agha iji hụụ na ụdịrị ihe a agaghị eme ọzọ.”
N’otu aka ahụ otu na-agba mbọ maka ikike dịịrị ndị na-ekpe ụka Alakụba a kpọrọ Muslim Rights Concern (Muric) akpọọla oku ka gọọmentị etiti nyọchaa ogbugbu e gburu ọtụtụ ndị obodo a.
N’ozi onyeisi ha bụ Ishaq Akintola wepụtara, o kwuru na ọ bụ “a kpọghị ihe mkpa nakwa e gosighi uchu n’ọrụ” butere ọdachi ahụ mere n’ụbọchị ụka.
ihe karịrị mmadụ 85 nwụrụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka ụgbọelu ndịagha Naịjirịa tụrụ ogbunigwe n'ebe ndị ụka Alakụba gbakọrọ eme mmemme Malud n’obodo Tudun Buri dị n'Okpuru ọchịchị Igabi dị na Kaduna Steeti.
Onyeisiala Bola Tinubu etiela ezinaụlọ ndị nwụrụ aka n'obi

Ebe foto si, Asiwaju Bola Ahmed Tinubu/Facebook
Onyeisiala Bola Tinubu agụgụọla ezinaụlọ ndi ihe mberede ogbunigwe metụtara n’obodo Tundun Biri dị n’okpụrụọchịchị Igabi Kaduna steeti.
Tinubu gwara ndi Kaduna, gọọmentị Kaduna nakwa ezinaụlọ ndị ihe metụtara ha jide obi ha aka, na ihe mere bụ ihe mgbawaobi, ọnụma nakwa ihe mberede.
Ọ nyere ịwu ka amalite nyocha pụrụịche i ji mata ihe kpatara ya bụ mberede ọgbunigwe, ọ gwara ndi Kaduna ha nọrọ jim dịka ndị jị ịkịkere ga amalite ị yọcha ya bụ ihe.
Onyeisiala Bola Tinubu mara ịwu ka a bido ọgwụgwọ ndị lafeere ihe mberede a, ọ kpereekpere ka Chukwu nabata mkpụrụobi ndi nwụru n’udo.
Cheta na ihe mberede Ogbụnigwe gbụru ọtụtụ mmadu n’Kaduna mgbe ha jere emụme ekperechị alaakụba ubọchị ụka.

Ndị nọ ebe ihe mere akọọwal a ihe ha hụrụ dịka ogbuigwe ndịagha tụrụ gburu ihe karịrị mmadụ 85 na Kaduna n'Ụbọchịụka.
Otu nwoke a kpọrọ Idris gwara BBC Hausa na ya bụ ọdachi tara isi ndị ezinaụlọ ya mmadụ 34.
Ọ sịrị, " Anyị na-eme emume ncheta Maulud o pekata mpe ugboro 15 n'afọ."
"Ụgbọelu ahụ tụrụ ogbunigwe mbụ n'ebe a na-eme emume, gbụọ ọtụtụ ndị mmadụ gunyere ụmụnwaanyị na ụmụaka."
"Ụfọdụ nha nọzị na mpekere na mpekere."
"Mmadụ 34 furu ndị ezinaụlọ m, ebe mmadụ 66 merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ Barau Dikko Hospital.".

Ebe foto si, Getty Images
Otu onye ọzọ nọ ebe ihe mere a kpọrọ Hajya Aisha kwuru na o mere n'ihu ya.
"Ha tụrụ ogbuigwe abụọ n'ime nkeji 30. Ogbunigwe nke abụọ ha tụrụ metụtara ndị na-ebugha ozu ndị ogbunigwe nke mbụ gburu."
"E bughara ozu ndị nwụrụ n'ihu m. Ụfọdụ ha dị n'ibe n'ibe, e tinye ha n'akpa ajị."
"Ụfọdụ akụkụ ahụ ha koro n'elu osisi, ụfọdụ n'elu ụlọ."
"E mechara tinye ha n'ụgbọala ngwongworo buuru ha."
"O nweghị onye ọrụ nchekwa nọ ebe ahụ karịa ndị ọrụ nche KADVIS."
Ihe ndịagha Naijiria kwuru

Ebe foto si, Defence Heaquarters
Onyeisi ndịagha Naijiria bụ Lt-Gen bụ Taoreed Lagbaja rịọrọ ndị obodo Tundun Biri dị na Kaduna steeti mgbaghara maka ịtụ ha ogbunigwe n’amaghị ama ụbọchịụka.
Lagbaja kwuru nke a oge ọ gara mgbarụ n’obodo ahụ ụbọchị Tuze.

Ebe foto si, AFP
“O kwuru na ndịgha na-efegharị were hụ ọgbakọ ndị mmadụ nke ha ghọtahịere dịka o yiri agwa ndị ekperima(bandits).”
Isi ụlọọrụ ndịagha Naijiria kwuburu na ọdachi ahụ mere dịka ha nwetara ozi na ndị oyinduegwu nọ ebe ahụ nke mere ka ha tụọ ya bụ ogbunigwe.

Ebe foto si, AFP
Ụlọọrụ gbatagbata Kaduna bụ 'Kaduna State Emergency Management Agency' ekwuola na o pekata mpe mmadụ 85 nwụrụ na mwakpoo mere na steeti ahụ na nsonso a.
Ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ, ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka ụgbọelu Ndịagha Naijiria turu ogbunigwe n'ebe ndị ụka Alakụba gbakọrọ eme mmemme na Tudun Buri dị n'Okpuru ọchịchị Igabi dị na Kaduna Steeti,Ụbọchịụka.
Ka ọ dị ụgbụa , ụfọdụ ezinaụlọ o metụtara amalitela akwamozu ndị nke ha nwụrụ.
N'ụbọchị Monde, Ụlọomeiwu-Ukwu nyere ntuziaka ka e nyocha ihe mere ndịagha ji wakpoo obodo ahụ ebe ha na-eme emume Malud.









