COP28: Gịnị mere okwu ọnụọgụgụ ndị nọchite anya Naijiria n'ọgbakọ mgbanwe ihu igwe ji akpọtụ?

Tinubu na ndị ọzọ na-anọchite anya Naijiria na ọgbakọ COP28

Ebe foto si, AFP

Ọtụtụ ụmụafọ Naijiria akataọọla oke ọnụọgụgụ Naijiria zigara n'ọgbakọ mgbanwe ihu igwe a kpọrọ COP28 Climate Change Summit' nke na-aga n'ihu ugbbua na Dubai.

Naijiria na mba Chaina gbara nhatanha n'ọnụọgụgụ ndị nnọchite anya ha dịka ha zigara mmadụ 1411, mmadụ 14311 ọgbakọ ahụ.

Ụmụ Naijiria na-akatọ nke a sị, n'ogosiri na gọọmentị Onyeisiala Bola Tinubu ejghị afụfụ ụmụamala Naijiria na-atọ dịka o wepụrụ ego mkwụbilata ego mmanụ ụgbọala. ụgbọala.

Ihe Peter Obi, PDP bụ ndi otu ndọrọndọrọ ọchịchị anọghị n'ọchịchị kwuru

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi/Facebook

Ndi otu ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) na ogbo ha bu Labour Party (LP) katọrọ etu Naijiria siri ziga madu 1411

Naijiria na China bu ndi nke atọ na uwa nịle maka onu-ogugụ mmadu ha zịgara na COP28 nke mere ndi mmadu jiri na akatọ ndị Ochịchị Nijeriya.

Onye zọburu ọchịchị onyeisiala Naijiria n'afọ 2023 bụ Peter obi na ndi Labour party kowara iziga igwe mmadu na COP28 dika imefu ego.

Peter Obi kwuru na ọdịnma na Nigeria na Chaina na ama-aka n´ ihe gbasara nka na uzu, mmeputa ihe nakwa odinma ndị mmadu.

Obi sịrị na Bojet Nigeria na afọ 2024 bụ $33 Billion, ebe China bu $4 Trillion nwere sị na China ka Nigeria emepe odoha ma na eme ka ọtutu mmadu puta na ubiam ebe imerime ndị Nigeria nọ na ọke agụụ.

“O kwesịrị ka anyị na-etịnye ego na ịhe ka mkpa na ịhe ge emetute ọganịrụ Nigeria. Ndịa ana eziga bu na ego Nigeria ka esị eziga ha, ebe ọtụtu nmadu ”

“Ọnụego ọnụ ahịa nrịanrịa eruola 27.3 na Ọktoba 2023, nke kachasị elu kemgbe Ọgọst 2005. Ọtụtụ ezinụlọ anaghịzi enweta nri ụfọdụ. Ndị nwe ụgbọ ala akwụsịla ịnya ụgbọ ala nke aka ha na-arụ ọrụ n'ihi nnukwu ego mmanụ ụgbọala.

Nye anyị aha ndị so gaa njem ahụ na ego e mefuru na ịziga ha-PDP

Njirimara PDP

Ebe foto si, PDP/X

N' aka nke ọzọ ndi otu ochịchị Peoples Democratic Party (PDP) gwara ndị ọchịchị Nigeria ka ha weputa aha ndị nịle ha zigara COP28 Climate Change Summit ma ego ọle aga emefu na ịsị ha.

Ozi PDP wepụtara kwuru sị: “Government etiti na emefu egọ na agbanyihi na agụrụ dị na ọbodo.”

Lee ihe a ga-enye ndi ga-eso gaa njem 'COP28' kwa ubọchị dika ngalaba 'Revenue Mobilization Allocation and Fiscal Commision , RMAFC, si kwụọ

Ngụkọ BBC mere site n'ozi si na ngalaba 'Revenue Mobilization Allocation and Fiscal Commision( RMAFC) gosiri na ndi minista ga-enweta nde naira iri(N10million) nke bu egọ zuru ikwụ ọnye ọrụ Bekee nọ n'ogoogo asatọ(Level *) ụgwọọnwa afọ ise.

Ego nrite ndị gara COP28

Ebe foto si, RMAFC

Etu Ndi Obodo Di Iche Iche Si Ziga Ndi Mmadu Na COP28 Climate Change Summit

United Arab Emirate 4,409

Brazil 3,081

Naijiria 1,411

Chaina 1,411

Ihe ndị Govementi Etịtị sara

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mana gọọmentị Naijiria ekwuola na o bụghị eziokwu na ọ bụ mmefu egọ bu mmadu ọle ezịgara na COP28.

Ọtu onye na ndị na-ekwuru goọmenti Naijiria bụ, Temitope Ajaji onye kwuru na ọtụtụ ndị ọrụ goọmenti Etiti, nke steeti, ndi ojiegoachụego, ndị na-ahụ maka gburugburu na ndị ntaakụkọ so na mmadu 1411 ezigara na COP28, kwuru sị,“Ọ bughị egwuregwu ka ndị Naijiria zigara COP28 gara igwu dịka ufọdu sịrị na akọ.

"Nigeria bu nnukwu obodo na Afica ma buru obodo kacha nwee ego na mba Africa; o bughị ajọ ịhe ma Naijiria ziga ịgwe mmadu karia ndị Afrika ndị ọzọ.”

Ọnụahịa ihe na-ada n'ahịa gbaliri rue pasent 27.3 n'ọnwa Oktoba, afọ2023, nke bụ mgbali kachasị dị elu kemgbe afọ 2005.

Ọtụtụ ezinaụlọ anaghị erinwukwa iri, ebe ụfọdụ ndị nwere ụgbọla kwụsịrị ịgba ụgbọala ha gaa ọrụ n'ihi oke ọnụ mmanụụgbọala dịka gọọmentị wepụrụ ego mkwụbilata ego mmanụ ụgbọala nke Bekee kpọrọ Subsidy.

Ndị mmadụ na-ekwu na gọọmentị egosighị itinye uchu n'ịbalata etu ha si emefu ego n'ihe adịghị mkpa.

Ha ji akara 'hashtags' gụnyere Dubai n'ekwu obi ha n' okwu metụtara ọnụọgụgụ ndị mere njeem ahụ n'aha Naijiria nke mere ka ọ na-ewu n'ọbaozi X a na-akpọbu Twitter kemgbe Ụbọchịụka.