Israel-Gaza: Ndịagha Israel agwala ndị nkịtị ka ha pụọ na Khan Younis
Israel-Gaza: Ndịagha Israel agwala ndị nkịtị ka ha pụọ na Khan Younis

Ebe foto si, Getty Images
Ndịagha Izrel na-aga n'ihu n'agha ha na Ndịda Gaza - ebe ha enyela ndị mmadụ iwu ka ha pụọ na etiti obodo Khan Younis.
Ebe a bu ebe ọtụtụ narị puku ndị Gazan gbapụrụ na mbụ iji chọta ebe mgbaba site na mwakpo na ogbunigwe ndị Izrel na-atu n'Ugwu obodo ahụ.
Ka ihe sị dị ugbua, onyeisi ndị agha Izrel agwala ndị agha ha ka ha jisie ike na agha ma meri e ndị iro ha bu Hamas.
Mgbe Hamas gosichara ihe onyoyo ha kwuru na ọ bu mgbe ndị Izrel dara mba na ọrụ nnaputa ndị be ha eji eji, Ndị Israel na ubọchị Satọde kwuputara na ọtu onye ndị hamas ji eji bu, Sahar Baruch, dị afọ 25 ọ nwụọla.
Ndị UN dọrọ aka ná ntị na ndị Gazan no na-ọke agụụ. Na imerime ndị mmadu ruru pecenti 90 na mpaghara Palestine enweghị ike iri nri kwa ụbọchị, n'ihi agha Hamas na Israel.
Onye akaebe kwuru na abalị ọbụla dịka "egwu na egwu" n'ime etịtị ọbodọ Khan Younis ka ha na anu ụda ogbunigwe nakwa ọgu mgbe niile.
Ndị Hamas na-ekwu na ọgụ erugọ n'okporo ụzọ Rafah dị na ndịda Gaza ebe ọtụtụ narị puku ndị Palestine na-agbapụ; ebe onye isi ndị agha Israel, General Herzi Halevi, kwuru na e nwere ihe ịrịba ama na ndi Hamas na-ada ma na ama jịjị kengbe ọnwa abuọ ebịdọro ya bu ọgu ma na-agbakwụnye na Israel kwesịrị ijịsị ike kwuru chịchị.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ụlọọgwụ Nasser dị na mpaghara Khan Younis nke obodo Gaza bụ Nahed Abu Taima ekwuola ha amaghizi ọnụọgụgụ ndị nwuru anwụ na ndị merụrụ ahụ kamgbe Isreal malitere ịkwa mgbọ ọzọ na Gaza.
Taima gwara onye ntaakụkọ BBC nke a site n'ozi o ziteere ya banyere ihe ha na-agabiga na mpaghara ahụ.
N'okwu ya “isi ejula anyị n’ihi ọnụọgụgụ mmadụ ndị nwetara ihe mmerụahụ a na-ebubatara anyị n’ụlọọgwụ.
A na-ebute ọtụtụ ndị e merụrụ ahụ na ndị e gburu n’ihi okpukperechi ha na ngalaba na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata.
"Dịka Israel na-aga n’ihu na-atụ ogbuniigwe n’ọtụtụ mpaghara Khan Younis, anyị na-anọ na mmanye ịlekọta ndị merụrụ ahụ nọ n’ala nakwa ndị nke nọ n’ụzọ mbata ngalaba anyị dịka anyị na-agabiga ụkọ ngwa ndị e ji elekọta ahụike.”
Chat na mba Isreal na Hamas malitere ọgụ ha ọzọ na mpaghara ugwu Gaza dịka otu izuụka ha kwụsịtụrụ ọgụ ahụ gachara.
Anyị na-atụzi ogbunigwe n'ogige ebe Hamas gbara mgbọrọgwụ na Jabalia - Isreal

Ebe foto si, Reuters
Israel kwuru na Hamas nwere nnukwu ogige dị n'ime ebe ndị gbara ọsọ ndụ nke dị na Jabalia na mpaghara ugwu Gaza.
Ndị ụlọ mgbasaozi na Israel sị na ndịagha Israel akpachie nnukwu ogige ebe ndị Hamas na-anọ na mpaghara ahụ, wee chọta ọwara nakwa ngwa ọgụ ha.
Akụkọ UN sitere na ụnyaahụ gosiri na “ihe karịrị mmadụ 100 nwụrụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ, na nnukwu ogbunigwe a turu n'ụlọ obibi na ogige dị Jabalia.
N'ụbọchị nke 5 n'ọnwa Disemba afọ a, ọnụ na-ekwuchitere IDF bu Daniel Hagari kwuru na ndịagha Israel na-alụ ọgụ “n’ime obi Jabalia na mpaghara Shejaiya”.
O kwuru na ha wakporo mpaghara ebe ahụ ma n'elu ala, nakwa n'ikuku, ma n'okpuru ala, wee gbuọ ọtụtụ ndị na-eyị ha egwu n'agha ihu na ihu, ma chọputa ebe ngwa agha dọrọ.
Israel sị ndị mmadu puọ n' obodo Khan Younis

Ebe foto si, Reuters
Mba Izrel agwagọ ndi mmadu ka ha puo na ọdodo Khan Younis maka na ha bu na obọ na ndị isi Hamas zoro na ebe ahu.
Dika ozị onye ntaakukọ BBC Middle East bụ Yollande Knell wetara si kwuo,, ndị gha Izrel sị na ha na-ebuso ndị Hamas agha na mpaghara nịle dị na 'Gaza Strip'.
ụlọntaakụkọ 'Public Kan Radio' kwuru na ndi Izrel na-atu ogbunịgwe aghara-aghara na mpaghara Khan Younis ebe ha bu n’ obi na ndisi Hamas bu Yahya Sinwar na Mohammed Deif na ndị ọzọ zoro.
Ndi mmadu bi na Khan Younis kwuru na agwala ha ka ha puọ na mpaghara ahu, ma sịkwa na ọgbunigwe ha hụrụ n' ogbe ha kachasị kpụrụ ọkụ n'ọnụ kemgbe ogụ Israel na Hamas malite
Ogbunigwe Israel na-atụzị kpụ ọkụ n'ọnụ-Ndị bi na Khan Younis

Ebe foto si, Getty Images
Ịzrel agbaala ogbunigwe site n'elu n'ụdị kachasị chaa ọkụ kemgbe agha ha na Gaza malitere, dịka ndị bi na Khan Younis dị na Ndịda Anyanwụ Gaza si kwuo.
A gwaala ndị bi na mpaghara Ọwụẁa Anyanwụ obodo ahụ ka ha pụọ gawa na Ndịda.
Izrel kwenyere na ndị isi Hamas nọ n'ebe ahụ ndị nkịtị si Ugwu Gaza gbaa ọsọ ndụ gbagara.
Ministrị ahụike Gaza nke Hamas na-achịkọta kwuru na o pekata mpe mmadụ 193 anwụọla n'agha ọhụrụ Israel malitere ibu.
N'ụbọchị Faride, ndịagha Izrel a kpọrọ,'Israel Defense Forces' (IDF) malitere ọgụ megide Hamas na Gaza iji saa mwakpo Hamas wakporo Izrel n'abalị asaa nke ọnwa Oktoba nke tara isi ihe ruru mmadụ 1,200.
Ministrị ahụike nke Hamas na-achịkọta kwuru na ndị e gburu na Gaza akarịala mmadụ 15,200.

Ebe foto si, AFP
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Agha ọzọ Izrel ga-ebu ga-elekwasa anya na mpaghara ndịda Gaza, bụ ebe puku kwuru puku ụmụafọ Palestine gara zoo onwe ha dịka ha richara mbọmbọ na mpaghara ugwu.
Ndị bi na Khan Younis na-ekwu na ọ bụ n’anyasị ka obodo ahụ hụtara oke ịkwa mgbọ kasị njọ kamgbe agha ahụ malitere.
Ha kwuru na mgbọ na ogbunigwe na-ada n'isi ha ugbua karịrị nke dara na mbu tupu a kwụsịtụ ọgbụ n'otu izuụka gara aga.
Ndịagha mba Izrel enyela mmadụ ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ iwu ka ha kwagaa na Rafa nke nọpụrụ anya na mpaghara ndịda.
E nwere ike isite n’ala buo agha. Na-agbanyeghị mmaliteghachị ibu agha, ndị ọrụ mba Amerịka kwuru na ha ka nwere olileanya na a pụrụ inwe nkwekọrịta iji kwụsịtụ ịkwa mgbọ ma hụkwa na a tọhapụrụ ndị ọzọ e ji eji na Gaza bụ ndị a tọọrọ n’abalị 7 nke ọnwa Oktoba.
Mana Izrel a maala ọkwa na ya ga-akpọghachị ndị nkwuchiteọnụ ya na Qatar n’isochi “mkparịtaụka fanyere n’ogwu.”
Nkwekọrịta nke mbụ Izrel na Hamas nwere bụ nke gụnyere ndị nwaanyị na ụmụaka ma bụrụkwa nke hụrụ na a tọhapụrụ ụmụafọ Palestine atọ n’ụlọmkpọrọ mba Izrel maka otu nwafọ Izrel ọ bụla lọtara ụlọ.

Ebe foto si, AFP
Ugbua, ọtụtụ n’ime mmadụ 140 eji eji bụ ụmụnwoke na ndị agha, dịka e kwuru na Hamas guzogidere ntọhapụ ha n’otu ọnọdụ ahụ.
Taa, ụgbọala trọọk ndị bu ngwa enyemaka bụ ndị e kweere ka ha site na Ijipt banye na Gaza ọzọ dịka ọ gasịrị otu ụbọchị a na-ebubaghị ihe ọ bụla n’okeala mba ahụ.
Mana ụlọọrụ ndị na-ahụ maka ngwa enyemaaka na-ekwu na ọrụ obi ebere ka bụkwa nke a chọsiri ike. Ụmụ mmadụ na-agba lịkalịka ịhụ na ha nyara ndụ dịka a na-ahụta ụkọ ngwa ndị dị oke mkpa dịka ihe oriri na mmiri, tinyekwara na ụlọọgwụ ndị jupụtara n’igwe mmadụ ji akụrụngwa na-ezughị oke arụ ọrụ.

Ebe foto si, AFP
Ọgụ amalite ọzọ n’etiti Israel na Hamas n’ime otu izuụka a kwụsịtụrụ ya

Ebe foto si, Getty Images
Ọgụ amalitela ọzọ na Gaza n’etiti Isreal na Hamas dịka otu izuụka ha nwere nkwekọrịta ịkwụsịtụ ọgụ a gachara na etighi oge ọzọ.
A nụrụ ọtụtụ ụda egbe ma hụụ ogbunigwe ka ọ na-efe aghara aghara na mpaghara Ndịda obodo Gaza.
Ndịagha Isreal na-ebo Hamas ebubo maka ịda iwu na-achị nkwekọrịta ha nwere sị na ha jụrụ ịtọhapụ ụmụnwaanyị na ụmụaka niile ha ji eji. Ha kwuru na Hamas tụrụ ogbunigwe n’Isreal tupu oge ha nyere maka ịkwụsịtụ ọgụ agwụ.
N’aka nke ọzọ, Hamas boro Isreal ebubo ịda iwu ahụ ma sị na ha jụrụ ka mmanụ ụgbọala rute na mpaghara Ugwu Gaza.
Ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla

Ebe foto si, Getty Images
Ministri ahụike mba Gaza nke Hamas na-elekọta ekwuola na ihe karịrị mmadụ 30 anwụọla site n’ogbunigwe kamgbe agha a malitere ọzọ.
A wepụtala akwụkwọ ozi na-adọ ndị mmadụ nọ na Gaza aka na ntị ka ha na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Gaza bụ Khan Younis dị nso n’Egypt.
Ndịagha Isreal bụ Isreali Defence Force (IDF) ekewaala Gaza ọtụtụ ụzọ nke ha kwuru ha ga-eji kpọpụta ndị nkịtị nọ n’ebe ahụ.
Nkata ịkwụ ọgụ a ka na-aga n’ihu

Ebe foto si, Getty Images
Mba Qatar ekwuola na mkparịtaụka iji kwụsị ọgụ ahụ ka na-aga n’ihu.
Odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Antony Blinken gwara mba Isreal ka ha gbaa mbọ chekwaa ndị nkịtị n’oge maka na ọtụtụ n’ime ha nwụrụ n’oge gara aga.
Onyeisi United Nations bụ Antonio Guterres akatọọla ọgụ a malitere ọzọ ma sị na o nwere olileanya na ọgụ a ga-akwụsị.
Ngalaba otu a na-ahụ maka ụmụaka ekwuola na ọ bụrụ na ọgụ a kwụsịghị na ọtụtụ ndụ ndị mmadụ ga-ala n’iyi.












