Israel-Gaza War: Ndị kịtịkpa, ọtọrọ na ọrịa ndị ọzọ ga-egbu ga-akarị ndị agha riri -WHO

Ebe foto si, Reuters/AFP
Onyeisi otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation(WHO) bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus ekwuola na ndị ọrịa ga-egbu ga-akarị ndị agha riri n'ọgụ na-ada n'etiti mba Izrel na otu agha nnupuisi,Hamas.
N'ozi ya n'ụtụtụ taa(29/11/2023, Ghebreyesus kwuru sị,: "E lee anya n'ọnọdụ ndị mmadụ nakwa enweghị ohere ịnata nleta ahụike, ndị ga-anwụ site n'ọrịa ga-akarị ndị ogbunigwe tugburu."
BBC wetaburu ozi na ọnọdụ ndị mmadụ ruru otu nde na ụma asaa bụ ndị si Gaza gbaapụ ọsọ ndụ nwere nsogbu ọtụtụ mmadụ ịnọkọ ọnụ, ụkọ nri, ọgwụ nakwa gburugburu adịghị ọcha.
Nkwụsịtụ ọgụ abalị isii e nwere nyere ohere ka ihe dịka ụgbọala ngwomgworo 200 bụbata ngwa enyemaka kwa ụbọchị na Gaza mana ndị ọrụ ebere kwuru na nke erughị ihe a chọrọ.
Lee ọnụọgụgụ ndị dara n'ọrịa e nwere n' ebe ahụ dịka onyeisi WHO si kwuo n'ozi o wepụtara:
Ọrịa ọwa e si eku ume(Acute respiratory infections): 111,000
Ịkpịkpa(scabies): 12,000
Igwu(lice): 11,000
Otoro(diarrhoea): 75,000
Krọkrọ (skin rash): 24,000
ọrịa Akpụk ahụ 'Impetigo': 2,500
Kitịkpa(chickenpox): 2,500
Ịba Ọchananya(jaundice): 1,100
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Reuters
A tọhapụla ndị eji eji 11 ọhụrụ gunyere ụmụejima gbara afọ atọ nke mere ya ndị Izrel 50 Hamas tọhapụrụla, dịka Izrel si kwuo.
E ji ndị Palestine 33 were gbanwere isi ndị Izrel 30 gụnyere ụmụaka 30 na ụmụnwaanyị atọ.
Dịka ọ fọrọ awa ole maole ka nkwekọrịta nkwụsịtụ ọgụ ịbịa na njedebe, Qatar kwuru na Izrel na Hamas kwekọrịtaraiji abalị abụọ gbatia oge ahụ.
Hamas kwere nkwa ịtọhapụ ụmụnwaanyị na ụmụaka dị 202 dịka ọnụ na-ekwuru ndị ọrụnchekwa Amerịka si kwuo.
Cheta na Hamas wakporo Izrel n’abalị asaa nke ọnwa Oktoba gbuo mmadụ 1200, ma tọọrọ mmadụ 240.
Kemgbe ahụ, Mịnịstry ahụike Gaza nke ndị Hamas na-elekọta kwuru na Izrel egbuola mmadụ 14500 iji bọkwara ndị nke ha e gburu.

Ebe foto si, Reuters
Ụbọchị Ụka, puku kwuru puku ndị mmadụ ji anụrị wujuo n'okporoụzọ dị nsọ n' ọdụ ndịagha Hatzerim dị na Ndịda Izrel ịnabata ụfọdụ ndị Izrel e ji eji tọhapụrụ na Gaza.
Ufọdụ n'ime mmadụ iri na anọ ahụ e jichiri, gụnyere ụmụaka itoolu, ka ha si n'ime obere bọs ahụ na-efere ìgwè mmadụ ahụ aka.
A na-atụ anya na ngbe na edighị anya aga-atọhapụ ndị ọzọ bụ ndị ejịejị maka nkwekọrịta mbụ dị n'etiti Israel na Hamas.

Ebe foto si, Reuters
A tọhapụla ndị Izrel ọzọ ndị Hamas jibu eji n'ụbọchị Satode ka e gbuchara oge awa ole na ole nke mere obi mmapụ jide nsị ezinaụlọ ha.
Ndịagha Izrel kwuru na a tọhapụrụ ụmụafọ ha 13. ebe ha tọhapụrụ ndị Palestine 39 na West Bank.
Hamas tọhapụkwata ndị Thailand anọ.
Ntọhapụ mbụ e mere ụbọchị Fraide nke so nkwekọrịta ịkwụsịtụ ọgụ abalị anọ nke Qatar haziri n'etiti mba abụọ ahụ gara nke ọma.
Nkata ntụmadị e nwere bụ ihe mere ka ntọhapụ nke e mere na Satode nwee isi.
A tụpuru anya na Israelis ga-enyefe otu Red Cross nọ n'agbata Gaza na Ijipt n'Elekere anọ(14:00 GMT).
Alaka ọgụ otu Hamas bụ Qassam Brigades, kwuru na e nwere nsogbu ibubata ngwa enyemaka n'ụgwu Gaza.
Ọnọdụ e kwuru a ga-eji eji ndị Hamas nwuchiri agbanwe ndị Palestine nọ na mkpọrọ.
Israel gọrọ si na ha emebighị ọnọdụ nkwekọrịta ha..
Lee ụfọdụ ndị Hamas ji eji ha tọhapụrụ na Gaza

Ebe foto si, FAMILY HANDOUT
A tọhapụrụ mmadụ iri abụọ na anọ a nwụchiri na Gaza mgbe a wakporo mba Isreal n’ụbọchị 7 Ọktoba 2023.
Ndị gụnyere ụmụafọ Isreal 13 – Ha niile bụcha ụmụnwaanyị na ụmụaka – a tọhapụrụ ha site na nkwekọrịta mba Israel na ndị Hamas nwere.
N’otu aka ahụ, a tọhapụkwara ndị Thailand mmadụ iri na otu onye Philipine.
Kedụ ndị bụ ụfọdụ ndị ahụ Hamas tọhapụrụ?

Ebe foto si, FAMILY HANDOUT
Daniele Aloni dị afọ 44 na nwa ya nwaanyị dị afọ isii Emilia ka a tọọrọ site n’obodo Nir Oz, ha na nwanne nwaanyị Daniele bụ Sharon Aloni Cunio dị afọ 34, di ya bụ David Cunio dị afọ 33 nakwa ụmụejima ha abụọ dị afọ atọ bụ Ema na Yuly.
Doron Katz Asher dị afọ 34 na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ bụ Raz, afọ anọ na Avivi dị afọ abụọ. A tọọrọ ha mgbe ha gara n’ụlọ onye nwanne ha dị n’okeala Gaza. Di Doron bụ Yoni hụrụ ihe onyonyo ebe a na-etinye nwunye ya na ụmụ ya na ndị ọzọ n’ime ụgbọala. Ozi si n’ekwentị nwunye ya gosiri na ha nọ na Gaza.

Ebe foto si, FAMILY HANDOUT
Margalit Mozes dị afọ 78 bụ onye a tọọrọ n’ụlọ ya dị na Kibbutz Nir Oz. Nwaanyị a ka si n’ọrịa kansa gbakee mana ezinaụlọ ya kwuru na o nwere ọrịa ndị ọzọ na-arịa ya nke bụ na o kwesịrị ị na-aṅụ ọgwụ.
Adina Moshe dị afọ 72 ka a tọọrọ n’obodo Nir Oz n’ụbọchị 7 Ọktoba. E gburu dị ya bụ Said Moshe na mwakpo ahụ dịka otu na-ekwuchitere ndị a e ji eji si kwuo. Ndị ezinaụlọ ya hụrụ ya mgbe ihe onyonyo gosiri ka ndị Hamas abụọ bu ya n’elu ọgbatumtum.

Ebe foto si, FAMILY HANDOUT
Ohad Munder-Zichri dị afọ itoolu, nne ya Keren Munder dị afọ 54 na nnenne ya bụ Ruthi Munder dị afọ 78 bụ ndị a tọọrọ site na Nir Oz ka ndị ọrụ Isreal kwuru. Ụlọọrụ ntaakụkọ Associated Press kwuru na nyocha akara ekwentị gosiri na ọ bụ na Gaza. Ohad nọ na Gaza gbazuo n’ụbọchị ncheta ọmụmụ ya nke afọ itoolu. A ka ji nnanna bụ Avraham Munder e ji na Gaza.

Ebe foto si, FAMILY HANDOUT
Channah Peri dị afọ 79 bụ onye a nwuchiri ya na nwa ya nwoke bụ Nadav Popplewell dị afọ 51. Nwa ya nwaanyị bụ Ayelet Svatitzky kwuru na nne na nwanne nwoke na-arịa ọrịa shụga. Channah si na mba Saụt Afrịka bịa Isreal n’afọ 1960, o nwere ụmụ atọ.

Ebe foto si, FAMILY HANDOUT
Hannah Katzir dị afọ 77 gosiri n’ihe onyonyo ndị e ji eji n’ọnwa Nọvemba. O ji oche ndị nkwarụ ji aga ije nọrọ ọdụ dịka ọ na-ekwu okwu n’ihe onyonyo ahụ. A tọọrọ ya n’obodo Nir Oz ya na nwa ya nwoke bụ Elad Katzir dị afọ 47.

Ebe foto si, FAMILY HANDOUT
Yafa Adar dị afọ 85 bụ onye a tọọrọ n’oboco Nir Oz, nwa nwa ya hụrụ ihe onyonyo mgbe e du ya na-aga na Gaza, dịka ndị ojiegbe anọ gbara ya okirikiri. O nwere ụmụ atọ, ụmụ ụmụ asatọ na ụmụ ụmụ ụmụ asaa. A tọkwaara nwa nwa ya bụ bụ Tamir dị afọ 38 ma kpọro ya gawa na Gaza.
Hamas atọhapụla ụmụafọ Isreal mmadụ 13 ha ji eji

Ebe foto si, Reuters
Ndị nchekwa mba Isreal ekwuola na anabatala ụmụafọ ha mmadụ iri na atọ Hamas tọhapụrụ na Gaza.
Nke a na-abịa dịka otu Red Cross kwuru na a tọhapụla mmadụ iri abụọ na anọ site n’ozi ha wepụtara na soshal midia ha.
“Anyị agbaala mbọ kwalite ntọhapụ ahụ site n’ibu ndị n’ụgbọala si n’okeala Rafah dị n’etiti Gaza bata Egypt, nke gosiri ọrụ anyị n’inyere ndụ aka na-enweghi onye anyị na-akwado.”
Ọnụ na-ekwuru ministri na-ahụ maka ndị ọzọ na mba Qatar kwuru na ndị a tọhapụrụ gụnyere ndị Isreal 13, ndị Thailand 10 na otu onye Philipine.
Ọ bụ mba Qatar kpere udo n’etiti Isreal na Hamas nke mere e jiri tọhapụ ndị a.
Cheta na minista mba Thailand nọ na mbụ kwuo na ndị Hamas tọhapụrụ ụmụafọ ha mmadụ 12.
A tọhapụla ụmụafọ Thailand 12 ndị Hamas ji eji na Gaza

Ebe foto si, Reuters
Praịm minista mba Thailand ekwuola na a tọhapụla ụmụafọ ha mmadụ 12 ndị Hamas ji eji na Gaza.
O kwuru na ndị ọrụ nnọchiteanya ha nọ n’ụzọ ugbua ị ga-akpọta ndị a tọhapụrụ mana o kwughi ebe ha nọ.
Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ mgbasaozi mba Egypt kwuru na “Mba Egypt na-agbasi mbọ ike ịhụ na a tọhapụrụ mmadụ 12 bụ ndị Thailand.”
O nwebeghi ihe ndị Hamas kwuru banyere nke a.
Ntọhapụ ụmụafọ Thailand esoghi na nkwekọrịta mba Isreal na ndị Hamas nwere bụ nke mba Qatar nọ n’isi ya.
A ka na-eche ntọhapụ ụmụafọ Isreal mmadụ 13.
Lee ihe Israel na Hamas kwekọrịtala maka ịkwụsịtụ ọgụ ha

Ebe foto si, Reuters
Israel na Hamas ekwekọrịtala ịtọhapụ ndị e ji eji 50 dịka há nyere ohere ịkwụsị ọgụ ha abalị anọ.
Na nkwekọrịta ahụ, a na-ele anya na Hamas ga-atọhapụ mmadụ 50.
N'aka nke ọzọ, dị Izrel ga-atọhapụ ụmụnwaanyị na ụmụaka dị 150 há ji eji ma ọbụrụ na Hamas hapụ ndị nke há dị 50.
N’agba nke abụọ nkwekọrịta ahụ, a ga e ji otu ụbọchị gbatịa nkwụsị ọgụ ahụ ma tọhapụ kwuo mmadụ 10.
Izrel ebipụtala aha ndị Palestine 300 nọ n’aka ha , ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụnwoke na-eto eto.
Ka ọ dị ugbua n’ụtụtụ Wenezde, Izrel kwuru na há ka ebu agha n’ikuku nakwa n’elu ala na Gaza. Tupu ohere nkwụsị ọgụ amalite.











