Etu nwoke dị afọ 71 si jiri mma sụgbuo nwatakịrị Palestine dị afọ isii n'Amerịka

Wadea al-Fayoume

Okwu ikpeazụ nwatakịrị ahụ dị afọ isii kwuru bụ "Nne, adị m mma", ka nwanne na nna ya kwuru dịka narị kwuru narị mmadụ gbakọrọ n'emume olili ozu ya.

Ndị uweojii kwuru na e gburu nwatakịrị a aha ya bụ Wadea al-Fayoume n'ihi na ọ bụ onye muslim. Emume olili ozu ya na-aga n'ihu dịka onye nwe ụlọ ebe nwata ahụ na nne ya bi, bụ Joseph Czuba, na-azara ọnụ ya maka ebubo igbu nwata ahụ.

Akụkọ kwuru na nwoke a dị afọ 71 na-ewe iwe maka agha na-ada n'etiti Israel na Hamas na Gaza.

Nne Wadea bụ Hanaan Shahin, onye dị afọ 32, enweghị ike ịnọ n'olili nwa ya n'ihi na ọ nọ n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ maka mmerụahụ o nwetara n'otu mwakpo ahụ.

Nwata a bụ Wadea na nne ya bụ Shahin bi n'ọnụụlọ abụọ n'ụlọ ahụ dị na mpaghara Bridgeview na Chicago. Shahin bịara mba Amerịka afọ 12 gara aga, ma nọrọ ebe ahụ mụọ Wadea.

Otu onye ezinụlọ ha kwuru na enwebughị esemokwu maọbụ nghọtahie ọbụla n'etiti ha na nwoke nwe ụlọ ahụ ha bi bụ Joseph Czuba.

"Ọ na-akpaso ha agwa ọma, ọ kachasị nwata ahụ bụ Wadea, onye ọ na-eme dịka nwanwa ya. Ọ na-enye ya ihe onyinye kwa mgbe kwa mgbe, na-azụtakwara ya ihe ụmụaka ji egwuri egwu," Yousef Hannon kwuru.

Mana akwụkwọ ụlọikpe gosiri na nwoke ahụ bụ Czuba bidoro iwere nne Wadea iwe "n'ihi ihe na-eme na mpaghara Jerusalem".

"Mana Shahin zara ya sị, "Ka anyị na-ekpe ekpere ka udo chịa", nke a mere Czuba ji were mma wakpo ya," Michael Fitzgerald bụ ọkaiwu dere.

Ndị ụlọikpe kwuru na Czuba na-ege ihe gbasara ọgụ Israel na Palestine na redio, nke mere iwe ya ji na-arị elu maka ndị Palestine bi n'ụlọ ya.

Ndị ezinụlọ Shahin kwuru na dịka nwoke ahụ wakporo ha, o kwuru sị: "Ụnụ bụ ndị muslim ga-anwụrịrị."

Yousef Hannon kọwara ya dịka nwata "hụrụ ịga ụlọakwụkwọ n'anya, hụ ndị nkuzi ya n'anya, hụkwa nne ya n'anya".

"Ọ hụrụ ndụ n'anya. Ọ na-akpa agwa dịka nwata ọbụla dị afọ isii, oge niile ọnụ ọchị dị ya n'ọnụ.

Nwanne nna ya ọzọ bụ Mahmoud Yousef kwuru na "Ihe ikpeazụ Wadea gwara nne ya dịka nwoke ahụ sụrụ ya mma bụ, 'Nne, adị m mma.' N'ezie ọ nọ ebe ka mma ugbua."

Ebee ka Czuba nọzi ugbua

Wadea al-Fayoum
Nkọwa foto, Ndị mmadụ tinyere obe, okoko dị icheiche nakwa ihe egwuregwu ụmụaka n'ihu ụlọ nwata ahụ bụ ebe ọ na-anọkarị egwuri egwu.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị uweojii kpụpụrụ Mazi Joseph Czuba ụlọikpe ma bo ya ebubo igbu ọchụ na iji ngwaọgụ wakpo mmadụ ma merụọ ya nnukwu ahụ, nakwa ebubo gbasara mpụ ịkpọ asị.

A kpọtara ya n'ụlọikpe n'ụbọchị Mọnde bụ ebe ọ nọrọ kwuo na ya ga-achọ ka ụlọikpe nye ya ọkaiwu ga-anọchite anya ya, ma kwukwaa na ya ghọtara ebubo ndị e boro ya, tupu a kpụghachi ya n'ụlọ mkpọrọ.

Ngalaba 'US Department of Justice' kwukwara na ha amalitela nnyocha maka mpụ ịkpọ asị.

N'ụlọ Wadea na nne ya na Bridgeview, ndị mmadụ tinyere obe, okoko dị icheiche nakwa ihe egwuregwu ụmụaka n'ihu ụlọ nwata ahụ bụ ebe ọ na-anọkarị egwuri egwu.

Otu n'ime ndị isi okpukperechi alakụba na mpaghara ahụ bụ Syed Khan kwuru sị: "Nwata a kwesịrị ịnọ n'ụlọakwụkwọ ugbua, mana kama nke a, anyị nọ ebe a maka olili ya."

Ihe karịrị mmadụ 1400 ndị Israel anwụọla kamgbe otu Hamas wakpochara mba ahụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba. Israel kwukwara na ihe ruru mmadụ 199 ka ndị Hamas ka ji eji na Gaza.

Na Gaza, ihe karịrị mmadụ 2,700 anwụọla dịka Israel na-atụ ogbunigwe na mpaghara ahụ iji bọgwara ọbọ.