Ehighi m ụra, erighi m nri, iji kpaa 'wig' tokarichara n'ụwa - Helen Williams
Ehighi m ụra, erighi m nri, iji kpaa 'wig' tokarichara n'ụwa - Helen Williams
Helen Williams bụ nwada na-emepụta ihe ụmụnwaanyị na-ekpu n'isi gbara na soshal mịdịa maka na o ritere nturuugo Guiness World Record.
O ritere ntuurugo a maka na ọ kpara ntutuisi a na-ekpu ekpu a na-akpọ 'wig' tokarichara n'ụwa niile. Okpu ntutuisi a o mere dị ogologo 351.28mịta nke ruru ogoglogo fiti 1,152 na inchi 5.
Nke a fọrọ nwaobere ihe ka ọ gazuo ama egwuregwu bọọlụ gburugburu.
Mana onye ga-eyikwanụ ụdịrị ntutu isi a n'isi ya?
Kirie na mkparịtụka anyị na nwada Williams ihe ọ gwara anyị maka ya bụ ntutuisi o mepụtara.



