Israel-Gaza war in numbers: Nchịkọta ihe ndị merela n'agha a n'ọnụọgụgụ

Ebe foto si, EPA
- Onye dere ya, By Amira Mhadhbi
- Ndị mere akụkọ a, By Amira Mhadhbi, BBC Arabic
N’isi ọtụtụ Satọde 7 Ọktoba, ndịagha nnupuisi mba Palestine bụ Hamas wakporo Isreal na mberede, gbuo ihe ruru mmadụ 1,400 ma nwụchie mmadụ karịrị 200 dịka gọọmentị mba Isreal si kwuo.
Kamgbe ụbọchị, na ihe karịrị otu ọnwa ugbua, mba Isreal na-atụ ogbunigwe nakwa mwakpo e mere na nso nso a egbuola ọtụtụ mmadụ ma mebie ọtụtụ ihe na Gaza Strip.
E gburu ma merụọ ọtụtụ puku mmadụ ahụ n'ụzọ ebe abụọ ahụ
Isreal kwuru na e gbuola ụmụafọ ha na ndị mbịarambịa karịrị 1,400 maka mwakpo a ndị Hamas mere n’Ọktoba – Ndị oyi ndụ egwu a machiri na mba Briten, Amerịka nakwa EU.
Dịka ozi gọọmentị mba Isreal wepụtara nke gosiri mmadụ 1,159 n’ime ndị e gburu n’ụbọchị ahụ, mmadụ 828 bụ ndị nkịtị ebe 31 bụ ụmụaka.
Ministri ahụike nke Palestine dị na Gaza nke Hamas na-achị kwuru n’ụbọchị 6 Nọvemba na e gbuola ihe karịrị mmadụ 10,000, nke gụnyere ụmụaka karịrị 4,100 – nke bụ na e gburu otu nwata n’ime nkeji 10.
Ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị gụnyere Onyeisiala mba Amerịka ajụọla ajụjụ ma ọnụọgụgụ ministri ahụike mba Palestine kpọpụtara ọ bụ eziokwu, mana otu World Health Organization (WHO) sị na o kwetere na ọnụọgụgụ ahụ bụ eziokwu.
A na-egbu otu nwata kwa nkeji 10 ọbụla

Mmadụ ruru 5,400 emerụọla ahụ n’Isreal ebe ihe karịrị 25,400 merụrụ ahụ na Gaza nakwa West Bank n’ihi ọgụ a, dịka gọọmentị mba Isreal na ministri ahụike mba Palestine si kwuo.
A ka na-achọ mmadụ ruru 2,260 achọ na Gaza, nke gụnyere ụmụaka 1,270. A na-ache na ọtụtụ n’ime ha tọrọ n’ime ụvụrụ aja ụlọ ndị dara ada.
Nsogbu ndị e ji eji
Mwakpo mberede a Hamas mere na 7 Ọktoba mere ka e nwee ọnọdụ ndị e ji eji kachasị ukwuu. Gọọmentị mba Isreal kwuru mmadụ 242 gụnyere ụmụafọ Isreal na ndị mbịarambịa ka ndị Hamas ka ji ugbua, tinyere ụmụaka karịrị 30.
Hamas kwuru na ogbunigwe mba Isreal na-atụ na Gaza egbuola mmadụ 57 n’ime ndị ha ji eji.
Hamas atọhapụla mmadụ anọ, gụnyere nwata dị afọ 17 n’ime ndị ha ji eji kamgbe 20 Ọktoba.
Ndịagha Isreal kwuru na ha zọpụtara otu nwaanyị onye agha Isreal e jichiri kamgbe 7 Ọktoba na mwakpo ha mere n’ụbọchị 29 Ọktoba.
A chụpụla ihe karịrị ọkara ọnụọgụgụ ndị bi na Gaza
Gaza Strip bụ ebe ihe karịrị mmadụ nde 2.2 bi, ihe karịrị ọkara ọnụọgụgụ ha bụ ụmụaka.
N’ụbọchị 13 Ọktoba, Isreal dọrọ ndị bi na Wadi Gaza dị mpaghara Ugwu Gaza aka na ntị ka ha kwaga na mpaghara Ndịda.
N’ime otu ọnwa Isreal malitere ịtụ ogbunigwe, ihe karịrị ụlọ 200,000 dị na Gaza alaala n’iyi – nke a bụ ọkara ụlọ obibi dị na Gaza Strip dịka ndị ọchịchị mba Palestine na Gaza si kwuo.
N’ụbọchị 5 Nọvemba, a chụpụla mmadụ ruru nde 1.5 bi na Gaza n’ụlọ ha, ndị bi n’ụlọụka, ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ nakwa ebe ndị ọzọ dịka ọnụọgụgụ United Nation na Palestine wepụtara.

Ịhapụ Gaza agaghị enwe isi, dịka okeala Erez e si abanye Isreal mechiri emechi ebe okeala Rafah e si abanye Egypt ka a na-emepe maka ịkpọpụ ndị mba ọzọ na ndị merụrụ ahụ.
E gburu ndị ọrụ enyemaka
Ministri ahụike mba Palestina dị na Gaza nke Hamas na-achị kwuru na 16 n’ime ụlọọgwụ 35 (46%) na 51 n’ime ụlọọrụ ahụike 76 dị na Gaza anaghịzi arụ ọrụ n’ihi mwakpo maọbụ enweghi mmanụ ụgbọala e ji amụ ọkụ n’ihe dịka 5 Nọvemba.
E mebiele ụgbọala mberede ruru 50, 31 n’ime ha anaghịzi arụ ọrụ ebe e gbuola ndị ọrụ ahụike ruru 175 dịka ministri ahụ si kwuo.
Dịka iwu na-achị mbaụwa si kwuo, ndị ọrụ enyemaka, ndị ọrụ ahụike nakwa ụlọọrụ ha na akwụrụngwa ka bụrịrị ihe a ga-echekwa.

UN kwuru na opekatampe na e gbuola ndị ọrụ enyemaka ha dị 88 na-arụ na ngalaba UNRWA nakwa ndị ọrụ enyemaka ndị nkịtị dị 18.
A bịa na ndị ntaakwụkwọ e kwesịrị ichekwa dịka nkwekọrịta Geneva nke afọ 1949 si kwuo, e gbuola ihe ruru mmadụ 46 n’ime ndị ntaakụkọ ka ọ dị na 5 Nọvemba, dịka ngalaba United Nationa na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ (UNOCHA) si kwuo.
Ọgụ Isreal-Gaza bụ nke kachasị ọjọọ n’ọnwa ndị ntaakụkọ na-akọ akụkọ banyere ọgụ na ọgbaghara kamgbe afọ iri atọ dịka otu a kpọro ‘Committee to Protect Journalists’ si kwuo.

Ọnọdụ ọjọọ nke enweghi mmiri
Maka ndị hụrụla isi ọgụ a rute ugbua, ndụ siri ezigbo ike na Gaza, n’ụkọ nri, obere mmiri nakwa ọnọdụ ọjọo nke ahụike.
WHO kwuru na ezinaụlọ na ụmụaka bi na Gaza na-adabere na otu onye kwa lita mmiri atọ maka ọṅụṅụ, isi nri nakwa idobe onwe ọcha kwa otu ụbọchị.
Naanị obere mmiri ka e bubatarala na Gaza site n’okeala Rafa na nso nso a, dịka e mebiri ntọala mmiri ji abata kamgbe.
N’ụbọchị 5 Nọvemba, ngalaba UN nke OCHA kwuru na mmiri e ji eme ihe na Gaza e jirila pasentị 92 gbatuo ala ma a tụnyere ka ọ dị tupu agha ebido, ebe akụrụngwa 65 na-egwupụta mmiri anaghịzi arụ ọrụ.
N’ụbọchị 31 Ọktoba, WHO dọrọ aka na ntị na nchụpụ ọtụtụ ndị mmadụ n’ebe obibi ha, mmebi akụrụngwa mmiri nakwa idobe ebe ọcha nwereike ibute ‘oke nsogbu nye ọnọdụ ahụike’ na Gaza.
Ngalaba UNOCHA kwuru na n’ezie na o nyochabeghi n’onwe ya banyere ọnụọgụgụ ndị Palestine maọbụ Isreal kppụtara.








