Earth Day 2022: Kedụ ka atụmatụ nchekwa ụwa 'climate change' si metụta gị?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ụwa anyị ji nwayọ nwayọ emebisi dịka ngalaba sayensị dị ịcheịche si kwuo nke mere e ji dopụ otu ụbọchị iche maka ichekwa ụwa anyị.
Kwa afọ, edopụla ụbọchị 22 n'ọnwa Eprel ka ọ bụrụ ụbọchị ncheta, nchekwa na ndokwa ụwa.
Nnyocha gosiri na ọtụtụ omume mmadụ na-emebisi ụwa, nke a na-emetụta ma ihu eluigwe, ikuku, ụmụ anụmanụ, ahịhịa, ala, oke osimiri nakwa mmiri dị ịcheịche na ihe ndị ọzọ.
Isi okwu ụbọchị ncheta ụwa Bekee kpọrọ 'Earth Day' nke afọ 2022 bụ 'Restore our Earth' nke pụtara iweghachịte ọnọdụ ọma ụwa anyị nọbụ.
A na-eme emume ncheta a na ihe ruru mba 193 n'akụkụ ụwa dị ịcheịche.
Emume nke afọ a mere ya ugboro 50 a na-eme ya n'ụwa.
Ọtụtụ otu na-alụ ọgụ ikike dịrị onye na-eji ụbọchị a zipụta ozi ma mee ngagharịiwe na mba dị ịcheịche ka ndị ọchịchị tinye iwu ga-echekwa ụwa nakwa usoro ndị mmadụ ga-eji na-echekwa ala, ikuku, mpaghara obodo ha, ahịhịa, mmiri, ụmụ anụmanụ na ihe ndị ọzọ.
Ọ nwere ọtụtụ ụzọ ihe omume ndị mmadụ si emetụta ihu eluiegwu n'ụzọ ọ jọọ.

Ebe foto si, Getty Images, AFP, BBC
Oge niile ka a na-ekwu okwu mgbanwe ihu eluigwe, nke pụtara ''Climate Change" na bekee, mana ọ naadị otụtụ mmadụ ka ọ bụ akụkọ ifo.
Ụfọdụ na-eche na ọ bụ okpokpo oyibo nke ndị sayentisti bekee ji aghọrị ndị mmadụ.
Mana nke bụ eziokwu bụ na 'climate change' dị ire, n'ihi na ọtụtụ ihe adịkwaghị ka ọ dị na mbụ.
Akụkọ a ga-arụtụrụ gị aka ihe olemole gbanwerela n'odị nso a nke gosiri n'ezie na ihu eluigwe gbanwere.
1. Udummiri na Ọkọchị
N'oge mbụ, dịka anyị nọ n'ọnwa Nọvemba, ụgụrụ agarala ịpụta ugbua na-eku ebe niile.
Oge ụgụrụ na-amalitebu n'etiti ọnwa Ọkutoba ruo ngwụcha ọnwa Febrụwarị.
Udummiri na-ebido n'ọnwa Maachị ruo ngwụcha Sepụtemba.
Mana ọ dịkwaghị otu ahụ ugbua. Onwekwaghị onye ma oge ụgụrụ ji apụta maọbụ onwa ole ọ na-anọ.
Oge ụfodụ, ụgụrụ nwere ike kuo naanị otu izuụka maọbụ abụọ, nke ahụ agaa
N'aka nke ọzọ, na mpaghara ụfọdụ, udummiri na-adịgide ruo mbido ọnwa Disemba, maọbụ gafee ya.
Ọtụtụ ndị ọkachamara ekwuola na ọ bụ 'climate change' kpatara nke a.
2. Oke ekpomọkụ

Na Naịjirịa taa, ekpomọkụ karịrị, ọbụladị na mpaghara ụfọdụ ebe o doro anya na oyi na-atụbu.
Ma n'ụtụtụ, maọbụ n'oge ehihie anwụ na-eti, maọbụ n'uhuruchi, elu na ala na-ekpo ọkụ.
Ndị o doro anya na-ekwu na ihe kpatara nke a nwereike ịbụ oke ekpomọkụ ụwa, nke a na-akpọ "global
warming" na bekee.
Nke a bụkwa otu ihe mperi si na mgbanwe ihu eluigwe.
3. Oke ide mmiri

Ebe foto si, Getty Images
Ide mmiri, nke bekee kpọrọ 'flooding' abụghị ihe ọhụrụ na Naịjirịa, mana ọ kawanyela njọ ugbua.
N'afọ 2020, ihe karịrị mmadụ nde abụọ ka ide mmiri metụtara na Naịjirịa ebe mmadụ iri isii na asaa nwụrụ anwụ.
Nke a bụ dịka ngalaba 'National Emergency Management Agency' si depụta.
N'afọ a bụ 2021, NEMA na-ekwu na ide mmiri ga-emetụta steeti 27 n'ime steeti 36 dị na Naịjirịa.
4. Oke Mbuze

Mkpamkpa mbuze na-akpa na mpaghara ọwụwa anyanwụ abụghị ihe e ji ọnụ akọ.
N'ọdị nso, mbuze na-akwanye njọ na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa.
Otu ihe kpatara nke a bụkwa oke idei mmiri, nke bụ otu mperi si n'ọnọdụ mgbanwe ihu eluigwe.
5. Ozara (desertification)

Ebe ụdị ihe a kacha apụta ihe bụ na mpaghara Ugwu Naịjirịa, dịka ọtụtụ ebe bụbu ala ubi aghọọla ọzara ugbua.
Ihe ndị na-akpata ala ịghọ ọzara gụnyere igbutu osisi, ịkpọ ala ubi ọkụ, iji osisi eme nkụ nakwa unyi, anaghị akụ osisi, na ihe ndị ọzọ.
Mana mgbanwe ihu eluigwe na-eme ka ọzara na-akawanye njọ.
Chata na mgbanwe ihu eluigwe na-akpata oke ekpomọkụ, nke na-eme ka ala na-akpọ nkụ karịa.
Nke a na-ebutekwa ụkọ nri, nke a na-akpọ drought na Bekee.
Gịnị ka gọọmentị Naịjirịa na-eme?

Ebe foto si, AFP
Onyeisiala Muhammadu Buhari sonyere n'ọgbakọ COP26 nke e mere na mba Scotland n'izuụka gara aga.
N'ọgbakọ ahụ, Buhari kwere nkwa na Naịjiria ga-agbalị ibelata ụfọdụ ihe nke na-eme ka mgbanwe ihu eluigwu na-aka njọ.
Nkwa Buhari kwere gụnyere:
- Naịjirịa ga-akwụsị iwepụta ikuku 'carbon' nke na-akpata ekpomoku ụwa n'afọ 2060
- Naịjirịa ga-akwụsị oke igbutu osisi nke na-akpata ọzara n'afọ 2030
- Naịjirịa ga-agbaso ụzọ ndị ọzọ ka ọcha iji mepụta ọkụ latrik nakwa ihe ndị ọzọ
- Naịjirịa ewepụtela atụmatụ iji buso mgbanwe ihu eluigwe agha, bụ nke a kpọrọ "national action plan on gender and climate change".
Ndị ọzọ na-enyekwa aka ebuso 'climate change' agha

Ebe foto si, Amuche Ndubeze
Enwekwara ndị nkịtị dị icheiche na-enye aka ibuso climate change agha.
Otu onye n'ime ha bụ Amuche Nnabueze kwuru na ihe kpatara o ji agbasi mbọ ike ibuso climate change agha bụ ka ụmụntakịrị nwee ikuku ọma ha ga na-ekute.
Amuche Ndubueze, onye so n'otu a kpọrọ 'Parents for future Nigeria', kwuru na "ọtụtụ ndị mmadụ na-anwụ kwa afọ n'ihi ikuku ọjọọ ha na-ekuru, nke bụ otu ihe ọjọọ 'climate change' kpatara".
Otu 'Parents for future Nigeria' sonyekwara n'ọgbakọ COP26, ebe ha nọrọ mee ka olu ha daa ụda okwu gbasara nsogbu climate change na Naịjirịa.










