Clean Energy: Lee ihe gaasị ji kara nkụ mma iji si nri

Ndị Igbo na-atụ ilu sị na nkụ dị na mba na-eghere mba nrị.
Mana n'agba ọhụrụ a, iji nkụ esi nri anaghịzi ewu.
Ebe anọzị ugbua bụ ikuku e ji esi nri nke a kpọrọ gaasị.
Ndị ọkacha mara n'ihe Bekee kpọrọ "climate" ekwuola ugboro ugboro na gaasi bụ ụzọ ka mfe ma karakwa ọcha iji sie nri.
Mana ọtụtụ na-ekwu na gaasị na-adala oke onụ.
Ndị ọzọ kwukwara na gaasị nwere ike imunye ụlọ ọkụ n'otu ntabi anya.
Gaasị ka mfe kakwa ọcha

Ebe foto si, Chukwunaeme Obiejesi
Otu nwanyị na-eghe akara gwara BBC Igbo na gaasị kaara ya mma karịa nkụ maọbụ unyiri.
Nwanyị ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na gaasị adịghị oke ọnụ dịka ndị mmadụ chere.
O kwuru sị, "Igbakọọ uru dị na ya ị ga achọpụta na ọ dịghị oke ọnụ etu ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
"Gaasị na-eghe nri ngwa ngwa.
"Anaghị m adọgbu onwe m ịfụ ọkụ mgbe ọbụla.
"Oke anwụrụ ọkụ anaghị enye m nsogbu.
"Anaghịkwa m adọgbu onwe m ịsa ite na ihe ndị m ji ere ahịa n'ihi unyi".
Ihe gaasị ji kara nkụ mma buru ibu

Ebe foto si, Getty Images
Nchọpụta dị iche iche egosila na gaasị ka mma iji sie nri karịa mmanụ ọkụ, nkụ nakwa unyiri.
Ha kwuru na mmanụ ọkụ ruru unyi n'ihi oke anwụrụ ọ na-ewepụta. Gaasị anaghị akwụ anwụrụ.
N'aka nke ọzọ, igbutu osisi maka mmepụta nkụ maọbụ ụnyi na-ebute nke Bekee kpọrọ "deforestation" bụ ihe aka ya dị na "climate change".
Anwụrụ si na nkụ maọbụ unyiri apụta nwekwara ike ibutere mmadụ ọrịa kansa.

Ihe gọọmentị Naịjirịa kwuru makagaasi
Maka ihe ndị anyị rụtụrụ aka nakwa ihe ndị ọzọ, n'ọnwa Mee afo a, gọọmentị etiti kwuru na a ga-amachị ndị mmadụ inwe udu gaasị nke aka ha.
Ọ bụ onye bụbụ Mịnịsta nke nta na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Ibe Kachikwu kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ihe gbasara gaasị doro anya nwere n'Abuja.
Kachikwu kwuru na gọọmentị ga-ewepụta "Micro Distribution Centres" ebe ndị mmadụ ga-aga na-azụrụ gaasị na-enweghi udu nke aka ha".

Ebe foto si, AFP
O kwuru na "nke ahụ ga-eme ka mata udu gaasị ndị merela ochie ma gbanwee ha n'oge iji gbochie ihe ndapụta".
Kachikwu gara n'ihu kwuo na atụmatụ ahụ bụkwa iji ikwụsị mmefu a na-emefu gaasị bụ nke Bekee kpọrọ "gas flaring".

Ebe foto si, Thinkstock
Mana Umar Gwandu, otu n'ime ndịisi ngalaba gọọmentị a akpọrọ 'Department of Petroleum Resources' kọwara atumatụ ahụ nke ọma.
Gwandu gwara BBC Igbo na "gọọmentị na-atụ alo ibido atụmatụ ga-enye aka ime ka ọtụtụ ndị mmadụ were gaasị na-esi nri mana nke ahụ apụtaghị ịmachi mmadụ inwe okpokoro gaasị nke aka ya".
"Atụmatụ a ga-enye ndi na-ere gaasị ikike inwe okpokoro gaasị ebe o buru ibu nke na onye enweghi, nwere ike gbaziri n'aka ha".
Gwandu gara n'ihu kwuo na "tupu onye ọbụla ebido ire gaasị, onye ahụ ga-aga nata ngalaba DPR akwụkwọ ikike".
"Tupu enye mmadụ akwụkwọ ikike a, onye ahụ ga-emezu ihe e dere n'iwu".
"Iwu ndị ahụ dị na website anyị."
N'otu aka ahụ, Paul Osu, bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba DPR, kwuru na "ebumnuche gọọmentị bụ iji belata ihe ndapụta ụfọdụ nwere ike ime ma ọbụrụ na ejizighi gaasị nke ọma".
Akụkọ ga-amasị gị:









