Onyeisi Main market Enugwu e gburu egbu bụ enyi ọha - Ụmụnne Stephen Aniagu

Onyeisi Main market Enugwu e gburu egbu bụ enyi ọha - Ụmụnne Stephen Aniagu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị obodo Attakwu Akagbe-Ugwu dị n’Enugwu Steeti nọ na nnukwu iru uju na ibe akwa ugbua n’ihi ogbugbu ndị ojiegbe gburu nwa ha nwoke bụ Maazị Stephen Aniagu.

Ka anyị rutere n’ụlọ ya bụ nwoke na Attakwu, nwunye ya, ụmụnne ya na ndị agbataobi ya gbakọrọ na-eru uju.

Dịka ụmụnne ya abụọ bụ Maazị Michael Aniagu na Awkunanaw Aniagu siri kwuo, ọnwụ nwanne ha nwoke bụ nke bịara na mberede.

Ọ bụ na Satọde 14 Septemba ka Maazị Stephen Aniagu na ndị otu ya gachara nzụkọ achụm nta vootu maka onye ga-achị Okpuru ọchịchị ha bụ Nkanu West. Ọ bụzị ka ọ na-ala n’ụlọ ya oge ọ ji ọkara gaa elekere asatọ nke abalị ka ndị ojiegbe wakporo ya n’ogige Maryland Enugwu were egbe gbagbuo ya.

Ada ya nwaanyị bụ Dọkịta Ogechukwu Aniagu kwara arịrị si na nna ya bụ onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya ma bụrụkwa onye udo.

“Nna m bụ onye udo hụrụ mmadụ ibe ya n’anya. E ji m ohere a arịọ ndị gọọmenti nakwa ndị uweojii ka ha tinye anya na mmiri jide ndị niile kpara nkata napụ nna m ndụ ya n’ike,” ka o kwuru.

Aha onyonyo, Ka ezinaụlọ Stephen Aniagu si eru ya uju
Akụkọ ndị ọzọ gbadoro ụkwụ n'ọrụ nchekwa
Ezinaụlọ Maazị Aniagu nwụrụ anwụ

Ka anyị rutere Main Market Enugwu, ụlọọrụ ya dịka ebe a gbara ọsọ agha, n’ihi na ndị ahịa sịrị na ọ dị ha ka na nrọ na onyeisi ha anwụọla.

Otu onye ahịa na-ere ihe ndị e ji esi nri gwara BBC na nnukwu osisi adaala, kwuo na Mazi Aniagu abụghị onye nsogbu.

Ụmụnwaanyị na-azụ ahịa ji anya mmiri katọọ ogbugbu ahụ dịka arụ.

Maazị Okechukwu Peter Igwenagu gwara BBC na Maazị Stephen Aniagu ejidela ọtụtụ ọkwa dị iche iche nke gụnyere; onyeisi Ogbette main market OMMTA, President General Awkụnanaw Town Union, ọ bụọla onye ndụmọdụ Gọvanọ Enugwu nakwa ọtụtụ nzere nkwanye ugwu dị iche iche.

Cheta na mkpamkpa ahụ kpara n’ụbọchị Satọde 14 Septemba 2024, oge ndị ekperima ji egbe gbagbuo Stephen Aniagu.

Kemgbe ya bụ ihe mere, ndị uweojii Enugwu wepụtara ozi si ndị mmadụ dere duu na aka ha ga-akpara ndị ogbuu mmadụ ahụ oge adịghị anya.

Gọvanọ Enugwu bụ Peter Mbah nọkwa n’ụbọchị ụka bụ 15 Septemba nye iwu abalị abụọ ka a chọta ndị ọjọọ ahụ.

Ka ọ dị ugbua, ozu onyeisi Ogbete Main Market Traders Association bụ Stephen Aniagu nọzị n’ọbaozu Eastern Nigeria Medical Centre Enugwu.