Etu mmadụ anọ si n'otu ezinaụlọ jiri site n'ụra fee n'ọnwụ ha n’Enugu Steeti

Ebe foto si, Getty Images
E nweela ọnọdụ ọgbaghara n'ime obodo Amaeze dị n’okpuruọchịchị Nsukka dị nke Enugu steeti ka e nwetara ozi na mmadụ anọ si n'otu ezinaụlọ nwụrụ dịka ha na-ehi ụra.
Njiji ahụ jiri na Sọnde, ụbọchị mbụ nke ọnwa Sepụtemba 2024, ebe a mabeghị kpọmkwem ihe kpatara ọnwụ ha.
Akụkọ kwuru na mmadụ anọ a rikọrọ nri n'abalị ahụ tupu ha lakpuo ụra ma ghara iteta.
Akụkọ kwuru ndị a gụnyere otu, nne ya, nwanne ya nwaanyị na otu nwa ya.
Dịka ọ dị ugbua ndị uweojii ekwubeghi ihe ọbụla banyere ya dịka ọnụ na-ekwuru ha n'Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe azaghị oku mgbe BBC kpọro ya n'ekwentị.
Mana otu onye ntaakụkọ nọ na Nsukka gwara BBC Igbo na ozi ahụ bụ eziokwu ma kwuo na ndị uweojii eburela ozu mmadụ anọ a gawa n’ụlọọgwụ iji mee nyocha ma chọpụta ihe kpatara ọnwụ ha.
Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo na-aga n'ihu iji chọpụta ihe niile banyere akụkọ a.
Akụkọ ka na-abịa ...












