Otu onye ọzọ anwụọla n'ime mmadụ ise nwụburu dịka ezinụlọ mmadụ 12 tụbọrọ n'Imo Steeti

Ndị nke no n'ụlọ ọgwụ

Onye ntakụkọ BBC garuru ụlọ na ụlọọgwụ akpọgara ezinụlọ mmadụ iri na abụọ tụbọrọ n'ụbọchị mọnde, n'obodo Obinze dị n'Imo Steeti chopụtara na otu onye ọzọ anwụọla nke mere ya mmadụ isii nwụrụla n'ime ezinụlọ mmadụ 12 a.

Ụlọ ebe ya bụ ihe mere gbachiri agbachi ma enweghị onye ọbụla nọ nsọ ebe ahụ.

Ụlọ ebe mmadụ 12 tụbọrọ
Ụlọ ebe mmadụ 12 tụbọrọ

Lee ọnọdụ ndị nke nọ n'ụlọọgwụ -

Ndị nke no n'ụlọ ọgwụ
Ndị nke no n'ụlọ ọgwụ

Mmadụ ise si nwụọ n’ime otu ezinaụlọ n’Obinze dị n’Owerri

Ndị nwụrụ n'ime otu ezinaụlọ eruola mmadụ ise

Oke ihe ọdachi mere otu ezinaụlọ dị n’Obinze nke okpuruọchịchị Owerri West nke Imo Steeti n’ụbọchị Mọnde 6 Juun 2022, mgbe a chọpụtara mmadu iri na abụọ na-anaghị ekuzi ume.

Nke a tinyere ndị bi na gburugburu ebe ahụ n’ọgbaghara nke mere e ji buru ha gawa n’ụlọọgwụ Imo Specialist dị n’Umuguma, Owerri.

Mgbe e ruru ebe ahụ a chọpụtara na mmadụ ise n’ime anwụọla dịka onye dọkịta si kwuo ebe ha na-achọ ịzọ ndụ mmadụ asaa ndị ọzọ.

Otu n’ime ndị a bụ onyeisi ezinaụlọ ahụ bụ ọkwọ ụgbọala Uche Onyeagucha, onye ji ọkwa ọkọlọtọ PDP na-azọ ọkwa Sịnetọ.

Kedụ etu ihe a si mee?

Ụlọọgwụ ebe e bu ha gaa

Otu onye ezinaụlọ ahụ gwara BBC na ihe butere ọnwụ ndị ahụ ka bụ ihe mgbagwoju anya nye ha.

Ọ kwuru sị “kedụ etu mmadụ iri na abụọ n’otu ezinaụlọ ga-esi bụrụ ndị na-anaghị ekwu ume n’ime otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ nwere ọnụ isii?

Ọ sị na nna nwe ezinaụlọ ahụ bụ Kingsley na-akwọrọ Uche Onyeagucha kwesịrị ibu nna ya ukwu gawa ọdọụgbọelu n’ụtụtụ a mana ọ zaghị ekwentị ya. Ha kpọkwara nwunye ya mana ọ zaghị.

“Uche Onyeagucha zigara onye ọrụ ka ọ gaa n’ụlọ ha chọpụta ihe mere, mgbe o ruru ebe ahụ ya bụrụ na a gbachiri ụlọ ha agbachi, ọ malitere ịkụ aka mana o nweghi onye mepere ụzọ.

“Mmadụ wụbara n’ime ụlọ ma mepee ụlọ chọpụtazie na a gbachiri mmadụ iri na abụọ n’ime otu ọnụ ụlọ, o nweghi onye na-eku ume n’ime ha.

“E buru ha gawa ụlọọgwụ ma chọpụta na mmadụ ise n’ime ha anwụọla.”

Ndị ihe ndị a metụtara bụ Kingsley bụ nna nwe ezinaụlọ, nwunye ya, ụmụ ha na ụmụnne ha ndị chọ ha bịa.

Ebe ndị nwụrụ gụnyere Kinsley, obere nwata dị afọ abụọ na mmadụ atọ ndị ọzọ.

Ihe ndị uweojii kwuru

Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steetị bụ Michael Abattam, ọ zaghị.

Mana onye ntaakụkọ nọ n'Owerri sị na Abattam kwuru na ọ nụbeghi maka ihe mere.