Ụlọomeiwu Anambara Steeti akpọghachitela Bernad Udemezue

Foto Benard Udemezue yi uwe ọcha ma kpuru okpu ojii

Ebe foto si, Isi Enyi/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọomeiwu Anambara Steeti akpọghachitela Bernard Udemezue e ji 'Isi Enyi' mara na-anọchite anya Ayamelum onye ha kwụsiburu ọrụ dịka onyeomeiwu steeti ahụ maka ebubo agwa megidere iwu ọ kpara.

Nke a na-abịa dịka otu kọmiiti ụlọomeiwu ahụ na-ahụ maka iwu nakwa ihe ndị ọzọ nke Ikenna Ofodeme nọ n'isi ya kpebiri ma kwuo na Udemezue ga-amalite inweta ụgwọọnwa ya dịka onyeomeiwu steeti ahụ malite n'ọnwa Maachị 2026.

Komiiti ahụ kwukwara na Udemezue ga-enwe ike ịbata ogige ụlọomeiwu ahụ ma na-esonye na-imepụta iwu na steeti ahụ.

Akụkọ si n'ụlọomeiwu ahụ kwuru na Udemezue dere akwụkwọ ozi ịrịọ mgbaaghara na Nọvemba 7, 2025 nke bua kara ANHA/014/032.

"Ọ bụ n'akụkọ ka m nụrụ na ndị omeiwu Anambra Steeti kwụsịrị m ọrụ" - Isi Enyi

Onyeisiụlọomeiwu Anambra Steeti, Benard Udemezue na ndị omeiwu Anambra Steeti

Ebe foto si, Isi Enyi/Anambra Broadcasting Service

Bernard Udemezue na-anọchiteanya mpaghara Anyamelum n'ụlọomeiwu Anambra Steeti ekwuola na ọ bụ n'akụkọ ka ọ nụrụ na ndị omeiwu Anambra akwụsịtụla ya ọrụ ruo ọnwa atọ.

O kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọrọ ya banyere akwụkwọ nkwụsị ọrụ na-efegharị ebe niile.

N'okwu ya "Anụrụ m akụko na ụlọomeiwu kwụsịtụrụ m ọrụ mana enweghị akwụkwọ maọbụ ozi ọbụla ha ziteere m banyere nke a, ana m eche ka ha wepụta maọbụ detara m ozi banyere mkpebi ha kpebiri".

Nke a na-abịa dịka ụlọomeiwu Anambra Steeti kwụsịtụrụ Udemezue ọrụ ruo ọnwa atọ maka ịkpa dị aṅaa megidere iwu na-achị ndị omeiwu.

Ụlọmeiwu kpebiri na a ga-aghị akwụ ya ụgwọ n'ime ọnwa atọ ahụ, tinyekwara na ọ gaghị abịa nso na gburu gburu ụlọomeiwu ahụ.

Mkpebi a sitere na ntuziaka kọmitii na-ahụ maka akparamagwa n'ụlọomeiwu nyere nke onyendu pati kachasị n'ọnụọgụgụ bụ Ikenna Ofodeme nọ n'isi ya.

Benard Udemezue na-aṅụ ọgwụ ike - Gọọmenti Anambra Steeti

Omeiwu Benard Udemezue na Gọvanọ Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Isi Enyi/Chukwuma Soludo/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Gọọmenti Anambra Steeti azaghachịla onye omeiwu na-anọchite mpaghara Anyamelum n'ụlọomeiwu steetị ahụ bụ Benard Udemezue n'ebubo ndị o boro Gọvanọ Chukwuma Soludo.

Omeiwu Udemezue e ji 'Ishi Enyi' maara boro gọọmenti Anambra ọtụtụ ebubo nke gụnyere iji akaike akpachi ndị omeiwu ka ha ghara ịrụ ọrụ etu ha kwesịrị.

Ọ kwukwara na aka na aka Gọvanọ Soludo dị na ntọrị nakwa ogbugbu e gburu omeiwu Justice Azuka na-anọchiteanya Ọnịcha Nọt 1 n'afọ 2024.

Mana kọmishọna mgbazaozi nke Anambra Steeti bụ Law Mefor na nkọwa o nyere BBC Igbo n'ekwentị kwuru na ihe ndị a Udemezue na-ekwu bụ ebubo ndị na-achịtaghị aja.

Ọ jụrụ sị "Soludo ọ nọzi n'ụlọomeiwu? Kedụ etu o si egbochi ha ịrụ ọrụ ha kwesịrị ịrụ?

"Ihe Naịjirịa nwere bụ ọchịchị onye kwuo uche ya bụ nke nwere ngalaba gọọmentị atọ gụnyere ndịisi ọchịchị, ndị omeiwu na ndị ngalaba ikpe.

"Ngalaba atọ ndị a nwere ọrụ ha na-arụ na ikike ha nwere dịka iwu na-achị obodo si kwadoo ha.

"A bịa na nzukọ ndị omeiwu e nwere akwụkwọ na-egosi ihe niile ha ga-eleba anya a kpọrọ 'order paper', akwụkwọ ahụ ọ ga-abata n'aka Gọvanọ tupu ndị omeiwu e were ya rụọ ọrụ?"

Mefor kwuru Udemezue amaghị ihe ọ na-ekwu, na ọ bụrụ na ọ maghị ọrụ ọfụma dịka onye omeiwu ka o kwuo ka e nyere ya aka karịa ịbịa na-alụsọ gọọmenti steeti ọgụ.

Mgbe a jụrụ Mefor maka ebubo na aka gọọmentị dị n'ọnwụ onyeiwu bụ Justice Azuka, o kwuru na ọ bụrụ na Udemezue maara na ihe dị etu a dị na o kwesịrị ịga gbaa ama n'aka ndị uweojii.

Law Mefor bụ Kọmishọna mgbasaozi n'Anambra Steeti.

Ebe foto si, @DrLaw_Mefor/X

Na o meghi nke a kama na ọ bịara n'ịntanetị na-ebu ebubo na-achịtaghị aja.

"Ndị uwejii adịla mbu nwuchie ndị tọọrọ ma gbuo Azuka, ụfọdụ ndị gbara ọsọ n'aka ndị uweojii, e mechara jidegharịa ha.

"Ihe mere nwamadị a (Udemezue) bụ na isi adịchaghị ya mma, ọ na-aṅụ ọgwụ ike maka na onye uche ya zuru oke agaghị ebo ebubo na-enweghi nkọwata na-edoghi anya.

Mefor gara n'ihu kwuo na Gọvanọ Soludo nwere ọrụ ndị juru ya aka na o cheghi na ọ ga-enwe ohere ịsa nwamadị a okwu maọbụ kpụpụ ya n'ụlọikpe n'ihi ebubo ndị ahụ.

"Ahụ adịghị ya, ihe ọ chọrọ bụ enyemaka, ka a kpọga ya n'ụlọọgwụ a na-agwọ ndị isi mgbaka maka okwu ya anaghị enwe nghọta."

Ebubo ndị Udemezue boro

Omeiwu Benard Udemezue, na-anọchiteanya Anyamelum n'ụlọomeiwu Anambra Steeti.

Ebe foto si, Isi Enyi/Facebook

  • Omeiwu Benard boro ebubo na aka gọọmenti dị na ntọrị na ogbugbu Justice Azuka n'afọ 2024 maka na o so na ndị omeiwu chọrọ ịchụpụ Gọvanọ Soludo.
  • O kwuru na ndị ọrụ nchekwa ga-aza ajụjụ etu ụfọdụ ndị omekaome e jidere maka ọnwụ Azuka si gbaa ọsọ mana e jidere ha ọzọ, emechaa a sị na ụfọdụ ha anwụọla.
  • Udemezue gosiri ihe onyonyo ụzọ e si aga obodo Anyamelum na-adịghị mma, ma kwuo na gọọmenti na-egwupụta mmanụ ebe ahụ mana ha anaghị arụ ụzọ.
  • O wepụtara ihe onyonyo gosiri ebe a gbachiri ụzọ ma jụụ na ọ gaghị abanye n'ime ụlọomeiwu Anambra Steeti. N'ihe onyonyo ahụ, onye nchekwa ụzọ kwuru na ọ gaghị e ji ọgbatumtum keke banye. Mana Udemezue sara ya si "enweghi m ụgbọala, onweghị ụgbọala e nyere m iji abịa ọrụ"
  • Ihe onyonyo ọzọ Udemezue wepụtara gosiri ka ndị ọrụ nchekwa gbochiri ya ịbanye n'obi Eze Obodo mgbe ọ gara mmemme. Ọgụ mechara dapụta dịka o kwuru na o nwere ikike dịịrị ya ịga kelee Eze Obodo ya.