Ndị gọvanọ na-akpọ m n'ekwentị - Governor Amuneke

Aha onyonyo, Ndị gọvanọ na-akpọ m n'ekwentị - Governor Amuneke
Ndị gọvanọ na-akpọ m n'ekwentị - Governor Amuneke
Ndị gọvanọ na-akpọ m n'ekwentị - Governor Amuneke
Nkọwa foto, Kevin Arua a maara nke ọma dịka Governor Amuneke yi uwe mwụda ma jiri njirimara BBC n'aka
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Kevin Chinedu Arua a maara nke ọma dịka "Governor Amuneke" ekpugheela ihe ndị ọchịchị gwara ya oge ha kpọrọ ya n'ekwentị.

Governor Amuneke kpughere nke a na nso nso a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche.

Kevin bụ nwaafọ Naịjirịa na-ewu ewu ugbua maka ihe ngosi o ji egosipụta omume ndị ọchịchị n'Afrịka.

Ọ gwara anyị sị "Ọtụtụ ndị ọchịchị akpọọla m n'ekwentị maka ọrụ, mana achọghị m ịrụrụ pati ọbụla ọrụ. Abụ m onye na-eme ihe ngosi, abụghị m onye ndọrọndọrọ ọchịchị."

Dịka o siri kwuo, Governor Amuneke na-anọchite anya ọtụtụ ndị gọvanọ na ndị isiala na mba Naịjirịa nakwa n'Afrịka niile, ọ bụghị naanị Naịjirịa.

Pịa aka ebe a ka i soro Whatsapp Chanelụ anyị
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro Whatsapp Chanelụ anyị

Ọ sịrị na ọ bụ ndị ndu Afrịka na-akpalite mmụọ ya maka ihe ndị ọ na-egosipụta dịka Governor Amuneke.

"O nwere nke onyeisiala mba Kamerun kpaliri mmụọ m. Nke gosiri na ụfọdụ ndị ọchịchị n'Afrịka anaghị arịtu n'ọchịchị ruo oge ha nwụrụ".

"Governor Amuneke nọchitere anya ndị ọchịchị ọjọọ niile na-anaghị eme ihe ha kwesịrị ime n'Afrịka," ka ọ gwara anyị.

Governor Amuneke kwukwara na o nweghị ụdị iyi egwu ọbụla ga-eme ka ya kwụsị igosipụta omume ọjọọ ndị ndu Afrịka.

"Enwere m nkwenye na, ebe ọ bụ na ihe m na-eme bụ maka ọdịmma obodo, ọ bụrụ na ọ ga-egbu m, ya gbuo m. Ugbua m bịara ebe a, eji m ndị nchekwa?," ka ọ jụrụ.

O kwuru na ya agaghị ahapụ ihe ngosi Governor Amuneke, ọkachasị ugbua a na-akwado maka ntuliaka na mpaghara Afrịka dị iche iche.

O kwuru na ya agaghị ahapụ ihe ngosi Governor Amuneke, ọkachasị ugbua a na-akwado maka ntụliaka.

Ebe foto si, Kevin Arua/Instagram

Nkọwa foto, Kevin Arua yi uwe isiagụ, kpụrụ okpu ndị nze, nyara olomgbo n'olu ma gbara ọla n'aka.

O kpughekwara na ihe ngosi Governor Amuneke na-eme nke ọma n'ihi na ọ na-egosipụta ihe ndị ọchịchị na-eme n'Afrịka.

"Ọ bụrụ na m bụ onye Nedaland, ikekwe agaghị m emenwu ihe a m na-eme maka na ọ gaghị aba uru".

"O nwere mba ọ ga-abụ i mee ụdịrị ihe ngosi a, ọ gaghị aba uru, mana ebe ọ bụ na Afrịka dị etu a ọ dị ugbua, o nwere ọtụtụ ihe a ga-elebara anya," ka Governor Amuneke kwuru.

Oge a jụrụ ya gbasara otu egwu bọọlụ ọ na-akwado, Governor Amuneke sịrị "Otu egwu bọọlụ m na-akwado, ịkpọ ya aha ugbua na-eme m ihere, mana etu anyị si akwado maka nke afọ a dịkwa ka ọ dị mma. Otu egwu bọọlụ m na-akwado bụ Manchester United."

Kevin Chinedu Arua bụ nwaafọ Ovoko dị n'okpuru ọchịchị Igboeze South, a maara nke ọma dịka Nsụka n'Enugwu steeti.

Ọ na-eme ihe ngosi na nkenke ejije dị iche iche, ma nweekwa ụfọdụ agwa ndị ọ na-egosipụta na ha, nke gụnyere Chief Amuneke na Governor Amuneke.

Governor Amuneke sị ya na-akwado otu egwu bọọlụ Manchester United

Ebe foto si, Kevin Arua/Instagram

Nkọwa foto, Kevin Arua yi uwe njirimara otu egwu bọọlụ Manchester United na-acha ọbara ọbara.