Ndị mmadụ agaghị eji ịkọ ọnụ kwanye anyị n'izo nwa anyị ezo - Nkubi na nwunye ya

Aha onyonyo, Ndị mmadụ agaghị ejị ịkọ ọnụ kwanye anyị n'izo nwa anyị ezo- Nkubi, nwunye ya
Ndị mmadụ agaghị eji ịkọ ọnụ kwanye anyị n'izo nwa anyị ezo - Nkubi na nwunye ya
Ndị mmadụ agaghị eji ịkọ ọnụ kwanye anyị n'izo nwa anyị ezo - Nkubi na nwunye ya
Nkọwa foto, Ndị mmadụ agaghị eji ịkọ ọnụ kwanye anyị n'izo nwa anyị ezo - Nkubi na nwunye ya
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist BBC Igbo
    • Ebeg o si, Legọs
    • Onye dere ya, Donald Chika Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Legọs

Victor Nwaogu a ma dịka 'Nkubi' bụ onye ejije soshal midịa na nwunye ya akọwaala ihe mere ha ji akpọpụta nwa ha na soshal medịa na-agbanyeghị akọmaọnụ.

Ha kwuru nke a na mkparịtaụka ha na BBC Igbo nwere na nsonso a.

Ya bụ onye ọrụ mgbasaozi redio na TV a ma ama kwụrụ sị, "Agaghị m eji maka ihe ndị mmadụ na-agwa m na ọnụ a na-akọ m sị ka m hapụ ịkpọpụta nwa m, ka ha ghara ịkọ ya ọnụ.".

N'okwu gbasara ebe ọ si nweta aha e ji mara ya bụ 'Nkubi', ọ gwara BBC Igbo sị, "Ọtụtụ ndị mmadụ ajụkwaala m 'ole ebe aha 'Nkubi' si?' Ihe nọ n'ime ya bụ na mgbe m nọ na mahadum, maka na ihe m gụrụ bụ 'Theatre Arts', o nwere ihe mmemme anyị na-eme n'ọgbọ mgbe ahụ, mgbe anyị na-eme ya, o rue oge m ga-abata, mgbe m batara na-ekwu okwu nke m, ya e ruo ebe o ruru m, m chefuo ihe m na-ekwu.

"Ya abụrụ na 'Nkubi' bụ ihe m bịara na-ekwu iji cheta ihe m na-ekwu. M na-akpọ Nkubi, na-akpọ Nkubi rue oge m chetaziri ihe m na-ekwu."

"Ozugbo anyị mechara mmemme ahụ, onye ọbụla lasachaa, onye nkụzi anyị na ụmụakwụkwọ ibe m amalite kpọwa m 'Nkubi'.

"Bido oge ahụ, onye nile nọ n'ụlọakwụkwọ na-akpọzi m Nkubi rue oge m pụrụ na mahadum."

Nkubi agabigala ọtụtụ ihe nkọgide na mkpagịde na akpamoke n'ihi ịbụ onye mkpụmkpụ ma merie dịka onye ihe ejije nakwa onye ọrụ mgbasaozi a na-anụ aha ya, lụtakwa nwaanyị, ma nwee nwa.

Ọ sịrị, "Ị ga-ahụ ọtụtụ ndị mmadụ ihe gbasara ndị mkpụmkpụ edochaghị anya. Maka ya, ha ga na-akpọ gị aha dị iche iche. Aha a na-akpọ gị bụ aha agaghị enye gị obi ụtọ."

"Mmadu na-eto, ya ana-aghọtakwanụ onwe ya. Mana ị na-agabigakwa ihe ndị a nile, buru n'obi na o nweghị ihe ga-egbochi gị ịbụ ihe ị chọrọ ịbụ n'ụwa."

Nkubi na nwunye ya na-achị ọchị n'ụlọ ha oge anyị gara n'ụlọ ha
Nkọwa foto, Nkubi na nwunye ya na-achị ọchị

Nwa mbụ ha gbara otu afọ na-agabigakwa nkọgide na soshal midịa nke mere ụfọdụ ndị mmadụ ji asị ka ha kwụsi igosipụta ya na soshal midịa.

N'okwu etu ya na nwunye ya siri zute onwe ha, ha kwuru na ha zutere na Facebook.

"O nwere oge m nọ n'ụlọ, o nweghị ihe ọbụla m na-eme, m gaa n'ihu akwụkwọ Facebook, na-ele ndị Facebook na-atụziri m aka ka ha bụrụ enyi m (friend suggestion). O nwere enyi m nọ Facebook, nke ya na Nkubi bụ enyi, m sị ka m zigaara ya ozi ka ọ bụrụ enyi m na Facebook dịka m nọ na-ezigakwara ndị ọzọ ozi ịrịọ ha enyi."

N'ebubo na ọ bụ ego mere nwunye Nkubi ji kweta ka ọ lụọ ya, ha abụọ kwuru na Nkubi enweghị ihe ọbụla oge ha abụọ malitere dịwa mma.

"Mgbe mụ na ya zutere,abụ m okpokoro na-ebiri onwe ya ndụ ya, birikwanụ n'otu ọnụ ụlọ na- agbanyeghị na m na-arụ ọrụ."

"E nwere m ebe obibi n'ụlọọrụ.Ebe ahụ ka mụ na ya na-ezukọ. Ọ bụ onye zutere gị ebe ibi n'otu ọnụ ụlọ,nabata gị, gị na ya ebirikwa, mecha enyi,lụkwa onwe ụnụ, ọ bụ nke a ga-agwa gị na onye a ekpebiela na etu ọbụla o siri dị na ya ga-etinye ya isi."

Yabụ ọ bụ ndị na-amaghị etu anyị si bido,ga asị na ọ bụ maka ego.Ị ga-ahụ ndị mmadụ na-asi na ọ bụ maka ego.Olekwanụ ebe ego nwa nọ?"

Gee ihe ezinaụlọ kwuru n'uju n'ihe ononyoo dị n'elu.

Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp

Ihe ndị ị kwesịrị ịma banyere Nkubi

Victor Nwaogu a ma ama dịka 'Nkubi ebe o yi akwa isiagụ na okpu mmee mmee dịka ọ na-achị ọchị. Onye ọzọ jikwa akwa isiagụ nọ ọdụ n'azụ ya

Ebe foto si, Nkubi/Facebook

Nkọwa foto, Victor Nwaogu a ma ama dịka 'Nkubi' bụ onye ihe ejije nakwa onye ọrụ mgbasaozi redio
  • Ezi aha ya bụ Victor Nwaogu mana a ma ya ama dịka 'Nkubi'.
  • Ọ bụ onye Ahaba Orodo dị n'Okpuru Ọchịchị Mbaitoli n'Imo Steeti.
  • Nne na nna ya mụrụ ya na Legọs ebe ọ nọrọ too.
  • Nkubi bụ dị ọkpara n'ime ụmụnne isii ma bụrụ naanị onye dị mkpukpu n'ime ha niile.
  • Ọ gara mahadum 'University of Ibadan' ebe ọ gurụ 'Theatre Arts'.
  • Ọ bụ onye ihe ejije nakwa onye mgbasaozi redio nakwa onyonyo TV
  • Ihe nkiri Nkubi sonyerela gụnyere ; 'Golden Axe', 'Tinsel', 'Single Girls in Transit', 'Broken Dream', na 'Holy Heist'.
  • Ọ lụọla nwaanyị ma mụta otu nwa.