Nnyocha BBC: Ngarị, ịma mmadụ na ihe ndị ọzọ ka na-ebute ọgbatauhie n'inwete 'international passport'

- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8
Na-agbanyeghị nhazigharị usoro ọnọdụ inweta akwụkwọ njirimaara onye, nke Bekee kpọrọ 'international passport' nke ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naịjirịa na-ahazi, nrụrụaka, ịma mmadụ na nsogbu e jiri aka mee ka na-echere ụmụ Naịjirịa aka mgba n'inweta akwụkwọ ahụ e ji eme njem.
Dịka a tụrụ ilu sị "o nweghi ihe a gwọrọ onyeara ka ọ kwụsị ntabi anya." Ụfọdụ ihe na-ebe ka na-ebe dịka o were onye ntaakụkọ BBC otu afọ ịgbata akwụkwọ n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka ya bụ 'Nigeria Immigration Service' na ngalaba ụlọọrụ ha dị n'Ikeja Legọs site n'ohere intanetị na-agbanyeghị nkwa n'ihe adila mma nke ụlọọrụ
Lee ihe onye ntaakụkọ BBC gabigara:

N'ebe elekere iri nke ụtụtụ n'ụbọchị 12 nke ọnwa Maachị, afọ 2025, ọnụụzọ e si abanye n'ụlọọrụ Ikeja Passport Office na-azụ ka ahịa.
Ndị mmadụ na-enubata ma na-apụkwa n'ogige ụlọọrụ ahụ a gbara uli ọbara ọbara ma jiri ugegbe chọọ mma.
Ụfọdụ ndị ọrụ ha yi akwa kaakị na-akwụgharị na nso ụzọ e si abanye ulọọrụ ahụ.
Otu n'ime ha kwụụ n'obere ọnụụzọ ama ahụ ma na-agba ndị na-abata ajụjụọnụ.
Oge m rutere ya nso, nwoke ahụ ọchị adịghị atọ jụrụ m sị,"Ehen, kedụ ihe butere gị ebe a?"
"Abịara m ka ịnara akwụkwọ njirimaara nwamala m."
Ọ tụọrọ m aka ebe m ga-aga ma nye m ohere ịbanye n'ime ogige ụlọọrụ ahụ.
Oge m batara, ndị mmadu kwojuru n'ebe a na-anọ eche oge ịnata akwụkwọ njirimara.

Ndịọrụ 'Immigration' abụọ; otu nwoke na otu nwaanyị nọ n'oche na-akọrị. Eleere m otu nwokoroọbia bụ m ụzọ bịa ka ọ na-afokasị akpa ya anya ma wepụta akwụkwọ gosiri na mụ etinyela aha m n'ọbaozi websait ụlọọrụ ahụ ma nye ha akwụkwo ihe akaebe.
Onye ọrụ nke nwaanyị lere akwụkwọ ahụ anya ma welite isi, jụọ m sị, " Ị bịala ebe mbụ?"
" Abịala m ya ọtụtụ oge," bụ ihe m sara ya.
Ka ọ gara ihe dịka nkeji iri maobụ iri na ọkara, nwaanyị ahụ a kpọpụta aha otu onye, onye ahụ ekulie gaa nara akwụkwọ ya, laa.
Ka ọ gachara ihe dịka otu awa, nwaada ahụ tiri, "Uche Akolisa!"
M bilie, gaa na tebụlụ ya , o nye m asambodo njirimaara nwaamala ọhụrụ m.
Nke a mere kpomkwem otu afọ na ụbọchị asatọ m jiri tinye akwụkwọ n'ọbaozi ụlọọrụ 'Ikeja Passport Office'!
Nkwa Minista Tunji-Ojo na olileanya ụmụafọ Naịjirịa

Ebe foto si, Olubunmi Tunji-Ojo/X
N'ụbochị Wenezde, abalị 30 nke ọnwa Ọgụstụ afọ 2023, dịka e nyechara ya ọkwa, Minista Naijiria na-ahụ maka ihe na-eme n'obodo bụ Olubunmi Tunji-Ojo nyere iwu ka ngalaba ' Nigeria Immigration Service(NIS)' wepụ ọgbachi niile na-emegide ndị mmadụ inweta akwụkwọ njiirimaara nwaamala ha na-egbughi oge site na iji akọrọngwa tekịnụzụ aru ọrụ ha.
Tunji Ojo gara n'ihu n'abalị nke abụọ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2024 maa ọkwa n'akara 'Facebook' na 'Instagram' na ụmụ Naijiria ga-enwe ohere itinye akwụkwọ maka inweta akwụkwọ ha n'intanet, na-enweghị mmekọrịta onye ọbụla malite n'abalị asatọ nke otu ọnwa ahụ.
Ọkwa ahụ mere ka obi tọwa ọtụtụ ụmụafọ Naijiria ụtọ.
Otu onye nyere aha ya dịka Rt. Hon Max Eleazer nwere ọṅụ si, "oge ndị ọrụ 'immigration' aka ha adịghị ọcha ji amịgbu ụmụ Naijiria agaala".

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụfọdụ ekweghi na nkwa ọhụrụ ahụ. "Ekpere m bụ ya dịkwa ire" bụ ihe otu onye kwuru n'ọbaozi Instagram.
Tupu Tunji-Ojo abata n'ọkwa ya, inweta akwụkwọ a dị ka ịmịpụta mmiri n'okwute - ọ na-ewe ogologo oge, ma rịkwaa nnukwu ego karịa ihe iwu kwuru n'ihi ụkọ akwụkwọ njirimara ya nke mere ka ụfọdụ ndi mmadụ na-enye ngarị iji nweta nke ha n'oge.
Ka o mechara ọnwa abụọ atụmatụ ahụ malitere, BBC zigara onye ntaakụkọ ha ịnwale ma ọ bụ ihe e kwuru ka a na-eme.
A malitere m itinye akwụkwọ n'abalị 27 nke ọnwa Febuwarị, afọ 2024 ma mecha nke a n'abalị anọ nke ọnwa Maachị, kwụọ ego dị N70,000 n'intanet maka inweta akwụkwọ ihuakwụkwọ dị 64.
E nwetakwara m elekere iri na ọkara nke abalị 12 ọnwa Maachị afọ 2024 dịka ohere iji gaa ka ha mmiri ozi dị mkpa banyere m nke Bekee kpọrọ 'biometric data'.
Erutere m ụlọọrụ 'Ikeja Passport Office' ka o ji obere oge gafee elekere asatọ nke ụtụtụ.
Ebe niile na-ekwo ka ahịa Ọgbete. Ezutere m ụfọdụ ndị ọrụ ụlọọrụ ahụ n'ọnụụzọ ebe ha nakwụsị ma gbaa ndị chọrọ ịbanye ogige ụlọọrụ ahụ ajụjụ. Ha tụụrụ m aka ebe m kwesịrị ịga maka ihe m biara bụ ebe m kwudoro ndị bu ụzọ, nọrọ eche.
Otu onye ọrụ na-akọọrọ anyị akwụkwo gosiri ihe anyị bịaara. Tupu o rue elekere 10 na ọ kara bụ oge e nyere m, a kporo anyị gbago n'elu ụlọ ebe e nwere ozi nke depụtara nke kporo oku ka ndị mmadụ gbaa onye ọrụ ọbụla nara ngarị ama ka okwu biri.
Ọ bụ ebe ahụ ka a mịtara ozi banyere m, sere foto m nakwa akara aka m, dịka ha ha jụrụ m ụfọdụ ajụjụ gụnyere onye tinyeere m ozi banyere onwe n'ọbaozi ha nke m saara ha na ọ bụ m ji aka m tinye ya.
Ọ bụ ebe ahụ ka ọrụ siriri werere ụlọọrụ ahụ nyụrụ ọkụ ka ọkụ e jiri nkụ udummiri menwuo.

Ọ tụrụ m n'anya na ha nyere m abalị 10 nke ọnwa Mee afọ 2024 dịka ụbọchị m ga-abịa were akwụkwọ asambodo njirimara nwaamala nke m.
Kedụ ihe meziri atụmatụ ọhụrụ inye ndị mmadụ asambodo ha n'izuụka abụọ?
Nnyocha gosiri na ụfọdụ ndị ji 'agent tinye akwụkwọ nwetara akwụkwọ a n'izuụka abụọ maọbụ atọ ha ji mịtacha ozi banyere ha.
Alara m ma lọghachi n'ụlọọrụ ahụ n'ụbọchị e nyere m.
Ezutere m ndị ọrụ n'ọnụụzọ ụlọọrụ ahụ bụ ndị tụziri m aka ebe ọzọ maka ịnata asambodo.
Ka m chechara ogologo oge, onye ọrụ weghachiri akwụkwọ m jiri bịa sị, " Akwụkwo gị adịbeghị."
E dere ya 'AA n'elu n'akwụkwọ ahụ m jiri bịa.
Ajụrụ m ya, kedụ ihe m kwesịrị ime ugbua?' ọ sara m sị, " Kpọtụrụ 'agent rụrụ gị ya'"
"Ejighị m agent ọbụla, ọ bụ m meere ya n'onwe m."
Nwamadị ahu gosiri m ọba aka ya, ma tamuo gawara.
Agwa ya gbara m gharịị, nke mere ka m jụọ ogbo ya nwaanyị m zutere mana ọ sara m n'iwe, "Amaghị m."
Alawara ma na-aga kwa mgbe kwa mgbe ile ọnọdụ akwụkwọ ahụ na websaịt ha iji mata ebe okwu kwụụ mana o nweghị mgbanwe ọbụla m hụrụ.
A laghachiri m azụ ọzọ, a kọwkwaa otu akụkọ ahụ.
Ọ bụ na nke atọ n'ọnwa Jenụwarị ka otu onye ọrụ ha nọ n'orụ m nyere akwụkwọ tiri mkpu ka ọ hụrụ ụbọchị a mịtara ozi banyere ma nye m ntuziaka ka m gaa na ngalaba a kpọrọ 'Servicom' nye mkpesa.
Oge m gara na ngalaba ahụ, ndị ọrụ ihu anaghị atọ ọchị m hụrụ ebe ahụ gwara m na ogbo ha nwaanyị kwesirị ịza m abịaghị ọrụ .
"Bia ụbọchị Frịade," bụ ihe otu n'ime ha gwara m.
Alaghachiri m ụbọchị Monde elu ya , o gwara m weta mbipụta akwụkwọ metụtara akwụkwọ m tinyere ka enye m asambodo ma gwa m na ha ga-akpo m ma ha mechaa.
A bịaghachịrị m n'abalị 12 nke ọnwa Maachị, afọ 2025 ma nata ya bụ akwụkwọ njirimara nke m. Ụbọchị e dere e bipụtara ya bụ abalị 22 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2025!
'Nrụrụaka na ịma mmadụ ka chị ọgbọ'
Dịka m gara ije akwụkwọ nke m hụtaa ihe mere ebe ahụ, otu nwoke ọzọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gara n'ụlọọrụ ha dị n'Ikoyi Passport Office' dịkwa na Legọs dịka ọ gbaliri ugboro ugboro iji intanetị debanye mmasị ya inweta akwụkwọ njirimara nwaamala mana o mịtaghị mkpụrụ.
Lee ihe ọ gabigara dika o siri kọọrọ m ya: "Dịka m na-achọ ịbanye ogige ụlọọrụ ahụ, otu onye ọrụ ha na-eche ọnụama ha jụrụ m ihe m bịaara, m gwa ya na m chọrọ ịgba akwụkwọ njirimara onwe."
"Ọ kpọrọ m gaa n'ebe ọ na-anọ mụ na ya ekwekọrịta ole m ga-akwụ tupu ọ kpọga m na 'cybercafe dị nso maka idebanye aha m."
" Etinyere m akwụkwọ maka akwụkwọ njirimaara nke m n'abalị 30 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2024 ,ma kwụọ N100,000, oge ahụ a na-akwụ N70,000,"
"O kwere m nkwa na ọ ga-apụta n'izuụka atọ mana o were ọnwa anọ."
Ọ kọwara na ọ bụ maka na nwamadị ahụ dara ọrịa mere okwu akwụkwọ ji too ogologo karịa ka e kwere ya na nkwa.
"Idebanye aha na ịmata ozi banyere (biometric capturing) gara siriri werere mana oge o were iji nweta akwụkwo bụụrụ m ihe nnukwu mwute."
"O kwere m ghọta na ọ bụ ka onye immigration debanyere aha m lọtara site na nwa oge o were maka ezumike n'ihi ọrịa laghachiri ọrụ ka e bipụtara akwukwọ m."
"Kemgbe niile m na-aga maka ịnata akwụkwọ m, ndị ogbo ya mere ka o wee m anya na ọ bụrụ na m si n'aka ha, akarala m enwetalarịị akwụkwọ m."
"Nrụrụaka nakwa ịma mmadụ karịrị n'ihe a na-eme."
Ihe ndị ọzọ gabigara

Ebe foto si, NIS/X
Ọ bụghị naanị nwoke a ka a nara aka azụ tupu ọ nata akwụkwọ, ọtụtu ndị mmadụ na-aga bụ ndị a na-amanye ịkwụ ego karịrị ego ole e kwuru.
dị ntọroọbịa abụọ m zutere n'ọnwa Jenụwarị afọ 2025 natara akwụkwọ ha oge m gara ịmata ka eke si anya anwụ n'okwu akwụkwọ nke m kwuru na ha kwụrụ ego karịa ihe gọọmentị na-ana iji nweta akwụkwọ ha.
Otu kwụrụ N75,000 maka ịgabnwe akwụkwọ ya ruo afọ ise.
"Edebanyeghị aha n'intanet. Abịara m ebe hụ otu nnukwu mmadụ bịara ime nke ya, oge receptionist jụrụ, ma mụ na nwoke ahụ eso, m gwara ya ee. Nke a mere ka edebanye aha ma mịtakwa ozi banyere m n'otu ụbọchị, e nwetakwara ya n'izuụka abụọ."
Nwoke nke abụọ gwara m na o nwetara passport afọ 10 n'izuụka abụọ site n'aka ndị ọrụ 'agent'.
"O were m izụụka abụọ, a kwụkwara m N160,000."
Nchọpụta BBC gosiri na ụfọdụ ndị mmadụ na-atụkwasa ihe ruru pasentị 25% maọbụ 30% n'elu ego gọọmentị na-ana iji nweta akwụkwọ njirimara onye e ji eme njem.
Dịka NIS si kwuo n'afọ 2024, ụlọọrụ ahụ nyere passport dị otu nde na ụma asatọ (1.8m) nke a pụtara na ike kwe, ego ruru ijeri naịra 54 banyere n'akpa na-abụghị nke gọọmentị site na ngarị.
Ihe ụlọọrụ NIS sara
Oge BBC kpọtụụrụ ụlọọrụ Nigeria Immigration Service, ọnụ na-ekwuru ha bụ Akinsola Akinlabi kwuru n'ezie na ụlọọrụ ahụ emeela mgbanwe mere ka ụmụ Naijiria nwee ike inweta akwụkwọ ha na-ezuteghị ogbachi ọbụla.
O kwuru na achụọla ndị ọrụ ha na-enye ụlọọrụ ahụ ajọ aha ma rịọ ụmụ Naijiria onye nwere nsogbu ọbụla n'inweta akwụkwọ ka o zitere ha ozi n'akara ha na soshal midia.
"Anyị ewepụtala ụzọ dị iche iche ndị mmadụ ga-eji ezitere anyị ozi, ọ bụrụ na inwetaghị akwụkwọ gị oge i kwesịrị, zitere anyị ozi.?
N'osịsa ajụjụ ihe mkpụrụedemede "AA" nke ụfọdụ ndị ọrụ ha na-ede n'akwukwọ ndị bịara i were akwụkwọ ha pụtara, o kwuru na ọ pụtara "Approved" na Bekee nke gosiri na "e binyela aka" n'akwụkwọ njirimaara ahụ.









