Ụzọ asaa ndị ekperịma nwere ike isi zupu ego gị dị n'ụlọakụ

Igwe ego POS
Nkọwa foto, E nwere ike iji igwe POS mịkọrọ akara mgbape akpaego(pin) gị
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

Na nsonso a, otu onye ejije Nollywood a ma ama bụ Shan George bere akwa mbara ọnụ dịka o na-eti mkpu na soshal midia banyere ihe karịrị nde naịra atọ si n'akpa ego ya n'ụlọakụ milaa dịka ọ kwụrụ mmadụ ụgwọ site n'akpa ego ya n'ụlọakụ.

Na-agbanyeghị na ụlọakụ ya mechara kwụghachi ya ego ahụ, ya bụ ọdachi malitere okwu banyere ụzọ ndị ekperima si e ji igwe ịntanet anapụ ndị mmadụ ego ha gbatara na mbọ.

Otu onye ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa na ịntanet (cybersecurity expert) bụ Peter Obadare kọwara BBC Igbo ụzọ mmadụ nwere ihe isi kwọọ aka tiere ọkụkọ aka n'okwu ohi ịntanet.

Obadare bụ onye hiwere ụlọọrụ 'Digital Encoder Limited' rụtụrụ aka na mgbe ụfọdụ ndị ọrụ ụlọakụ bụ ndị na-etinye aka enwe n'ofe n'ihe metụtara ịkpa aka n'ego mmadụ tinyere n'ụlọakụ.

Ọ sịrị na mgbe ụfọdu, " Ndị ọrụ ụlọakụ nwere atụmatụ ọjọọ nwere ike jiri ohere ha nwere n'ebe akpaego gị dị mee ihe masịrị ha."

Ọzọ, bụ na ndị ekperima nwere ike "itinye ngwa ga-amata ozi dị na kaadị gị n'igwe ATM iji mịta akara Kaadị gị na akara mgbape ya."

Obadare kọwara na nke a na-emekarị na POS maọbụ ATM ebe mmadụ anaghị anọkarị.

Igwe ego 'POS'

3. 'Phishing Scams'

Ndị ekperima intanet nwere ike ịghọgbu gị i nye ha ozi dị mkpa banyere akpaego gị n'ụlọakụ site n'ozi email adigboroja, ozi ekwentị maọbụ ọbaozi websaitị adigboroja.

4. Nje intanet

Dịka Obadare si kọwaa, ' nje ọjọọ intanet Bekee kpọrọ "malware" maọbụ "spyware" nwere ike ị dọrọ ozi dị mkpa maọbụrụ ma ịpịa 'link maọbụ dọbata ozi ọjọọ" n'ekwentị gị maọbụ kọmputa gị.

Ịntanet (wi-fi)ọha
Nkọwa foto, Ọghọm dị na iji intanet(wi-fi) ọha ezipụ ego n'akpaego n'ụlọakụ

5. Ozi dị mkpa maka ndịahịa gbapuo

Ndị ekperima intanet nwere ike inweta ozi metụtara ụlọakụ gị site na mgbapu ozi dị ndịahịa dị na kọmputa ụlọakụ maọbụ nke mgbere ị zụrụ ahịa nke Bekee kpọrọ 'data breaches'.

6. Aghụghọ uche

E nwere usoro ndị ekperima si eji aghụghọ jụputa gị ama n'ire nke na ị ga-enye ha ozi dị mkpa nke gụnyere ime ka ha esi ụlọakụ gị.

7. Netwọk enweghị nchekwa

Iji netwọk e hiwere maka ọha (public wifi ezirita ego maọbụ kwụọ ụgwọ n'ihe ị zụr ụ n'intanet nwere ike ime ka o dịrị ndị ekperima intane mfe inweta ozi dị mkpa banyere gị nke ha nwere ike iji zuo gị ohi.

Etu ị ga-esi ama na nnu aṅaala ofe

Igwe 'ATM'

1. Ihe edoghị gị anya mee

Ọ bụrụ na a kụpụ ego ị maghị maka ya n'akpaego gị.

2. Ekwe ị maghị maka ya kụọ

I nweta ozi maka mgbanwe abụghị nke i mere maọbụ ego abụghị gị wepụrụ

3. I nweghị ike ịkwụli ụgwọ

Ọ bụru na ị chọọ ịkwụ ụgwọ ihe ị zụrụ mana ọ naghị aga aga na-agbanyeghị na i nwere ego zuru n'akpaego gị.

4. Nsogbu ịgbape akpaego gị

Inwe nsogbu ịgbape akpaego gị maọbụ nweta ozi na a kpapere ya na nsonso a maọb u na-agbanwere akara mgbape gị Inweta ozi site n'ụlọakụ

Inweta akwụkwọozi, oku ekwentị maọbụ email site n'aka ụlọakụ nke na-ekwu banyere ije edoghị anya na-aga n'akpaego gị n'ụlọakụ.

6. Mgbanwe ozi etu e si enweta gị

Ị nweta ozi na-ekwu na a gbanwere ozi banyere etu e si enweta gị dịka akara ekwentị , ebe i bi nakwa nakwa email gị, na abụghị gị si ka e mee nke a.

7. Ego na-efu efu

Ọ bụru na ego fọrọ n'akpaego gị pekarịa ihe ọ kwesịri ịbụ na-enweghị nkọwa ihe butere nke a.

Ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a wakporo akpaego gị n'ụlọakụ

Ogige ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

1. Tie mkpu ozigbo

Tie mkpu mkpesa tigara ụlọakụ gị ozigbo ị chọpụtara na a kpara ego gị aka

2. Kpochie akpaego gị

Gbalie gbachie akpaego gị nwa mgbe nta ka ọzọ ghara ime.

3. Gbanwee akara mgbape gị

Ọ dị mkpa ịgbanwe akara mgbape(password) akpaego gị nakwa nke email iji mepe akpaego ahụ n'ụlọakụ.

4. Nye mkpesa

Weghara ndị uweojii mkpesa maka mpụ ego e mere gị ma zigaraea ngalaba n'ahụ maka mpụ ego ozi.

5. Leruo ozi 'ka o si aga' nke akpaego gị anya

Nyochaa ego batara maọbụ pụọ n'akpaego gị ma nye mkpesa ma ị chọpụta ihe adịghị ka o kwesịrị ịdị.

6. Anya gị dị n'ego nna-abata

Anya gị ruo n'ego na-abata iji mata ma o nwere mgbanwe maọbụ ihe ọhụrụ ọbụla.

7. Chọọ ndụmọdụ onye ọkaiwu

Ị chọ enyemak ọkaiwu dị mkpa ọkachasị ma ọ bụrụ na ọ bụ akatamkpo ego ka e zupuru n'akpaego gị n'ụlọakụ

Ụzọ ị ga-esi chekwaa akpaego gị n'ụlọakụ

Ụzọ e si akwụ ụgwọ n'intanet

Ebe foto si, Getty Images

Eleke mụta e fewe e beghị ebe, dinta amụta, atụghị atụ, a gbaa. Dịka ndị ọkachamara n'okwu nchekwa intanet si kwuo, e nwegara ụzọ mmadụ ga-esi akpachi akpaego ya n'ụlọakụ ka aka ndị ọchọnganoko ghara irutụ ya.

Dịka Ọkammụta Obadare si kwuo, ụzọ ndị a gụnyere:

1. Inwe akara mgbape siri ike

Ọ sịrị, "Were akara mgbape tara akpụ akpọpe akpaego gị ma na-agbanwe ya kwa mgbe kwa mgbe."

2. Ụzọ abụọ n'ime otu mgbape

Nwee usoro ụzọ abụọ n'ime otu mgbape nke Bekee kpọrọ , "two-factor authentication*. Obadare sịrị, " Nke a ga-atụkwasa nchekwa n'elu nchekwa ego gị."

3.Jiri naani netwọk nwere ezi nchekwa

Naani intanet were anya na o nwere nchewa bụ ihe kacha mma ime ihe gbasara izipụ ego n'akpaego gị.

Ọ sịrị, " Gbara ime ihe ego n'elu intanet ọha. Ọ dị gị nnukwu mkpa were VPN mee ihe ị chọrọ ime."

Peter Obadare bụ onye nwe ụlọọrụ 'Digital Encoder Limited'

Ebe foto si, Peter Obadare

Nkọwa foto, Peter Obadare bụ onye nwe ụlọọrụ 'Digital Encoder Limited' rụtụrụ aka na mgbe ụfọdụ ndị ọrụ ụlọakụ bụ ndị na-etinye aka enwe n'ofe n'ihe metụtara ịkpara ego ndị mmadụ tinyere n'ụlọakụ

4. Nlekọta mgbe nile

Anya gị na uche gị na-adị n'ihe na-eme n'akpaego gị mgbe ọbụla.

Mgbe abụla mgbe na-ele anya n'ihe n'aga na akpaego gị. Ị nọkata jụọ ma na-ta akwụkwọ ozi sgosiri ihe na-aga n'akpaego gị n'aka ụlọakụ gị."

5. Tinye usoro ekwe ọkụkụ

Tinye usoro ego gafee ego ole dị aghaa n'akpaego gị, ekwe kụwa(alert setting.)

6. Anya saa maka ozi wuruwuru

Kpachapụ anya gị maka ozi ọbụla na-ajụ gị maka ihe metụtara gị onwe gị dịka akara mgbape akpa gị, oge a mụrụ gị maọbụ aha nne gị.

7. Gbaa mbọ na-adọrọ ngwa intanet ọhụrụ nke ekwentị/kọmpụta gị

Hụ na ekwentị gị maọbụ 'laptop' gị nwetara nchekwa ọhụrụ ọbụla ndị rụrụ ya wepụtara iji chekwaa ihe ndị a ka nje ịntanet ghara ịba ya.