Cybersecurity Levy: Ihe i kwesịrị ịma banyere ụtụ ọhụrụ a

Ebe foto si, Getty Images
Ụbọchị Mọnde Abalị isii nke ọnwa Mee, afọ 2024, Ụlọakụ Etiti Naịjirịa bụ Central Bank of Nigeria (CBN), nyere iwu ka ụlọakụ malite ịna ụtụ nchekwa ịntanetị na azụmahịa nke ha kpọrọ, 'cyber security levy' na Bekee.
Akwụkwọ ozi sitere na CBN gara n'ihu kpughee na mmejuputa ọkwa a ga-amalite n'ime izu abụọ (Mee 20,2024).
Kemgbe ahụ, okwu ahụ kpalitere iwe ọtụtụ ụmụ Naijiria.
Otu jịkọrọ ndị ọrụ Naijiria bụ Nigeria Labour Congress(NLC) kwuru sị, “Anyị na-ahụ ụtụ a dịka nkata ndị na-achị achị chọrọ iji gaa n'ihu na ịkapụ ndị ọrụ na ọha ụmụ Naijiria enweghị ka ọ ha ha, ego."
N'otu aka ahụ, otu jikọrọ ụmụakwụkwọ mahadum bụ 'National Association of Nigerian Students, (NANS), katọrọ ya rịọ Onyeisiala Bola Tinubu ka ọ kagbuo iwu ahụ na-egbughị oge, si na "ọ ga-emeka ka ụkọ ego ụmụ Naijiria na-agabiga kawanye njọ".
Ọzọ, ọ kpalikwara mgbagwoju anya nke mere ka ọtụtụ na-ajụ ajụjụ dị iche iche maka ya bụ atụmatụ nke gụnyere:
Gịnị ka okwu a pụtara? Kedu etu e si amata ụgwọ nchekwa 'cyber' nke a na-ana emume ego ị na-eme?
Nke mbụ, ọ dị mkpa ị mara na 0.5% bụ 0.005 (nke bụ ọkara otu pasent). 0.005 bụ ihe nnọchianya nke 0.5%.

Ebe foto si, Getty
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'ihi ya, nke a gụnyere na CBN ga-ewepụ 0.5% mgbe ọ bụla i mere emume ego n'akpaego gị n'ụlọakụ gị site n'usoro ntuziaka e nyere.
Dịka ọmụmaatụ: Ọ bụrụ na onye nwere ego n'akpaego ya n'ụlọakụ chọrọ iziga ego ruru N10,000, dịka ntuziaka CBN ọhụrụ ahụ, a ga-enwere N50 maka ụtụ nchekwa ịntanet.
Nke dị iche na ụgwọ ụlọakụ ma ọ bụ ụgwọ ọ bụla ọzọ a na-enwere gbasara iziga ma ọ bụ itinye ego n'ụlọakụ dịka VAT na ndị ọzọ.
Lee ihe 16 CBN kwuru na iwu ọhụrụ ego nchekwa intantent agaghị emetụta:
1. Nkwụnye ego mbite na nkwụghachi ego mbite
2.Ịkwụ ụgwọ ọnwa
3. Itinyerita akaego ego n'ime otu ụlọakụ maọbụ n'etiti ụlọakụ dị iche iche nke otu onye nwe
4. Izirita ego n'etiti ndị nwere otu ụlọakụ
5. Ndị ụlọọrụ metụtara ego inye ụlọakụ ha ntụziaka metụtara ego
6. Ntinye ego n’etiti ụlọakụ na ibe ya
7. Ndị ụlọakụ iziga ego n’Ụlọakụ Etiti(CBN)
8.Alaka ụlọakụ isiga ego na ala ọzọ n’otu ụlọakụ ahụ
9. Ihe gbasara akwụkwọ cheque
10. Akwụkwọ ozi nke kredit (Letters of credits)
11. Ego metụtara ụlọakụ ịkwalite ịbụ nnukwu ụlọakụ(bank re-capitalisation funding)
12. Ego edokwara edokwa(savings) na-ego etinyere maka ịzụ itinye ego ogologo a kpọrọ 'Treasury Bills, na commercial papers’ na Bekee.
13. Ego metụtara atụmatụ gọọmentị inyere ndụ aka (ịgwụ ụgwọ ezumike nka)
14. Ego a na-akwụnyere ụlọọrụ abụghị nke gọọmentị maọbụ ụlọọrụ ebere
15.Ịkwụ metụtara agụmakwụkwọ: gụnyere; ụgwọ ụlọakwụkwọ, mahadum maọbụ ụlọ mmụta ndị ọzọ.
16. Azụmahịa metụtara akpaego ụlọakụ inwere n’ime ụlọ ya dịka akpaego, akpego mkpata na ọghọm, ikpaego n’etiti ụlọakụ na ibe ya na ‘escrow’ wdg.











