Gọvanọ Mbah ehiwela atụmatụ a ga-eji kpochapụ ndị omekoome n’Uzo Uwani

Gọvanọ Mbah na ndị so ya arụ ọrụ gara Uzo Uwani

Ebe foto si, ENUGU STATE GOVERNMENT

Ndị ọrụ nchekwa anwụchiela ndị omekoome bu ngwaọgụ dị iche iche n’ụfọdụ okeọhịa dị n’Uzo Uwani nke Enugwu steeti.

Nke a na-abịa dịka aka na-achị Enugwu steeti bụ Peter Mbah gbapere atụmatụ a ga-eji kpochapụ ndị omekoome n’okpuruọchịchị Uzo Uwani iji kwalite nchekwa mmadụ ndị bi ebe ahụ.

Mbah kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde 7 Mee 2024 n’oge ọ gara njem mberede n’Adani na Igga dịcha n’okpuruọchịchị Uzo Uwani.

Ọ dọrọ ndị obodo ahụ aka na ntị ka ha wepụ aka n’ịchọ enyemaka nke onwe ma dọọ aka na ntị na onye ọbụla maọbụ otu ọbụla kpalitere ọgbaaghara maọbụ kwalite ịchọ enyemaka nke onwe ka a ga-enye ntaramaahụhụ dịka ọ dị n’iwu Naịjirịa.

Mbah kpọrọ oku ka e nwee udo n’etiti obodo ndị na-ebukọrịta onwe ha agha ma kwuo na ya enyela nwunye na ụmụ ndị ọrụ nchekwa e gburu n’oge mwakpo e mere n’Ada Rice Farm n’ụbọchị Fraịde ohere ọrụ na agụmaakwụkwọ n’efu.

Lee Ebe niile e nwerela nsogbu nchekwa n'Enugwu na nso nso a

Gọvanọ Peter Mba na ndị so ya arụ ọrụ

Ebe foto si, ENUGU STATE GOVERNMENT

Ezeagu: Ihe onyonyo e kesara na soshal midịa ụbọchị Wenezde Mee 1 afọ 2024 gosiri otu nwoke ọbara juru ihu ya na-akọwa ka ndị na achị ehi si wakpo ya nwere mma gbukasia ya ahụ na obodo Olo nke dị na Ezeagu, Enugwu steeti.

Ọ kpọrọ oku ka ndị ọchịchị gbata oso enyemaka. Ka ọ dị ugbu a, enwebeghi ihe ndị uweojii kwuru banyere ya.

Ụzọ Eke-Egede: Eprel 22 afọ 2024, otu nwaanyị ndị ntoo jidere ya na ụmụ aka ya abụọ mụrụ nwa n'ọdọ ndị ahụ tọrọ ya na Egede, okpuru ọchịchị Ụdị dị n'Enugwu steeti.

Di nwaanyị ahụ kwuru ụgwọ mgbapụta ruru nde 1.6 ị ji gbapụta nwunye ya na ụmụ ya a.

Ụzọ Mvene/Ụdị: Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị ana amaghị egbuola ọtụtụ ndị mmadụ na Mvene dị n'ụzọ si Akegbe-Ugwu gawa Udi.

Ndị bi na mpaghara ahụ mere ka anyị mara na ndị ahụ a na amaghị na-esi n'ime ohia pụta wee tọrọ ma gbuo ndị na-eme njem.

Afọ itoolu ka ndị ọchị wakporo Nimbo, ha awakpokwala ha ọzọ, gọvanọ Enugwu kwuru na o zuola

Gọvanọ Peter Mbah na ndị ọ gara ịhụ

Ebe foto si, Enugu state Government

Aka na-achị Enugwu steeti agaala mgbaru n'obodo Nimbo dị n'Uzo Uwani na steeti ahụ ebe ndị echeere bụ ndị ọchịehi gburu mmadụ anọ.

Ọ kwere nkwa na gọọmentị ya ga-esi imi n'ala n'ịchọta ndị ahụ kpara mkpa mkpa a.

"Oge ndị be anyị ji amụ anya ehi ụra abịala na njedebe" ka o kwuru dịka ọ foro ntutu taa na a ga-achọpụta ma nwụchie ndị ahụ.

"A na m ekwe nkwa na anyị ga-eji ihe niile dị anyị n'aka ịhụ na anyị chekwara unu" bụkwa ihe ọzọ o kwuru mgbe ọ gara ịhụ ndị obodo ahụ.

O tiri ezinaụlọ ndị nwụrụ aka n'obi ma nwekwaa mkparịtaụka ya na ndị isi obodo ahụ gbasara ịchekwa ha.

Ihe ọzọ si na njem Gọvanọ Mbah na Nimbo pụta bụ na a ga-akwụrụ ndị niile merụrụ ahụ ụgwọ ụlọọgwụ.

Ezinaụlọ ebe ndị nna nwụrụ ka o nyekwara onyinye ịgụ akwụkwọ na-efu.

Peter Mbah na ndị obodo ahụ

Ebe foto si, Enugu State Government

Etu obodo Nimbo n'Ụzọ Ụwani si tọgbọ chakoo maka mwakpo ndị echeere bụ ndị ọchịehi

Aha onyonyo, Etu obodo Nimbo n'Ụzọ Ụwani si tọgbọ chakoo maka mwakpo ndị echeere bụ ndị ọchịehi

Obodo Ugwuijoro dị na Nimbo n'okpuru ọchịchị Uzo-Uwani n'Enugwu steeti abaala n'iru uju na anya mmiri ka ndị e kwuru bụ ndị ọchịehi wakporo obodo ahụ na mgbede ụbọchị ụka abalị 28 ọnwa Eprel.

BBC Igbo chọpụtara na ọtụtụ ndị Nimbo agbapụla ọsọ n'ụlọ ha ugbua n’ihi mwakpo ahụ e kwuru tara isi mmadụ anọ.

Otu onye BBC gbara ajụjụ bụ onye Nimbo bụ Dọkinta Ajogu kọọrọ BBC na mwakpo ahụ mere ebe a na-eme akwamozu.

“Ọ bụ ebe a na-eme akwamozu ka ndị ọchịehi ahụ biara were egbe na mma wakpoo ndị be anyi na mberede”.

Ndị bịara akwamozu na Nimbo, Uzo-Uwani gbara ọsọ ndụ, dika ndị ọchụ-ehi wakporo ma gbuo mmadụ anọ.

Ebe foto si, Dr. Ajogu

Nkọwa foto, Ndị bịara akwamozu na Nimbo, Uzo-Uwani gbara ọsọ ndụ, dika ndị ọchụ-ehi wakporo ma gbuo mmadụ anọ.
Obodo Nimbo, Uzo-Uwani LGA, Enugwu Steeti.

Ebe foto si, maps Research gate

Nkọwa foto, Obodo Nimbo, Uzo-Uwani LGA, Enugwu Steeti.

“Tupu anyị aghọta ihe na-eme, ndị omekome ahụ ewerela egbe na mma gbuo mmadụ anọ ma bekasịa ozu ha."

Ajogu bụ dokinta Bekee rịọrọ onyeisi gọọmenti Enugwu steeti bụ Peter Mbah ka o nyere ha aka 'kpochapụ' ndị na-awakpo ha.

Dịka o siri kwuo, ndị e gburu egbu gụnyere, Okeh Simon, Okeh Chukwuebuka, Gabriel Ezea na Julius Odiegwu.

Ndị bịara akwamozu na Nimbo, Uzo-Uwani gbara ọsọ ndụ, dika ndị ọchụ-ehi wakporo ma gbuo mmadụ anọ.

Ebe foto si, Dr. Ajogu

Nkọwa foto, Ndị bịara akwamozu na Nimbo, Uzo-Uwani gbara ọsọ ndụ, dika ndị ọchụ-ehi wakporo ma gbuo mmadụ anọ.

Cheta na ọ bụ n'afọ 2016 ka ndị ọchịehi wakpokwara otu obodo Nimbo ahụ ma gbuo ihe ruru mmadu 11 nn'oge ọchịchị Ifeanyi Ugwuanyi.

Ka ọ dị ugbua e burula ozu ndị nwụrụ anwụ ga donye n’ụlọ ozu.

Ndị uweojii Enugwu steeti ekwubeghi ihe ọbụla maka ihe mere dịka ha azabeghi ekwentị maọbụ ozi ezigara ha gbasara ihe mere.

Ihe ndị uwoejii kwuru

Kọmishọna uweojii n'Enugwu nyere ndị ọrụ ya iwu ka ha jide ndị gburu mmadụ anọ ahụ na Nimbo.

Dịka ụzụ akwa ka na-ada na Ugwuijoro Nimbo Enugwu steeti maka ogbugbu egburu mmadụ anọ, Kọmoshọna Uweojii bụ Kanayọ Uzuegbu aṅụọla iyi na aka ndị iweojii ga-akpara ndị omekome ahụ.

Kọmishọna Uzuegbu kwuputara nkea oge osoro Gọvanọ Peter Mbah gaa mgbaru na ya bụ obodo.

Ozi ahụ o wepụtara kọwara na ndị a na enyo enyo na ọbụ ha kpara arụ ahụ bụ ndị Ọchụ Ehi si na ime ọhịa wakpoo ndị Nimbo na emw akwamozu ma jiti egbe na mma gbuo mmadụ anọ.

O kwuru na ha eguzobela otu ndị uwe ojii isi kara aka nke ya onwe ya nọ n’ime ya, ka ha waa ọhịa na ụzọ, tinye anya na mmiri wee nwude ndị ojọọ ahụ.

Ọ rịọrọ ndị Ugwuijoro, Nimbo nakwa okpuru ọchịchị Uzo-Uwani niile ka ha nye ndị ọrụ ya nkwado zuru oke iji chọpụta ma jide ndị ahụ.

Akara ekwe ntị ha wepụtara la ọha na eze were kpọọ ma tụpenye ha azụ maka ndị omekome ahụ bụ