Ndị ohi ịntanetị mba Nọt Korịa zuru ego 'crypto' ruru nde $400

Onye uweojii Naijirịa

Ndị uweojii Naijirịa anwụchiela mmadụ anọ ha na-ebo ebubo iri anụ mmadụ ma na ere kwa ya na Zamfara steeti.

Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Ayuba Elkanah gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ dimkpa abụọ na ụmụ ntakịrị nwoke abụọ ka ha jidere maka ihe a mere.

Elkanah kwuru sị, "Ọ bụ n'ụlọ arụchabeghị ka anyị hụrụ ozu a".

O kọwara na mgbe ha hụrụ ya bụ ozu na ụfọdụ akụku ahụ ya adịghị.

O kwuru sị, " Ọ bụ mgbe anyị na-achọ nwata nwoke gbara afọ itolu achọ ka ndị uweojii chọpụtara ozu ahụ".

Elkanah kwuru na onyeisi ndị omekome ahụ kwụrụ ha puku narị naịra ise dịka ụgwọ maka akụkụ ahụ ndị mmadụ.

Zamfara bụ steeti mkpamkpa na-arị ibe ya elu nke gụnyere ogbugbu mmadụ na ịtọ mmadụ na-enye nsogbu ugbua.

Ndị ohi ịntanetị mba Nọt Korịa zuru ego 'crypto' ruru nde $400

Aka na-apị Kọmpụta

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọọrụ Chainalysis e ji teknuzu 'Blockchain' mara kwuru na afọ 2020 na 2021 bụ afọ ndị na-ezu ohi na ịntanetị kacha zute ego.

Ha kwuru sị,"Site n'afọ 2020 ruo 2021, ohi ezuru na ịntanetị nke aka ndị mba Nọt Korịa nọ ya sitere na paseenti anọ ruo paseenti asaa. nke a pụtara na ego ha zutere ji passenti iri anọ gbago".

Chinalysis kwuru na ụzọ ndị a si ezu ohi 'Crypto' bụ 'Phishing', 'Code' adịgboroja na 'Software' eji awakpo igwe kọmpụta mmadụ.

Nọt Korịa na-ekwu na ụkwụ na aka ha adịghị n'ihe ọbụla gbasara ohi Intanetị.

Mba Ọstralịa akagbuola akwụkwọ njem Novak Djokovic ọzọ

Novak Djokovic

Ebe foto si, Empics

Mba Ọstralịa akagbuola ọpịa Tenis bụ Novak Djokovic ịbata mba ha nke ugboro abụọ.

Mịnịsta na-ahụ maka ndị njem na Ostralịa bụ Alex Hawke kwuru sị, " Taa, ejị m ikikere m kagbuo akwụkwọ njem Mazị Novak Djokovic. nkagbuoa gbadoro ụkwụ n'ahụike na ọdịmma ndị mmadụ".

Djokovic onye kwesịrị iso n'asọmpị Australian Open ga-ebido n'ụbọchị Mọnde nwere ohere ịga ụlọikpe maka mkpebi a.

Cheta na o kwuru na ọ ma na ọ dara iwu nchekwa ọrịa Covid-19 mba ahụ dịka ọgbabeghi ọgwụ mgbochi ya bụ ọrịa.