Zamfara Kidnappings: A tọrọla ụmụakwụkwọ 15 ọzọ na Zamfara steeti

Úlóakwúkwó ahú

Ebe foto si, College of Agricultural and Animal science Bakura

Ndị ọrụ nchekwa na mpaghara ugwu Naịjirịa ekwuola na ndị omekome wakporo Mahadum anụmanụ na ọrụ ugbo dị na Zamfara steeti.

Osote onyeisi na Mahadum ahụ kwuru na agbagburu ndị nchekwa anọ ma tọrọ mmadụ iri na itoolu na mwakpo ahụ mere n'abalị ụbọchị ụka.

Mmadụ iri na ise n'ime ha bụ ụmụakwụkwọ ebe mmadụ anọ ndị ọzọ bụ ezinaụlọ otu onye nkuzi n'ebe ahụ.

Ha kwukwara na ndị omekome ahụ bu otutu ọgbatumtum ma na-agbali egbe elu mgbe ha batara n'ebe ahụ.

Mwakpo bụ nke kachasị me nsonso a na ntọ a na-eme ụmụakwụkwọ na mpaghara ugwu Naịjirịa kemgbe ọnwa Disemba afọ 2020.

Cheta na ụmụakwụkwọ a tọọrọ ka nọ n'aka ndị ntọ gụnyere otu narị e si na Niger steeti tọrọ nakwa iri kwuru iri atọọrọ n'ụlọakwụkwọ Baptist dị na Kaduna n'ọnwa Jụlaị.

Akụkọ ka na-abịa