Onye bụ Rabi Ibrahim Shinkafi gbahapụrụ ọrụ gọọmentị ya na Zamfara bịa were ọkwa oche n'Imo steeti?

Hajia Rabi Ibrahim Shinkafi

Ebe foto si, Hajia Rabi Shinkafi/Facebook

Rabi Ibrahim Shinkafi nọbụ n'ọkwa dịka kọmịshọna na-ahụ maka ụmụ nwaanyị na ụmụaka na Zamfara steeti tupu ọ gba arụkwaghi m n'ọkwa ahụ.

Tupu o nata ọkwa oche kọmishọna na steetị ahụ, ọ rụrụ ọrụ dịka onye nlekọta nwalite ụmụnwaayị na Zamfara steeti.

Ugbua, ọ nara ọkwa ọrụ gọọmentị ọhụrụ n'aka gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma.

Ihe ndị ị kwesiri ima maka Rabi Ibrahim

Nwaada Shinkafi gwara ndị ụlọọrụ ntaakụkọ Tambari na ọ bụ nwa Stephen Aruwuonye bụ onye si okporoọchịchị Uguata di n'Imo steeti.

Na mkparịtaụka ahụ o kwukwara na amụrụ ya na Birni Kebbi ebe onye zụrụ ya bụ otu Eze odinala ebe ahụ bụ Sarkin Shanun Gwandu.

N'afọ 2017 Emir Shinkafi ALH. Muhammad Makwashe Isah chiri ya echịchị dịka Adaeze n'aha pụrụiche bụ Gimbiyar Shinkafi .

Nwaada Shinkafi a lụọla di, aha di ya bụ Ibrahim Bakon Gwaggo.

Nwaada Shinkafi gbara n'anwụ ihe mere o ji hapụ ọkwa ahụ enyere ya Zamfara gawa ọkwa oche ọzọ n'Imo steeti. N'okwu ya o kwuru:

"Agbaghi arụkwaghị m n'ọrụ m maka esom okwu ọ bụla, a hapụrụ m ọrụ m n'ihe na ọ bụ ebumnobi ka nara ma nwalee ọrụ ọzọ n'Imo steeti"

O kwukwara "E ji m ohere a ekele Gọvanọ steetị ahụ bụ Bello Matawalle na nwunye ya bụ Hajiya Aisha Matawalle maka ohere inye m ọkwa ọchịchị na steeti ahụ nakwa etu ha si kpasa m agwa ọma oge m nọ n'ọkwa ọche ahụ"

"Ndị na-ebughari akụkọ na achọrọ m n'orụ maka nsogbu maọbụ esomokwu na-ako akụkọ ugha"

Na ngwụcha o kwuru: Mụ na gọvanọ Zamfara steeti ka dị na mma, mụ na nwunye ya ka dị na mma, ha bụ ndị agbata obi m.

Tupu m agba arụkwaghi m, Gọvanọ Matawalle na Gọvano Hope Uzodinma nwere mkparịtaụka banyere atụmatụ a"

Cheta na o nwere mgbe o zipụtaburu ozi n'afọ 2019 na-ekwu na enyeghi ya oche azụ n'ọrụ ya na Zamfara steeti dịka akụkọ feghariri mgbe ahụ si kwuo. Site na ihe ndị o na-ede n'akara soshal midia ya, ahụrụ na n'ezie ya na gọvanọ Hope Uzodinma dị na mma dịka mgbe e mere ọtụtụ mwakpoo n'Imo steeti, o zigara gọvanọ Uzodinma ozi dee: "Nwanna m nwoke, bụ gọvanọ Hope, Ekele m gị.

Obi adighi m mma maka etu ihe si aga ugbua na steeti gị ọkachasi ka e si wakpoo obodo Omuma. Mụ na nnam bụ Eze Stephen Aruwuonye na-ejịkọ aka ọnụ akatọọ ihe mere".