Cybersecurity Tips: Etu ị ga-esi gbanahụ 'hacking' n'ịntanetị

Aha onyonyo, Etu ị ga-esi ama na ndị ohi ịntanetị awakpoola ekwenti gị
Cybersecurity Tips: Etu ị ga-esi gbanahụ 'hacking' n'ịntanetị

Ụmụ mmadụ, ee, gịnwa, na-abụkarị ụzọ kachasị mfe ndị omempụ ịntaneti na-esi abanye n’ekwenti na kọmputa gị.

Tupu i kwechiri na ọ bụghị eziokwu, jụọ onwe gị: "Akaụntụ ole n'ịntanetị ka m na-eji otu paswọọdụ abanye? Ugboro ole ka m pịrị link n’email m na-amaghị n'ezie onye zitere ya? Ana m agụ usoro ‘terms and conditions’ ụfọdụ webụsaịt na-enye tupu m pịa ‘ee’?"

Onye ji ekwe nti

Ụfọdụ ihe iribaama ị ga-eji ama na ndị omempụ ịntaneti abanyela n’akaụntụ gị maọbụ ịntaneti gị:

Nke mbụ.

Inwete ọtụtụ ozi ‘pop-up’ ga-agbapụta n’ekwenti gị site n’ụlọọrụ ndị na-enye gị ihe ndị ị na-ajụbeghị maka ya.

Nke abụọ Ọ bụrụ na kọmputa gị malite ịkpụ akpụ.

Nke atọ

I bido hụwa ụfọdụ 'application' ị na-ejighi aka gị tinye n’ekwenti maọbụ kọmputa gị.

Nke anọ ka njọ bụ na Ọ bụrụ na ego pụọ n’ọbaego gị.

Onye na-abanye n'akaụntụ mmadụ

Kedụ etu ị ga-esi kwụsị ime ihe ndị na-eme ka ị dabanye n'aka ndị omempụ n’ịntaneti?

Nke mbụ:

Gbaa mbọ hụ na paswọọdụ gị adịghị mfe ịkọtali. Passwọọdụ “12345”, “password”, “iloveyou”, “welcome” adịghị mma ma ncha. Nwata dị afọ abụọ nwereike ịkọtali nke a.

Gbalịa hụ na passwọọdụ gị toro ogologo, nwee mgbakọta mkpụrụ edemede, akara na ọnụọgụgụ.

Agwakwala ya onye ọbụla ma hụkwa na i ji passwọọdụ dị iche na webụsịt ọbụla ị banyere.

I nwekwara ike iji atụmatụ ‘two-factor authentication’ chekwaa akaụntụ gị.

Nke abụọ:

Ekwela ka mmadụ ghọrịa gị ka ị kwụọ kịrịkịrị ego maọbụ debanye ihe nzuzo akaụntụ gị maka ihe na-ekwesịghị ikwụ maọbụ ihe na-enweghi isi site n’ozi e zitere gị na email.

Nke a nwereike ịbụ ohere e nwereike iji wakpoo ọbaego gị site n’akara ị pịnyere na webụsaịt ha.

Nke atọ:

Kpachara anya gị maka ndị ga-akpọ gị n’ekwentị sị na ha si n’ụlọọrụ maọbụ ụlọakụ gị. Nke a bụ ụzọ ama ama nke ndị omempụ ji ezu ego ndị mmadụ.

Ha nwereike ịsị na ị ritela ego maọbụ na e nwere ihe ha chọrọ ịhazi n’ọbaego gị.

Kpachara anya ma hụ na i zipughi akara nzuzo gị maọbụ ihe njirimara gị a ga-eji ezu gị ohi.

Ọ bụrụ na ị na-enyo ha dịka ndị aghụghọ, gwa ha na “ama m na ndị aghụghọ ji ụzọ a egwu ndị mmadụ chandum. Aga m agwa ndị ọrụ nchekwa maka akara gị. Akpọkwala m ọzọ.”

Ị gwa ha na ị ma maka ha, ha agaghị akpọzi gị ọzọ.

Nke anọ:

Kpachara anya maka email nakwa ozi ederede ekwenti na-ekwu na o si n’ụlọọrụ ziri ezi, na-arịọ gị ka ị pịa link wee tinye ihe dị mkpa zoro ezo maka gị.

Kwụsị ma ọ bụrụ na ị nweta ozi a ma lelee ma ọ bụ eziokwu.

Ịjụ onye otu ezinụlọ ma ọ bụ enyi bara uru nke ukwuu.

Gbalịa lebanye anya n’akara email maọbụ ozi ị nwetere. Ị nwereike ịchọpụta ozugbo maọbụ nke ziri ezi maọbụ nke na-ezighi ezi.

Nke ise

Nyochaa ọfụma ihe ị na-ekwenye na ya mgbe ọbụla ị pịrị ‘ee’ na usoro dịara webụsaịt ọbụla maọbụ application ọbụla.

Ụfọdụ oge, ụfọdụ webụsaịt na application na-edebanye ikikere ibanye na soshal midia gị maọbụ iwere ọtụtụ ihe zoro ezo n’ekwenti gị.

Ya bụ gbalịa hụ na ị lebanyere anya n'ụdịrị webụsaịt ị na-aga maọbụ guọ usoro iwu dịịra webụsịt ahụ tupu i kwenye na ya.

Ọ bụ n’ezie na e nweghị ụzọ kpọmkwem iji chekwaa igwe ịntanetị gị, kama ụfọdụ ihe ndị a nwereike igbochi ohere ndị omempụ ịbanye na ya.

Kedu ihe ị ga-ebu ụzọ mee ma ọ bụrụ na ị chere na a wakpoola gị? Gwa anyị na kọmenti.

Onye mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo