Charly Boy asaala gọọmenti Legọs maka ịgbanwe aha 'bus stop' burula aha ya

Aha onyonyo, Enweghị uru ọbụla ịgbanwe aha 'bus stop' ga-abara Naịjirịa - Charly Boy
Charly Boy asaala gọọmenti Legọs maka ịgbanwe aha 'bus stop' burula aha ya
Charly Boy asaala mgbanwe aha 'bus stop' aha ya
Nkọwa foto, Charles Chukwuemeka Oputa a maa dịka Charly Boy bụ ọgụụ egwu na onye na-alụọgụ ikikere dịịrị onye
    • Onye dere ya, Adline Okere, Michael Ngene, Donald Wogu
    • Ebeg o si, Legọs

Charles Oputa a ma dịka Charly Boy akatọọla mgbanwe gọọmenti Legọs Steeti gbanwere 'Charly Boy bus stop' dị na mpaghara gbagada steeti ahụ ma kwuo na enweghị uru ọbụla mgbanwe ahụ ga-abara Naịjirịa.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Charly Boy kwuru na ihe ndị ọchịchị kwesịrị ị na-ekwu maka ya bụ ichepụta atụmatụ ga-eme ka ọnọdụ obibi ụmụafọ Naịjirịa dị mma.

N'okwu ya "Ihe mbụ m mere oge m nụrụ na a gbanwere aha odo ụgbọala 'bus stop' bụ ịchị ọchị, onye gwara ndị ọchịchị na ọ bụ ịgbanwe aha ga-eme ka obodo dị mma"?

Charly Boy gara n'ihu rụtụ aka n'ihe na-ebute okwu nkewa oge ọbụla Naịjirịa na-akwado ime ntuliaka.

Ọ kpọrọ oku ka ndị ntorobịa Naịjirịa kee ajị n'ume na ntuliaka afọ 2027 iji hụ na e nwere mgbanwe na Naịjirịa.

Ụlọmgbasaozi BBC News Igbo amalitela ịgbasa ozi n'ọbaozi WhatsApp Channelụ
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Foto Charly Boy

Ebe foto si, AreaFada1/X

Nkọwa foto, Charles Chukwuemeka Oputa a maa dịka Charly Boy