Ụgwọ ọkụ latrik anyị na-akwụ n'Aba karịrị akarị - Ndị bi n'Aba

Aha onyonyo, Ọnọdụ ọkụ latrik n'Aba agbanweela mana ụgwọ ọkụ karịrị akarị - Ndị bi n'Aba
Ụgwọ ọkụ latrik anyị na-akwụ n'Aba karịrị akarị - Ndị bi n'Aba
Ụgwọ ọkụ latrik anyị na-akwụ n'Aba karịrị akarị - Ndị bi n'Aba
Nkọwa foto, Ọnọdụ ọkụ latrik n'Aba agbanweela mana ụgwọ ọkụ karịrị akarị - Ndị bi n'Aba
    • Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Legọs

Ọnọdụ ọkụ latrik n'ụfọdụ mpaghara dị n'Aba, obodo e ji azụmaahịa na ịrụpụta ọtụtụ ihe were mara, agbanweela kemgbe ụlọọrụ Geometric Power Plant, na-arụpụta ọkụ latrik n'Aba na ụlọọrụ Aba Power na-ekesa ọkụ latrik n'Aba jiri malite ọrụ n'afọ gara aga, dịka ndị bi n'Aba siri kwuo.

Ndị bi n'Aba ụlọmgbasa ozi BBC gbara ajụjụ ọnụ iji chọpụta ọnọdụ nkesa ọkụ latrik n'obodo ahụ ugbua, kwuru na nkesa ọkụ latrik akatụla mma n'ebe ụfọdụ, mana o nwekwara ụfọdụ ebe ndị ọzọ nkesa ọkụ latrik ha adịbeghị mma.

Mana otu mkpesa mmadụ niile kpụ n'ọnụ bụ na ego ha na-akwụ n'ụgwọ ọkụ latrik n'otu ọnwa adịla nnukwu ugbua karịa ka ọ dị na mbụ.

Ụlọmgbasaozi BBC News Igbo amalitela ịgbasa ozi n'ọbaozi WhatsApp Channelụ
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Otu nwoke na-arụ akpụkpọ ụkwụ n'Aba kwuru na ọ bụ ọkụ latrik ka ha ji arụ akpụkpọ ụkwụ, kwukwara na nsogbu ha na-enwe bụ na ụgwọ ọkụ latrik a na-enye na-adị oke ọnụ.

Nwamadị ahụ bụ Chinedu kwuru na ha na-akwụ ụgwọ ọkụ latrik ruru N15,000 n'otu ụlọ ahịa ọnwa ọbụla maka naanị bọlbụ na fan.

Onye ọzọ bụ otu nwaanyị na-akwa uwe bụ onye kwetara na etu esi enye ọkụ latrik n'Aba agbanweela, kwukwara na ọkụ latrik na-enyere ndị aka ọrụ aka n'ọrụ ha.

Nwaanyị ahụ bụ Grace kwuru kọwara "n'otu nsogbu ha na-enwe bụ na ụgwọ ọkụ karịrị akarị; ọ na-adị oke ọnụ. O nwere mpaghara ị ga-abịa n'Aba, gị ahụ ọkụ mgbe ọbụla, nwee ebe ị agaghị ahụ ọkụ."

A na-enye anyị ụgwọ ọkụ karịrị N80,000 nke pụtara na otu onye nwereike ịkwụ ihe karịrị N20,000 n'otu ọnwa.
Nkọwa foto, Maazị Ogbonna bụ onyeisi ndị na-akwa akwa n'Abịa steeti nke Ngwa Road

Onyeisioche otu ndị na-akwa akwa n'Abịa Steet nke Ngwa Road gwakwara anyị na ụlọọrụ Aba Power na-agbalịzi inye ọkụ maka o nwere mgbe ha anaghị enye ndị bi n'Aba ọkụ latrik.

"Ọ bụ ọkụ ka anyị ji arụ ọrụ maka n'ego ndị aka ọrụ na-emefu iji azụta mmanụ ụgbọala a na-etinye n'injin ọkụ dị ukwuu."

Nwoke ahụ aha ya bụ Ogbonna kwuru na: "O nweghị onye aka ọrụ nọ gburugburu a anaghị emefu ego ruru N10,000 maọbụ N11,000 kwa ụbọchị ma ọbụrụ na ọkụ latrik adịghị."

"Ugbua ọ bụzi mgbe ọrụ ji emechi ka ha jị enye anyị ọkụ. Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ jiri malitere ịrụ ọrụ oge abalị."

"Ha na ndị ezinaụlọ ha na-arahụ na shọp ka ha nweeike iji ọkụ latrik rụọ ọrụ n'abalị iji belata ego ha na-emefu n'ọkụ."

Gịnị kpalitere esemokwu n'etiti ndị ji ọkụ latrik eme ihe n'Aba na ụlọọrụ Aba Power?

Ụlọikpe Ukwu nọ n’Isiala Ngwa kwuru n’ụbọchị 20 Mee 2025 na ya enweghị ikike ikpe ikpe ahụ.
Nkọwa foto, Larry Iroka bụ ọkaiwu ndị ji ọkụ latrik eme ihe n'Aba

Onye ọkaiwu ndị ji ọkụ latrik eme ihe n'Aba bụ Larry Iroka, gwara BBC na ha kpụpụrụ ụlọọrụ Aba Power Ụlọikpe Ukwu Steeti dị n'Isiala Ngwa maka iweli ọnụego a na-akwụ dịka ụgwọ ọkụ.

O kwuru na Aba Power kwuru na ndị Aba na-enwe ọkụ latrik awa iri abụọ na anọ ụbọchị dum mere ha jiri welie ụgwọ ha na-akwụ.

"Ndị Aba kwuru na ọ karịrị ụgwọ ụlọ mana ndị Aba Power jụrụ ibelata ụgwọ ọkụ ma malite igbubi ọkụ ndị mmadụ.

Nke a mere ndị ji ọkụ latrik eme ihe n'Aba jiri kpụpụ ụlọọrụ Aba Power n'ụlọikpe.

Mana ụlọikpe nọ n'Isiala Ngwa kwuru n'ụbọchị 20 Mee 2025 na ya enweghị ikike ikpe ahụ. O zigara ikpe ahụ n'ụlọikpe etiti dị n'Ụmụahịa.

Ihe ụlọọrụ Aba Power kwuru

A gbapere ụlọọrụ na-arụpụta ọkụ latrik n'Aba bụ Geometric Power n'afọ 2024

Mbọ niile BBC gbara iji nweta nzaghachi nke ụlọọrụ Aba Power na-ahụ maka nkesa ọkụ latrik n'Aba amịtaghị mkpụrụ ọbụla dịka ha gwara anyị na Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Maazị Ugo Opigbe gara njem.

Opigbe kwuru na anyị na ya ga-enwe mkparịtaụka oge ọbụla ya nwereike ịkpọghachi anyị azụ.