Kedụ etu Owere bụ obodo 'ngwọrị' si malite?

Ebe foto si, @Hope_Uzodimma1/X
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Owere (Owerri) bụ isiobodo Imo steeti, nke bụ otu n'ime steeti e nwere na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Owere bụ otu n'ime zoonu e nwere n'Imo steeti tinyere Orlu na Okigwe.
Ha dị okpuruọchịchị atọ mejupụtara obodo Owere ndị gụnyere Owerri Municipal, Owerri North na Owerri West.
Mana ọ bụ okpuruọchịchị itoolu mejupụtara zoonu Owere. Ha gụnyere; Aboh Mbaise, Ahiazu Mbaise, Ezinihitte Mbaise, Ikeduru, Mbaitoli, Ngor Okpala, Owerri Municipal, Owerri North na Owerri West.
Ọnụọgụgụ mmadụ bi n'Owere karịrị otu nde na narị puku ise (1,500,000) ebe obosara ala ya ruru 100 square kilometres.
Mana ka ọ dị, ọtụtụ mmadụ akọọla akụkọ gbasara etu e si hiwe Owere maọbụ etu o si malite. Ụfọdụ kwuru na Ekwem Ọha hiwere ya na 14 senchuri.
Ọ bụ nke a mere anyị ji kpọtụrụ otu onyendu ọdịnaala bụ Eze Dr. Innocent Opara (Ezeudo II n'Orji nakwa Oshimiri II nke obodo Orji kwụụrụ onwe ya) ka ọ kọọrọ anyị nke bụ eziokwu.
Mmalite Owere

Eze Innocent Opara kọwara na Owere malitere n'Ụmụọrịị Ụratta. Dịka o siri kwuo, ụmụnne abụọ bụ Ekwema na Arugo bikwa ebe ahụ n'oge ọ malitere.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọ sị ha biri ebe ahụ ụfọdụ oge mana ka o ruru otu ụbọchị e gburu ebule, Ekwema erie obi ya.
"Ọnọdụ a mere ndị obodo jiri kpebie na a ga-egbu ya egbu n'ihi na ọ rụrụ ala rie oke ruuru ọkpara nne ya bụ Arugo," ka Eze Opara kọọrọ anyị.
O kwuru na ngwangwa e nwere mkpebi ahụ, Ekwema kpọọrọ nwanne ya gbaa ọsọ site n'Ụmụọrịị ruo ebe a maara taa dịka Ugwu Ekwema dị n'okporoụzọ e si aga Egbu.
"Mana dịka ha na-agbapụ, o nwere onye Nekede sooro Arugo oge ha malitere nje m ahụ," ka Eze kwuru
Ọ gara n'ihu kọọ na Ekwema na nwanne ya kwụsịrị n'Ugwu Ekwema malite izu ike nakwa ịchọ ebe ha ga-enweta ji ha ga-eri.
"Ha tinyere isi ebe dị iche iche iji lee ma ha ga-enweta ji ha ga-eri. Oge ha chọtara ji, onye Nekede a sị na ọ dị mkpa na ha chọtara ebe ha ga-enweta ọkụ ha ga-eji hụọ ji ahụ".
"Ha chọrọ ọkụ n'ụlọ ndị Nekede bi nso ebe ahụ, nweta ma were ya laghachi n'Ugwu Ekwema bụ ebe ha nọọrọ hụọ ji ma rie," ka Eze kwuru.
Ọ sịrị na mgbe ha nwetara ume, ha malikwara njem ha ma bidozie izute ndị mmadụ n'ụzọ.
Eze Opara sịrị na "nke a mere ha jiri kpebie na ha ga-ebizi ebe ahụ karịa ịlaghachi Ụmụọrịị".
"Mana tupu a mara nke na-eme, ndị nke fọdụrụ n'Ụratta akwapụta, sorozie Ekwema na Arugo biri ebe ahụ ha chọtara," ka Eze kọọrọ anyị.

Ebe foto si, @Hope_Uzodimma1/X
Eze kọwara na Ụmụoyima bụ Nekede mana ha kewapụrụ onwe ha zabazie Ụmụoyima Owere.
Site n'oge ahụ, Ụmụọrọrọnjọ ekewapụta onwe ha, Amawọm ekewapụta onwe ha, Ụmụonyeche ekewapụta onwe ha, Ụmụọdụ ekewapụta onwe ha. Ọ bụ ọnọdụ a mere e ji akpọ ha 'Owere nchi ise' - Ụmụoyima, Ụmụọrọrọnjọ, Amawọm, Ụmụonyeche na Ụmụọdụ.
Dịka Eze siri kọwaa, enweghị ihe dịka obodo kwụụrụ onwe ya (autonomous community) oge Owere malitere. Ọ bụ nke ahụ mere e ji site n'obi Njemanze họpụta onye Warrant Chief ga-anọchite anya ndị Owere niile. Sitezie etu ahụ, Njemanze a bụrụ Eze Owere.
Ka o sinadị, Eze kọwara na 'Owere wụ Owere' bụ Ụratta mana Owere nwere ọnụmara ise a maara dịka 'Owere nchi ise'.
Ụfọdụ ihe ndị ọzọ e ji mara Owere

Ebe foto si, @Hope_Uzodimma1/X
Ọtammiri dị n'okeala Owere na mpaghara ọwụwa anyanwụ ebe osimiri Nworie dị n'okeala ya na mpaghara ndịda.
Oriri na nkwari bụ ihe e ji mara Owere nke mere ụfọdụ mmadụ ji akọwa ya dịka 'Las Vegas' nke mba Afrịka n'ihi ọtụtụ ụlọ oriri, ụlọ oringo na ogige dị iche iche a na-atụ ndụ mmanụ jupụtara na ya.
Otu mkpirisi okwu ndị Owere na-ekwu gosiri na ha bụ ndị ngwọrị bụ "a taala ụgba, ṅụọ mmịị [mmanya] ndị ụba na barama". Okwu ahụ gosiri n'eziokwu na ha bụ ndị ejighị ịtụ ndụ ha mmanụ egwu egwuregwu.
Otu emume ọdịnaala e ji mara ndị Owere nke ọma bụ Oru Owere nke ha na-ahazi otu ugboro n'ime afọ ọbụla ebe Bongo bụ ụdịrị egwu e ji mara ha.

Owere bụụrụ isi obodo Biafra nke ikpeazụ oge ndịagha Naịjirịa weghachitere ebe ndị ha jibu mere isi obodo ha bụ Enugwu na Ụmụahịa.
Ụfọdụ nri ndị Owere na-akọpụta n'ugbo gụnyere ji, akpụ, ọka, nkwụ na osisi rubber. Owere nwekwara mmanụ agbịdị na gaasị ọnatarachi n'ebe ọ bara ụbara dịka ọtụtụ obodo ndị ọzọ dị na mpaghara ala Igbo.
Owere nwere ọtụtụ ahịa dị iche iche n'ihi na ndị bi n'ime ya bụ ndị na-atụ mgbereahịa nke ọma mana abụọ ndị a kachasị anụ aha ha bụ Ekeukwu Owere na ahịa Relief.
E nwere ọtụtụ ogbe dị iche iche n'Owere, ndị gụnyere ọdọụgbọelu Sam Mbakwe International Cargo Airport, Heroes Square, ama egwuregwu Grasshoppers Handball Stadium, Dan Anyiam Stadium, ogige ụmụ anụmanụ dị na Nekede (nke adịghịzi), Federal University Teaching Hospital Owerri (FUTHO) nakwa ihe ndị ọzọ.
Ha dị ụlọakwụkwọ dị elu anọ e nwere n'Owere. Ha gụnyere Imo State University Owerri (IMSU), Federal University of Technology Owerri (FUTO), Alvan Ikoku Federal University of Education Owerri (AIFUE) na Federal Polytechnic Nekede.

Ebe foto si, VJ Gentle
Ụlọmgbasaozi redio ndị na-arụ ọrụ n'Owere gụnyere IBC Orient FM, Heartland FM, Zanders FM, Hot FM, My Radio FM, Darling FM, Groove FM, Ozisa FM, Heritage FM, Toast FM, Boss FM, Bizzibodi FM, Ọmalịcha FM na Echo FM ebe ndị nke tivii gụnyere Orient TV, NTA na Zanders TV.
Ụlọọrụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ n'Owere dị ọtụtụ, ụlọ oriri bụ atụrụ taba ebe ụlọakwụkwọ na-achụ onwe ha ọsọ tinyekwara ụfọdụ ụlọọrụ ndị ọzọ.
Ọ dịkwa mkpa ịrụtụ aka na obi ọchịchị Imo steeti a maara dịka "Douglas House" dị n'Owere tinyekwara ụlọọrụ na ngalaba ụlọọrụ gọọmenti dị iche iche.









